Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọdịnihu Dị Ebube

Ọdịnihu Dị Ebube

Ọdịnihu Dị Ebube

Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya agaghị eduhie ihe a kpọrọ mmadụ ruo ogologo oge. Jehova achụpụwo ha rịị n’eluigwe. (Mkpughe 12:9) N’ọdịnihu dị nso, Chineke ga-emekwa ihe ọzọ megide Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya. N’otu ọhụụ sitere n’aka Chineke, Jọn onyeozi sịrị: “M wee hụ mmụọ ozi ka ọ na-esi n’eluigwe rịdata, na-eji mkpịsị ugodi nke abyss ahụ n’aka ya, ya na oké mkpọrọ. O wee jide dragọn ahụ, bụ́ agwọ ochie ahụ, onye bụ Ekwensu na Setan, o wee kee ya agbụ [otu puku afọ], wee tụba ya n’ime abyss ahụ, mechie ya, kaakwa ya akara n’elu ya, ka o wee ghara iduhie mba nile ọzọ, ruo mgbe [otu puku afọ] ahụ ga-agwụsị.” (Mkpughe 20:​1-3) Mgbe e mesịrị, a ga-ebibi Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya ruo mgbe ebighị ebi.​—Mkpughe 20:10.

A ga-ebipụkwa ndị ọjọọ nọ n’elu ala.​—Abụ Ọma 37:​9, 10; Luk 13:5.

Ndị Nwụrụ Anwụ Ga-adị Ndụ Ọzọ!

Mgbe e wepụsịrị Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya, Jehova ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ ọtụtụ ngọzi. Ị ga-echeta na ndị nwụrụ anwụ adịghị ndụ, ha adịghị adị. Jisọs ji ọnwụ tụnyere ụra​—ụra dị omimi nke a na-adịghị arọ nrọ na ya. (Jọn 11:​11-14) O mere nke ahụ n’ihi na ọ maara na oge na-abịa mgbe a ga-akpọlite ndị ahụ nọ n’ụra ọnwụ bịa ná ndụ. Ọ sịrị: “Oge hour na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili . . . ga-apụtakwa.”​—Jọn 5:​28, 29; tụlee Ọrụ Ndị Ozi 24:15.

A ga-eme ka ha dịghachi ndụ n’elu ala. Kama ịdị na-anụ ịma ọkwa na ndị mmadụ anwụwo, a ga na-anụ akụkọ na-enye ọṅụ ndị na-ekwu banyere ndị a kpọghachiworo ná ndụ! Lee nnọọ ihe ọṅụ ọ ga-abụ ịnabataghachi ndị anyị hụrụ n’anya site n’ili!

[Foto dị na peeji nke 28]

N’oge na-adịghị anya, a ga-eme ka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya kwụsị ịrụ ọrụ

[Foto dị na peeji nke 29]

Ndị nwụrụ anwụ ga-abịaghachi ná ndụ n’elu ala