Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jeere Jehova Ozi, Ọ Bụghị Setan

Jeere Jehova Ozi, Ọ Bụghị Setan

Jeere Jehova Ozi, Ọ Bụghị Setan

Anyị nile aghaghị ime nhọrọ. Ma anyị ejereghị Jehova ozi, ọ bụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ka anyị na-ejere ozi. Anyị apụghị ime ha abụọ n’otu mgbe. Lee nnọọ ka o si bụrụ ihe amamihe ijere Jehova ozi!

Jehova Dị Mma

Dị ka anyị hụworo, ọ na-amasị ndị mmụọ ọjọọ imerụ ụmụ mmadụ ahụ na iduhie ha. Jehova adịghị otú ahụ. Ọ hụrụ ihe a kpọrọ mmadụ n’anya dị ka onye bụ nna na-ahụ ụmụ ya n’anya. Ọ bụ Onye Na-enye “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè.” (Jemes 1:17) Ọ dịghị egbochi ihe ọ bụla n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ, ọbụna mgbe ọ na-efu ya ihe dị ukwuu.​—Ndị Efesọs 2:​4-7.

Chee echiche banyere ihe ndị Jisọs, bụ́ Ọkpara Chineke, mere n’elu ala. O mere ka ndị na-apụghị ikwu okwu kwuo okwu, meekwa ka ndị ìsì hụ ụzọ. Ọ gwọrọ ndị ekpenta na ndị dara ngwụrọ. Ọ chụpụrụ ndị mmụọ ọjọọ, gwọọkwa ụdị ọrịa nile. Jisọs, site n’ike Chineke, kpọlitere ọbụna ndị nwụrụ anwụ ka ha dị ndụ.​—Matiu 9:​32-35; 15:​30, 31; Luk 7:​11-15.

Kama ịdị na-ekwu okwu ụgha iji duhie anyị, Chineke na-ekwu eziokwu mgbe nile. Ọ dịghị mgbe ọ na-eduhie onye ọ bụla.​—Ọnụ Ọgụgụ 23:19.

Zere Ihe Omume Ndị Na-adịghị Ọcha

Dị nnọọ ka ọnyà udide na-ejidesi ijiji ike, otú a ka nkwenkwe na-enweghị isi na okwu ụgha jisiri ọtụtụ nde ndị mmadụ ike. Ha na-atụ egwu ndị nwụrụ anwụ. Ha na-atụ egwu ndị mmụọ ọjọọ, ha na-echegbu onwe ha banyere ọbụbụ ọnụ, ihe àmà ọdịnihu, ọgwụ okike, na arụsị nta dị iche iche. Ha nọ n’agbụ nke nkwenkwe na omenala dị iche iche ndị dabeere n’okwu ụgha nile nke Setan bụ Ekwensu. Ndị ohu Chineke anọghị n’ọnyà nke ọ bụla n’ime ihe ndị a.

Jehova dị ike nke ukwuu karịa Setan. Ọ bụrụ na i jeere Jehova ozi, ọ ga-echebe gị pụọ n’aka ndị mmụọ ọjọọ. (Jemes 4:7) Ịkọ ọgwụ agaghị enwe ike n’ebe ị nọ. Dị ka ihe atụ, na Nigeria, ndị dibia afa atọ dị ike kọrọ ọgwụ iji gbuo otu Onyeàmà Jehova onye jụrụ ịkwapụ n’obodo ahụ. Mgbe ọgwụ ndị ahụ na-arụghị ọrụ, otu n’ime ndị dibia afa ahụ malitere ịtụ egwu, jekwuru Onyeàmà ahụ, ma rịọ ka e meere ya ebere.

Ọ bụrụ na ndị mmụọ ọjọọ eyie gị egwu, ị pụrụ ịkpọku Jehova site n’aha ya, ọ ga-echebekwa gị. (Ilu 18:10) Ma ka i wee nweta nchebe Chineke, ị ghaghị ikewapụ onwe gị kpam kpam site n’ihe nile e jikọtara ya na mgbaasị na ife ndị mmụọ ọjọọ ofufe. Ndị na-efe Chineke n’Efesọs oge ochie mere nke ahụ. Ha chịkọtara akwụkwọ ha nile metụtara ime anwansi ma suo ha ọkụ. (Ọrụ 19:​19, 20) Ndị ohu Chineke taa aghaghị imekwa ihe dị otú ahụ. Wepụchasịa ihe okike, ọgwụ okike, eriri “nchebe” dị iche iche, arụsị nta dị iche iche, akwụkwọ e ji eme anwansi, na ihe ọ bụla ọzọ e jikọtara ya na ime mgbaasị.

Gbasoo Ezi Ofufe

Ọ bụrụ na ị chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ, o zughị ezu nanị ịhapụ ofufe ụgha ma kwụsị ime ihe ọjọọ. Ị ghaghị ịrụsi ọrụ ike iji gbasoo ofufe dị ọcha. Bible na-egosi ihe a chọrọ:

Soro Ndịàmà Jehova Na-akpakọrịta

Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya nwere ụmụ mmadụ n’elu ala ndị na-akụzi, na-emekwa ihe ọjọọ dị iche iche. Ma Jehova nwekwara ndị nke ya. Ha bụ Ndịàmà Jehova. (Aịsaịa 43:10) N’elu ụwa dum, e nwere ihe karịrị nde Ndịàmà anọ. Ha nile na-agbalịsi ike ime ezi ihe na ịkụziri ndị mmadụ eziokwu. N’ihe ka ọtụtụ n’ala dị iche iche, ị pụrụ izute ha n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ebe ha ga-anabata gị nke ọma.

Ọrụ ha bụ inyere ndị ọzọ aka ijere Chineke ozi. Ha ga-esoro gị mụọ Bible n’ụlọ nke aka gị, na-enyere gị aka ịmụta ụzọ ị ga-esi fee Jehova n’ụzọ ziri ezi. Ị gaghị akwụkwa ụgwọ maka nke a. Ndịàmà ahụ na-enwe obi ụtọ ịkụzi eziokwu ahụ n’ihi na ha hụrụ ụmụ mmadụ n’anya, ha hụkwara Jehova Chineke n’anya.

[Foto dị na peeji nke 23]

Jisọs, bụ́ Ọkpara Chineke, gosiri ịhụnanya maka ụmụ mmadụ site n’ịgwọ ọrịa ha

[Foto dị na peeji nke 24]

Ndị Efesọs suru akwụkwọ ha nile metụtara ime anwansi ọkụ

[Foto dị na peeji nke 25]

Mụọ Bible.​—Jọn 17:3

[Foto dị na peeji nke 25]

Na-eje nzukọ ndị Kraịst.​—Ndị Hibru 10:​24, 25

[Foto dị na peeji nke 26]

Kwusaara ndị ọzọ ozi ọma.​—Matiu 24:14

[Foto dị na peeji nke 26]

Kpekuo Jehova Ekpere.​—Ndị Filipaị 4:​6, 7

[Foto dị na peeji nke 26]

Bụrụ onye e mere baptism.​—Ọrụ 2:41

[Foto ndị dị na peeji nke 27]

Ndịàmà Jehova ga-enyere gị aka ijere Chineke ozi