Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ODIDE NTỤKWASỊ

Otú Amụma Daniel Si Gosi Mgbe Mezaịa Ga-abịa

Otú Amụma Daniel Si Gosi Mgbe Mezaịa Ga-abịa

DANIEL onye amụma biri ndụ ihe karịrị afọ 500 tupu a mụọ Jizọs. Otú ọ dị, Jehova kpugheere Daniel ihe ndị ga-eme ka e nwee ike ịmata kpọmkwem mgbe Jizọs ga-aghọ onye e tere mmanụ, ma ọ bụ onye a họpụtara, dị ka Mezaịa, ma ọ bụ Kraịst. A gwara Daniel, sị: “Mara, werekwa uche mata, na site ná mpụta okwu ahụ iwughachi na iwuzi Jeruselem ruo mgbe onye e tere mmanụ, bụ́ onye ndú, ga-adị izu asaa: na [izu iri isii na abụọ].”—Daniel 9:25.

Iji mata mgbe Mezaịa ahụ ga-abịa, ọ dị mkpa ka anyị buru ụzọ mata mgbe a ga-amalite gụwa oge ga-eduga anyị n’ọbịbịa nke Mezaịa ahụ. Dị ka amụma ahụ si kwuo, ọ bụ “site ná mpụta okwu ahụ iwughachi na iwuzi Jeruselem.” Olee mgbe “mpụta nke okwu ahụ” weere ọnọdụ? Dị ka onye so dee Bible bụ́ Nehemaịa, si kwuo, e nyere iwu ka e wughachi mgbidi Jeruselem “n’afọ nke [iri abụọ] nke Ataksaksis, bụ́ eze.” (Nehemaịa 2:1, 5-8) Ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme gbara akaebe na afọ 474 T.O.A bụ afọ mbụ zuru ezu Ataksaksis chịrị dị ka eze. N’ihi ya, afọ nke 20 nke ọ chịrị dị ka eze bụ n’afọ 455 T.O.A. Ugbu a, anyị amatala mgbe a ga-amalite gụwa oge ga-eduga anyị n’ọbịbịa nke Mezaịa ahụ Daniel buru amụma banyere ya, ya bụ, n’afọ 455 T.O.A.

Daniel gosiri otú oge ahụ ga-eduga n’ọbịbịa nke “onye e tere mmanụ, bụ́ onye ndú” ga-aharu n’ogologo. Amụma ahụ kwuru na ọ bụ “izu asaa, na [izu iri isii na abụọ]”—ngụkọta nke izu 69. Olee otú oge a hà n’ogologo? Ọtụtụ nsụgharị Bible na-ekwu na izu ndị ahụ abụghị izu nke ụbọchị asaa, kama ha bụ izu nke afọ. Ya bụ, izu nke ọ bụla na-anọchi anya afọ asaa. Ndị Juu nke oge ochie maara banyere izu nke afọ, ma ọ bụ izu ndị bụ afọ asaa, afọ asaa. Dị ka ihe atụ, ha na-enwe afọ Izu Ike kwa afọ asaa ọ bụla. (Ọpụpụ 23:10, 11) Ya mere, izu 69 ahụ e buru n’amụma dị afọ asaa ụzọ 69, ma ọ bụ ngụkọta nke afọ 483.

Ugbu a, ka anyị gbakọọ ya. Ọ bụrụ na anyị esi na 455 T.O.A gụrụ bịawa, afọ 483 ga-edurute anyị n’afọ 29 nke O.A. Ọ bụ afọ ahụ kpọmkwem ka e mere Jizọs baptizim ya aghọọkwa Mezaịa! * (Luk 3:1, 2, 21, 22) Nke ahụ ọ́ bụghị mmezu dị ịrịba ama nke amụma Bible?

^ par. 6 Site na 455 T.O.A. ruo 1 T.O.A. dị afọ 454. Site na 1 T.O.A. ruo 1 nke O.A. dị otu afọ. Sitekwa na 1 nke O.A. ruo 29 nke O.A. dị afọ 28. Ọ bụrụ na anyị agbakọta ọnụ ọgụgụ atọ ndị a, anyị ga-enweta afọ 483. ‘E bipụrụ’ Jizọs site n’igbu ya n’afọ 33 nke O.A., n’ime izu nke 70 nke afọ. (Daniel 9:24, 26) Lee akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel! isi nke 11, na Ụlọ Nche nke October 1, 1992, peeji nke 11. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtachara ha.