Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE 3

“O Nwere Obi nke Maara Ihe”

“O Nwere Obi nke Maara Ihe”

Ezi amamihe bụ otu n’ime akụ̀ ndị kasị oké ọnụ ahịa ị pụrụ ịchọ. Ọ bụ nanị Jehova na-enye ya. Ná nkebi a anyị ga-elerukwu anya n’amamihe na-enweghị nsọtụ nke Jehova Chineke, bụ́ onye nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Job kwuru banyere ya, sị: “O nwere obi nke maara ihe.”—Job 9:4.

NÁ NKEBI A

ISI NKE 17

‘Lee Ịdị Omimi nke Amamihe Chineke!’

Olee otú o si bụrụ na amamihe Chineke enweghị nsọtụ?

ISI NKE 18

Amamihe nke Dị ‘n’Okwu Chineke’

Gịnị mere Chineke ji jiri ndị mmadụ dee Baịbụl kama iji aka ya dee ya ma ọ bụ nye ya ndị mmụọ ozi ka ha dee?

ISI NKE 19

‘Amamihe Chineke nke Dị n’Ihe Nzuzo Dị Nsọ’

Gịnị bụ ihe nzuzo ahụ dị nsọ Chineke zochiburu ezochi ma mechaa mee ka a mata?

ISI NKE 20

“O Nwere Obi nke Maara Ihe”—Ma Ọ Dị Umeala n’Obi

Olee otú Eze nwe eluigwe na ala ga-esi adị umeala n’obi?

ISI NKE 21

Jizọs Ekpughee “Amamihe Sitere na Chineke”

Olee otú ihe Jizọs na-akụzi si mee ka ndị agha e zigara ka ha gaa jide ya gbara aka lọta?

ISI NKE 22

“Amamihe nke Sitere n’Elu” Ọ̀ Na-arụ Ọrụ ná Ndụ Gị?

Baịbụl kwuru ihe anọ ga-enyere gị aka inweta amamihe Chineke.