Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nnupụisi n’Ógbè Ndị Bụ Mmụọ

Nnupụisi n’Ógbè Ndị Bụ Mmụọ

Nnupụisi n’Ógbè Ndị Bụ Mmụọ

Ndị mmụọ nile Jehova kere dịbu mma. E mesịa, otu mmụọ ozi ghọrọ onye ọjọọ. Ọ bụ Setan bụ Ekwensu. Setan chọrọ ka ndị bi n’ụwa fee ya ofufe kama ife Jehova. Nke a bụ ihe merenụ:

N’ogige Iden, e nwere ọtụtụ osisi ndị na-amịpụta mkpụrụ dị ụtọ. Jehova gwara Adam na nwunye ya, bụ́ Iv, na ha nweere onwe ha iri mkpụrụ sitere na ha. Ma ọ dị otu osisi nke Chineke kwuru na ha agaghị eri mkpụrụ sitere na ya. O kwuru na ọ bụrụ na ha erie mkpụrụ sitere na ya, na ha aghaghị ịnwụ anwụ.​—Jenesis 2:​9, 16, 17.

Otu ụbọchị, Iv nọ nanị ya mgbe otu agwọ gwara ya okwu. N’ezie, ọ bụghị agwọ ahụ kwuru okwu n’ezie; ọ bụ Setan bụ Ekwensu mere ka o yie ka à ga-asị na agwọ ahụ na-ekwu okwu. Setan gwara Iv na ọ bụrụ na o rie mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu, ọ ga-enwe amamihe dị ka Chineke. O kwukwara na ọ gaghị anwụ anwụ. Okwu abụọ ndị a bụcha okwu ụgha. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, Iv kweere ihe Setan kwuru ma rie mkpụrụ osisi ahụ. Mgbe e mesịrị, o nyere Adam ụfọdụ, o wee riekwa.​—Jenesis 3:​1-6.

Site n’akụkọ nke a mere eme n’ezie, anyị na-amụta na Setan bụ onye nnupụisi na onye ụgha. Ọ gwara Iv na ọ bụrụ na o nupụrụ Chineke isi, na ọ gaghị anwụ anwụ. Nke ahụ bụ okwu ụgha. Nwanyị ahụ mesịrị nwụọ, otú ahụ ka ọ dịkwa Adam. Setan anwụghị mgbe ahụ, ma ọ ga-emesịa nwụọ n’ihi na o mere mmehie. Otú ọ dị, ka ọ dịgodi ugbu a, ọ dị ndụ, nọgidekwa na-eduhie ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ ka bụ onye ụgha, ọ na-agbalịkwa ime ka ụmụ mmadụ mebie iwu Chineke.​—Jọn 8:44.

Ndị Mmụọ Ozi Ndị Ọzọ Enupụ Isi

Mgbe e mesịrị, ndị mmụọ ozi ndị ọzọ malitere ime ihe ọjọọ. Ndị mmụọ ozi ndị a hụtara ụmụ nwanyị mara mma ndị nọ n’elu ala, wee chọọ iso ha nwee mmekọahụ. Ya mere ha gbadatara n’ala wee nwoghara anụ ahụ nke ndị nwoke. Mgbe ahụ ha kpọọrọ ụmụ nwanyị ndị ahụ. Nke a megidere nzube Chineke.​—Jenesis 6:​1, 2; Jud 6.

Ọ kpatakwaara ihe a kpọrọ mmadụ nsogbu dị ukwuu. Ndị nwunye mmụọ ozi ndị ahụ mụrụ ụmụ, ma ha abụghị ụmụ nkịtị. Ha tolitere ịbụ ndị dike na-eme ihe ike, ndị nwekwara obi ọjọọ. Ụwa mesịrị jupụta n’ime ihe ike nke ukwuu nke na Jehova kpebiri ibibi ndị mmebi iwu ahụ site n’oké iju mmiri. Nanị ụmụ mmadụ lanarịrị Iju mmiri ahụ bụ Noa onye ezi omume na ezinụlọ ya.​—Jenesis 6:​4, 11; 7:23.

Otú ọ dị, ndị mmụọ ozi ahụ na-emebi iwu laghachiri n’ógbè nke ndị bụ mmụọ; ha anwụghị anwụ. Ma e nyere ha ahụhụ. E kweghị ka ha bataghachi n’ezinụlọ Chineke nke ndị mmụọ ozi na-eme ezi omume. Ọzọkwa, Jehova ekweghịkwa ka ha nwee ike iwereghachi anụ ahụ nke mmadụ. E mesịakwa, ha ga-anwụ n’oké ikpe ahụ.​—2 Pita 2:4; Jud 6.

A Chụpụrụ Setan n’Eluigwe

N’akụkụ mmalite nke narị afọ anyị a, e nwere otu agha n’eluigwe. Akwụkwọ Bible bụ Mkpughe na-akọwa ihe merenụ: “Agha wee pụta n’eluigwe: Maịkael [Jisọs Kraịst e meworo ka o si n’ọnwụ bilie] na [ezi] ndị mmụọ ozi ya buru agha megide dragọn ahụ [Setan]; dragọn ahụ na [ajọ] ndị mmụọ ozi ya wee buo agha; ha enweghịkwa ike, a hụghịkwa ọnọdụ ha ọzọ n’eluigwe. E wee chụda dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ ochie ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi; a chụdara ya n’ụwa, chụdakwa [ajọ] ndị mmụọ ozi ya, ya na ha.”

Gịnị si na nke a pụta? Ihe ndekọ ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “N’ihi nke a, ka obi na-atọ unu ụtọ, unu eluigwe nile, na unu ndị bi n’ime ha.” Ezi ndị mmụọ ozi ahụ pụrụ inwe obi ụtọ n’ihi na Setan na ajọ ndị mmụọ ozi, ma ọ bụ ndị mmụọ ahụ, anọghịzi n’eluigwe. Ma gịnị banyere ndị nọ n’elu ala? Bible na-asị: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri: n’ihi na Ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.”​—Mkpughe 12:​7-9, 12.

Ee, Setan na ajọ ndị òtù ya na-eduhie ụmụ mmadụ bi n’elu ala, na-akpatakwara ha oké ahụhụ. Ajọ ndị mmụọ ozi ndị a bụ ndị a na-akpọ ndị mmụọ ọjọọ. Ha bụ ndị iro nke Chineke. Ha nile dị njọ.

[Foto dị na peeji nke 8]

Mgbe Setan jiri agwọ ahụ mee ihe ịgwa Iv okwu, nwanyị ahụ sonyeere nnupụisi ya megide Chineke

[Foto dị na peeji nke 9]

Ndị mmụọ ozi na-emebi iwu gbadatara n’ala iso ndị inyom nwee mmekọ na-adịghị ọcha

[Foto dị na peeji nke 10]

A chụpụrụ Setan na ajọ ndị mmụọ ozi ya site n’eluigwe