Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okwu Mmalite

Okwu Mmalite

Ezi Onye Na-agụ Akwụkwọ A:

Ọ̀ na-adị gị ka ị nọ Chineke nso? Nye ọtụtụ ndị, nke ahụ yiri nnọọ ihe na-agaghị ekwe omume. Ụfọdụ na-atụ ụjọ na ọ nọ n’ebe dị oké anya; ndị ọzọ na-eche na ha erutụghị eru. Otú ọ dị, Bible ji ịhụnanya na-agba anyị ume, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:8) Ọbụna na ọ na-emesi ndị na-efe ya ofufe obi ike, sị: “Mụ onwe m, Jehova, Chineke gị, na-ejidesi aka nri gị ike, bụ́ Onye na-asị gị, Atụla egwu, Mụ onwe m enyeworo gị aka.”—Aịsaịa 41:13.

Olee otú anyị pụrụ isi gbalịa ka anyị na Chineke nwee ụdị mmekọrịta ahụ chiri anya? N’ọbụbụenyi ọ bụla anyị malitere, njikọ ahụ na-adabere n’ịmata onye ahụ, inwe mmasị n’àgwà ya ndị pụrụ iche na iji ha kpọrọ ihe. Ya mere, àgwà Chineke na ụzọ ya, dị ka a kọwara ha n’ime Bible, bụ ihe ndị dị mkpa ka a mụọ banyere ha. Ichebara ụzọ Jehova si egosipụta nke ọ bụla n’ime àgwà ya echiche, ịhụ otú Jizọs Kraịst si ṅomie ya n’ụzọ zuru okè, na ịghọta otú anyị onwe anyị kwa pụrụ isi zụlite ha ga-eme ka anyị bịarukwuo Chineke nso. Anyị ga-ahụ na ọ bụ Jehova bụ onye o ruuru nakwa Eze kwesịrị ekwesị nke eluigwe na ala. Ọzọkwa, ọ bụ Nna nke dị anyị nile mkpa. N’ịbụ onye dị ike, nke na-ekpe ikpe ziri ezi, nke nwere amamihe, na onye na-ahụ n’anya, ọ dịghị mgbe ọ na-ahapụ ụmụ ya na-ekwesị ntụkwasị obi.

Ka akwụkwọ a nyere gị aka ịbịarukwu Jehova Chineke nso, iso ya nwee mmekọrịta nke a na-agaghị emebi emebi ka i wee nwee ike ịdị ndụ wee na-eto ya ruo mgbe ebighị ebi.

Ndị Bipụtara Ya