Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ODIDE NTỤKWASỊ

Jizọs Kraịst—Mezaịa ahụ E Kwere ná Nkwa

Jizọs Kraịst—Mezaịa ahụ E Kwere ná Nkwa

IJI nyere anyị aka ịmata onye bụ Mezaịa ahụ, Jehova Chineke kpaliri ọtụtụ ndị amụma nke Bible ikwu ihe ụfọdụ banyere ọmụmụ, ozi, na ọnwụ nke Onye Nnapụta a e kwere ná nkwa. Amụma ndị a nile nke Bible mezuru n’ebe Jizọs Kraịst nọ. Ha na-enye nnọọ ihe ọmụma zuru ezu ma zie ezi. Iji maa atụ, ka anyị tụlee amụma ole na ole ndị kwuru banyere ihe ndị ga-eme n’oge ọmụmụ nke Mezaịa ahụ nakwa n’oge ọ bụ nwata.

Aịzaịa onye amụma buru amụma na Mezaịa ahụ ga-esite n’eriri Eze Devid. (Aịsaịa 9:7) N’ezie, Jizọs si n’usoro ọmụmụ Devid.—Matiu 1:1, 6-17.

Maịka, bụ́ onye amụma ọzọ nke Chineke, buru amụma na nwa a ga-emesị ghọọ onye ọchịchị nakwa na a ga-amụ ya na “Betlehem Efrata.” (Maịka 5:2) N’oge a mụrụ Jizọs, e nwere obodo abụọ a na-akpọ Betlehem. Otu dị nso na Nazaret n’akụkụ ebe ugwu nke mba ahụ, nke ọzọ dịdebekwara Jeruselem nke dị na Juda. Ihe a na-akpọbu Betlehem nke dịdebere Jeruselem bụ Efrata. A mụrụ Jizọs n’obodo ahụ, kpọmkwem dị ka amụma ahụ si kwuo!—Matiu 2:1.

Amụma ọzọ nke Bible kwuru na ‘a ga-akpọpụta Ọkpara Chineke n’Ijipt.’ A kpọọrọ nwa ahụ bụ́ Jizọs gaa Ijipt. A kpọlatara ya mgbe Herọd nwụsịrị, wee si otú ahụ mezuo amụma ahụ.—Hosea 11:1; Matiu 2:15.

Na  chaatị dị na peeji nke 200, akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e depụtara n’okpuru okwu bụ́ “Amụma,” na-enye ihe ọmụma banyere Mezaịa ahụ. Biko jiri akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a tụnyere akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e depụtara n’okpuru okwu bụ́ “Mmezu Ya.” Ime otú ahụ ga-eme ka i kwenyesikwuo ike na Okwu Chineke bụ eziokwu.

Ka ị na-agụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a, buru n’uche na e deturu ụfọdụ n’ime ha ndị bụ́ amụma ọtụtụ narị afọ tupu a mụọ Jizọs. Jizọs kwuru, sị: “Ihe nile e dere n’iwu Mozis na n’akwụkwọ ndị amụma na Abụ Ọma banyere m aghaghị imezu.” (Luk 24:44) Dị ka Bible na-egosi n’ụzọ doro anya, ha mezuru n’ezie—n’ụzọ zuru ezu!