Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Mmụọ Ọjọọ Bụ Ndị Ogbu Mmadụ!

Ndị Mmụọ Ọjọọ Bụ Ndị Ogbu Mmadụ!

Ndị Mmụọ Ọjọọ Bụ Ndị Ogbu Mmadụ!

Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya anọwo na-abụ ndị obi ọjọọ na ndị dị ize ndụ mgbe nile. N’oge ochie, Setan gburu anụ ụlọ na ndị ohu nke Job onye kwesịrị ntụkwasị obi. Mgbe ahụ, o gburu ụmụ iri nke Job site n’ime ka “oké ifufe” bibie ụlọ ha nọ n’ime ya. Mgbe nke ahụ gasịrị, Setan weere “ihe ohihi ọjọọ tie Job, site n’ọbọ ụkwụ ya ruo n’opunisi ya.”​—Job 1:​7-19; 2:7.

N’oge Jisọs, ndị mmụọ ọjọọ mere ka ụfọdụ mmadụ ghara inwe ike ikwu okwu, kpuokwa ìsì. (Matiu 9:​32, 33; 12:22) Ha tara otu nwoke ahụhụ, meekwa ka o jiri nkume na-akawasị onwe ya ahụ. (Mak 5:5) Ha mekwara ka otu nwa okorobịa tiwapụ mkpu, tụda ya n’ala, ma “sesie ya ike.”​—Luk 9:42.

Taa, Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya bụkwa ndị ogbu mmadụ dị ka ha bụworo eri mgbe. N’eziokwu, ajọ ọrụ ha amụbawo kemgbe a chụpụrụ ha site n’eluigwe. Akụkọ a na-anata gburugburu ụwa na-agba àmà banyere ọrụ obi ọjọọ ha. Ha na-eji ọrịa eti ụfọdụ ndị ihe otiti. Ha na-eyi ndị ọzọ egwu n’abalị, na-eme ka ha ghara ihi ụra ma ọ bụ na-eme ka ha rọọ nrọ ọjọọ dị iche iche. Ha na-emetọ ndị ọzọ n’ụzọ mmekọahụ. Ha na-emekwa ndị ọzọ ka ha malite ịwị ara, igbu mmadụ, ma ọ bụ igbu onwe ha.

Lintina, onye bi na Suriname, kọrọ na otu mmụọ ọjọọ gburu mmadụ 16 nọ n’ezinụlọ ya, nyekwa ya ahụhụ n’anụ ahụ na n’uche ruo afọ 18. Site n’ahụmahụ o nwere n’onwe ya, ọ kọrọ na ndị mmụọ ọjọọ ahụ “na-enwe ọṅụ n’ịta ndị ọ na-amasịghị ịnọ n’okpuru ha ahụhụ ruo ọnwụ.”

Ma Jehova nwere ike ichebe ndị ohu ya site ná mwakwasị nile nke Setan.​—Ilu 18:10.

[Foto ndị dị na peeji nke 11]

N’oge gara aga, ndị mmụọ ọjọọ mere ka ụfọdụ mmadụ daa ọrịa, meekwa ka ihe osise na-ese ndị ọzọ

[Foto ndị dị na peeji nke 12]

Taa, ndị mmụọ ọjọọ na-eme ka ụfọdụ ndị na-eme ihe ike; ha na-eyi ndị ọzọ egwu n’abalị, na-eme ka ha rọọ nrọ ọjọọ dị iche iche