Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ODIDE NTỤKWASỊ

Aha Chineke—Otú E Si Eji Ya Eme Ihe na Ihe Ọ Pụtara

Aha Chineke—Otú E Si Eji Ya Eme Ihe na Ihe Ọ Pụtara

NA BIBLE gị, olee otú e si sụgharịa Abụ Ọma 83:18? Na New World Translation of the Holy Scriptures, e si otú a sụgharịa amaokwu a: “Ka ndị mmadụ wee mara na gị, onye aha gị bụ Jehova, nanị gị bụ Onye Kasị Elu n’ụwa dum.” N’ọtụtụ Bible ndị ọzọ, a sụgharịrị ya n’ụzọ yiri nke ahụ. Otú ọ dị, n’ọtụtụ nsụgharị ndị ọzọ, e jighị aha ahụ bụ́ Jehova mee ihe, e ji utu aha ndị dị ka “Onyenwe anyị” ma ọ bụ “Onye Na-adị Ndụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi,” dochie ya. Gịnị ka e kwesịrị iji mee ihe n’amaokwu a? Utu aha ka ọ̀ bụ aha ahụ bụ́ Jehova?

Aha Chineke ná mkpụrụ akwụkwọ Hibru

Amaokwu a na-ekwu banyere otu aha. N’asụsụ Hibru mbụ, nke e ji dee akụkụ ka ukwuu nke Bible, e jiri ahaaka nke pụrụ iche mee ihe n’amaokwu ahụ. A na-asụpe ya ịbụ יהוה (YHWH) ná mkpụrụ akwụkwọ Hibru. N’Igbo, ihe a na-asụgharịkarị aha ahụ bụ “Jehova.” Aha ahụ, ọ̀ pụtara nanị n’otu amaokwu Bible? Ee e. Ọ pụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ugboro 7,000 n’ihe odide mbụ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru!

Olee otú aha Chineke dịruru ná mkpa? Tụlee ekpere ihe nlereanya ahụ Jizọs Kraịst kụziri. O si otú a malite: “Nna anyị nke nọ n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.” (Matiu 6:9) Ka e mesịrị, Jizọs kpegaara Chineke ekpere, sị: “Nna, mee ka aha gị dị ebube.” Ná nzaghachi, Chineke si n’eluigwe kwuo, sị: “Emewo m ka ọ dị ebube, m ga-emekwa ka ọ dị ebube ọzọ.” (Jọn 12:28) O doro anya na aha Chineke dị nnọọ mkpa. Gịnịzi mere ụfọdụ ndị nsụgharị ji wepụ aha a n’ime Bible ndị ha sụgharịrị ma jiri utu aha dochie ya?

O yiri ka è nwere ihe abụọ bụ́ isi kpatara ya. Nke mbụ, ọtụtụ ndị na-ekwu na e kwesịghị iji aha ahụ na-eme ihe n’ihi na taa ọ dịghị onye maara otú e sibu kpọọ aha ahụ. A dịghị etinye ụdaume ná mkpụrụ okwu Hibru oge ochie. N’ihi ya, ọ dịghị onye pụrụ ikwu kpọmkwem otú ndị dịrị ndụ n’oge Bible si kpọọ YHWH. Otú ọ dị, nke a ò kwesịrị igbochi anyị iji aha Chineke na-eme ihe? N’oge Bible, ọ pụrụ ịbụ na ihe a kpọrọ aha ahụ bụ́ Jizọs bụ Yeshua ma ọ bụkwanụ ma eleghị anya Yehoshua—ọ dịghị onye pụrụ ikwu kpọmkwem. N’agbanyeghị nke ahụ, taa, ndị mmadụ n’ụwa nile na-eji ụdị dị iche iche nke aha ahụ bụ́ Jizọs eme ihe, ha na-akpọkwa ya n’ụzọ e si akpọ ya n’asụsụ ha. Ha adịghị ala azụ iji aha ahụ eme ihe nanị n’ihi na ha amaghị otú e si kpọọ ya na narị afọ mbụ. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na ị gaa mba ọzọ, ị pụrụ ịchọpụta na otú e si akpọ aha gị n’asụsụ ọzọ dị nnọọ iche. N’ihi ya, na a maghị otú e si kpọọ aha Chineke n’oge ochie abụghị ihe mere a ga-eji ghara iji ya na-eme ihe.

Ihe nke abụọ a na-ekwukarị na ọ bụ ya mere e ji wepụ aha Chineke n’ime Bible bụ omenala ọkpụtọrọkpụ nke ndị Juu. Ọtụtụ n’ime ha kweere na e kwesịtụghị ịkpọ aha Chineke. Ihe àmà na-egosi na nkwenkwe a dabeere ná nghọtahie ha ghọtahiere iwu Bible nke na-ekwu, sị: “Gị eburula aha Jehova, bụ́ Chineke gị, ime ihe efu; n’ihi na Jehova agaghị agụ onye na-eburu aha Ya ime ihe efu n’onye ikpe na-amaghị.”—Ọpụpụ 20:7.

Iwu a megidere iji aha Chineke eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Ma, ò megidere iji aha ya eme ihe n’ụzọ dị ùgwù? Ọ dịghị ma ọlị. Ndị dere Bible Hibru (“Agba Ochie”) bụcha ndị ikom kwesịrị ntụkwasị obi, ndị biri ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’Iwu ahụ Chineke nyere Izrel oge ochie. Ma, ha jiri aha Chineke mee ihe mgbe nile. Dị ka ihe atụ, ha tinyere ya n’ọtụtụ abụ ọma ndị ìgwè ndị na-efe ofufe ji olu dara ụda bụọ. Ọbụna Jehova Chineke gwara ndị na-efe ya ofufe ka ha kpọkuo aha ya, ndị kwesịrị ntụkwasị obi rubekwara isi. (Joel 2:32; Ọrụ 2:21) N’ihi ya, Ndị Kraịst taa adịghị ala azụ n’iji aha Chineke eme ihe n’ụzọ dị ùgwù, dị nnọọ ka Jizọs mere.—Jọn 17:26.

Ndị sụgharịrị Bible hiere nnọọ ụzọ n’iji utu aha dochie aha Chineke. Ha mere ka o yie ka ọ̀ bụ na Chineke abụghị onye nakwa na a pụghị ịbịaru ya nso, ebe ọ bụkwanụ na Bible na-agba ndị mmadụ ume iso Jehova “na-enwe mmekọrịta chiri anya.” (Abụ Ọma 25:14, NW) Cheedị banyere otu ezigbo enyi gị. Oleedị otú unu ga-esi nwee mmekọrịta chiri anya ma ọ bụrụ na ị maghị aha enyi gị? N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na ndị mmadụ amaghị aha Chineke, bụ́ Jehova, olee otú ha pụrụ isi bịaruo Chineke nso n’ezie? Ọzọkwa, ọ bụrụ na ndị mmadụ adịghị eji aha Chineke eme ihe, ha agaghịkwa ama ihe dị ebube aha ahụ pụtara. Gịnị ka aha Chineke pụtara?

Chineke n’onwe ya kọwaara ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ Mozis, ihe aha ya pụtara. Mgbe Mozis jụrụ Chineke aha ya, Jehova zara ya, sị: “M ga-abụ ihe m chọrọ ịbụ.” (Ọpụpụ 3:14, NW) Ná nsụgharị Rotherham, e si otú a sụgharịa okwu ndị a: “M Ga-aghọ ihe ọ bụla masịrị m.” N’ihi ya, Jehova pụrụ ịghọ ihe ọ bụla dị mkpa iji mezuo nzube ya.

Ka e were ya na ị ga-enwe ike ịghọ ihe ọ bụla ị chọrọ ịghọ. Gịnị ka ị ga-emere ndị enyi gị? Ọ bụrụ na otu n’ime ha adaa ezigbo ọrịa, i nwere ike ịghọ dọkịta maara nke a na-akọ ma gwọọ ya. Ọ bụrụ na onye nke ọzọ enwee mfu ego, ị pụrụ ịghọ omepụrụ onye ọ dịịrị ma gbatara ya ọsọ enyemaka. Otú ọ dị, nke bụ́ eziokwu bụ na a kpaara ihe i nwere ike ịghọ ókè. A kpaara ihe anyị nile nwere ike ịghọ ókè. Ka ị na-amụ Bible, ọ ga-eju gị anya ịhụ otú Jehova si aghọ ihe ọ bụla dị mkpa iji mezuo nkwa ya. Ọ na-amasịkwa ya iji ike ya na-eme ihe maka ndị hụrụ ya n’anya. (2 Ihe E Mere 16:9) Ndị na-amaghị aha Jehova adịghị aghọta akụkụ a magburu onwe ya nke àgwà ya.

N’ụzọ doro anya, aha ahụ bụ́ Jehova kwesịrị ịdị n’ime Bible. Ịmata ihe ọ pụtara na iji ya na-eme ihe mgbe nile n’ofufe anyị, ga-enyere anyị nnọọ aka ịbịaru Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, nso. *

^ par. 12 Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere aha Chineke, ihe ọ pụtara, na ihe ndị mere e ji kwesị iji ya na-eme ihe n’ofufe, lee broshuọ bụ́ Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, bụ́ nke Ndịàmà Jehova bipụtara.