Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọtụtụ Nde Ndị Mmụọ E Kere Eke

Ọtụtụ Nde Ndị Mmụọ E Kere Eke

Ọtụtụ Nde Ndị Mmụọ E Kere Eke

Bible na-agwa anyị na e nwere ọtụtụ ndị bụ mmụọ. Jehova n’onwe ya bụ mmụọ.​—Jọn 4:24; 2 Ndị Kọrint 3:​17, 18.

N’otu oge, Jehova nọ nanị ya n’eluigwe na ala dum. Mgbe ahụ ọ malitere ike ndị bụ mmụọ, ndị a na-akpọ mmụọ ozi. Ha dị ike, nweekwa ọgụgụ isi karịa mmadụ. Jehova kere ọtụtụ ndị mmụọ ozi; ohu Chineke, bụ́ Daniel, n’otu ọhụụ, hụrụ otu narị nde ndị mmụọ ozi.​—Daniel 7:10; Ndị Hibru 1:7.

Chineke kere ndị mmụọ ozi ndị a ọbụna tupu o kee ụwa. (Job 38:​4-7) Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha dịworo ndụ n’ụwa ma nwụọ.

[Foto dị na peeji nke 7]

Mmụọ ukwu ahụ, bụ́ Jehova, kere ọtụtụ nde ndị bụ mmụọ