Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE MBỤ

“Nke a Bụ Ihe Ịhụ Chineke n’Anya Pụtara”

“Nke a Bụ Ihe Ịhụ Chineke n’Anya Pụtara”

“Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu; ma ihe o nyere n’iwu adịghị arọ.”—1 JỌN 5:3.

1, 2. Gịnị na-akpali gị ịhụ Jehova Chineke n’anya?

Ị̀ HỤRỤ Chineke n’anya? Ọ bụrụ na ị rarala ndụ gị nye Jehova Chineke, gị na ya ana-enwekwa mmekọrịta, n’ezie ị ga-eji obi gị dum zaa ee—ihe ị zara zikwara ezi! Anyị kwesịrị ịhụ Jehova n’anya. Anyị hụrụ Chineke n’anya n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. Baịbụl kwuru, sị: ‘Ma anyị onwe anyị nwere ịhụnanya, n’ihi na Jehova bu ụzọ hụ anyị n’anya.’—1 Jọn 4:19.

2 Jehova bu ụzọ gosi anyị ịhụnanya ya. O nyere anyị ebe obibi mara mma nke bụ́ ụwa. Ọ na-egbo mkpa anụ ahụ́ anyị na mkpa ihe onwunwe anyị. (Matiu 5:43-48) Karịsịa, ọ na-egbo mkpa ime mmụọ anyị. O nyere anyị Okwu ya bụ́ Baịbụl. Ọ gwakwara anyị ka anyị na-ekpeku ya ekpere, kwekwa anyị nkwa na ya ga na-aza ekpere anyị, na-enyekwa anyị mmụọ nsọ ya nke ga na-enyere anyị aka. (Abụ Ọma 65:2; Luk 11:13) Nke ka nke, o zitere Ọkpara ya ọ kacha hụ n’anya ka ọ bụrụ Onye Mgbapụta ga-agbapụta anyị ná mmehie na ọnwụ. Jehova egosiwo anyị ịhụnanya dị ukwuu!—Jọn 3:16; Ndị Rom 5:8.

3. (a) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọgide n’ịhụnanya Chineke, gịnị ka anyị ga-eme? (b) Olee ajụjụ dị mkpa anyị kwesịrị ichebara echiche, oleekwa ebe anyị ga-ahụ azịza ya?

3 Jehova chọrọ ka anyị na-erite uru n’ịhụnanya ya ruo mgbe ebighị ebi. Otú ọ dị, ọ bụ anyị ka ọ dịịrị ikpebi ma ànyị ga-eme otú ahụ ma ọ bụ na anyị agaghị eme. Okwu Chineke na-agba anyị ume, sị: “Nọrọnụ n’ịhụnanya Chineke . . . nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi.” (Jud 21) Okwu ahụ bụ́ “nọrọnụ” gosiri na anyị ga na-agbalịsi ike ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọgide n’ịhụnanya Chineke. Anyị kwesịrị igosi na anyị hụrụ Chineke n’anya n’ihi ịhụnanya ọ hụrụ anyị. Ya mere, ajụjụ dị mkpa anyị ga-echebara echiche bụ ‘Olee otú m nwere ike isi gosi na m hụrụ Chineke n’anya?’ Anyị ga-ahụ azịza ya n’ihe Jọn onyeozi kwuru site n’ike mmụọ nsọ. O kwuru, sị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu; ma ihe o nyere n’iwu adịghị arọ.” (1 Jọn 5:3) Anyị kwesịrị ịtụle nke ọma ihe ihe a o kwuru pụtara, n’ihi na anyị chọrọ igosi Chineke na anyị hụrụ ya n’anya nke ukwuu.

“NKE A BỤ IHE ỊHỤ CHINEKE N’ANYA PỤTARA”

4, 5. (a) Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “ịhụ Chineke n’anya” pụtara? (b) Kọwaa otú ịhụ Jehova n’anya si malite ịdị gị n’obi.

4 “Ịhụ Chineke n’anya”—gịnị ka Jọn onyeozi bu n’obi mgbe o dere okwu ndị ahụ? Ihe Jọn na-ekwu banyere ya abụghị ịhụnanya Chineke nwere n’ebe anyị nọ, kama, ọ na-ekwu banyere ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ. Ì nwere ike icheta mgbe ịhụ Jehova n’anya malitere ịdị gị n’obi?

Nraranye na baptizim na-egosi na mmadụ amalitela iji obi ya dum na-erubere Jehova isi ná ndụ ya

5 Chetụgodị echiche banyere mgbe ị malitere ịmụ eziokwu banyere Jehova na nzube ya, gị amalite inwe okwukwe. Ị ghọtara mgbe ahụ na ọ bụ ezie na mgbe a mụrụ gị, ị bụ onye mmehie nke ya na Chineke na-adịghị ná mma, Jehova si n’aka Kraịst mepeere gị ụzọ ị ga-esi nweta izu okè ahụ Adam tụfuru, na ụzọ ị ga-esi nweta ndụ ebighị ebi. (Matiu 20:28; Ndị Rom 5:12, 18) Ị malitere ịghọta na ọ bụ àjà dị ukwuu ka Jehova chụrụ mgbe o zitere Ọkpara ya ọ kacha hụ n’anya ka ọ nwụọ n’ihi gị. O ruru gị n’obi. I wee malite inwe ịhụnanya n’ebe Chineke nọ, bụ́ onye hụrụ gị n’anya nke ukwuu otú ahụ.—1 Jọn 4:9, 10.

6. Olee otú e si egosi ezi ịhụnanya, gịnịkwa ka i mere n’ihi ịhụnanya ị hụrụ Chineke?

6 Otú ọ dị, naanị ihe ịhụnanya ahụ dị gị n’obi gosiri bụ na ị malitela inwe ezi ịhụnanya n’ebe Jehova nọ. Ịhụnanya anaghị adị mmadụ naanị n’obi; a naghịkwa ekwu ya naanị n’ọnụ. Inwe ezi ịhụnanya n’ebe Chineke nọ abụghị naanị ịsị, “Ahụrụ m Jehova n’anya.” Dị ka okwukwe, ihe e ji amata ezi ịhụnanya bụ ihe ọ kpaliri mmadụ ime. (Jems 2:26) E kwuo ya kpọmkwem, otú anyị ga-esi egosi na anyị nwere ịhụnanya bụ imere onye anyị hụrụ n’anya ihe ga-adị ya mma. N’ihi ya, mgbe ịhụnanya i nwere n’ebe Jehova nọ gbanyere mgbọrọgwụ n’obi gị, o mere ka ị chọọ ibi ndụ nke ga-adị Nna gị nke eluigwe mma. Ị̀ bụ Onyeàmà e mere baptizim? Ọ bụrụ na ị bụ, ezigbo ịhụnanya ahụ na ntụkwasị obi i nwere n’ebe Chineke nọ mere ka i mee mkpebi kasị mkpa ị ga-eme ná ndụ gị. Ị raara onwe gị nye Jehova na ị ga-eme uche ya. I gosikwara ya site n’ịbụ onye e mere baptizim. (Ndị Rom 14:7, 8) Otu n’ime ụzọ anyị ga-esi emezu nkwa a dị mkpa anyị kwere Jehova bụ ihe ọzọ Jọn onyeozi kwuru.

“ANYỊ NA-EDEBE IHE O NYERE N’IWU”

7. Olee ụfọdụ n’ime ihe Chineke nyere n’iwu, gịnịkwa ka idebe ha pụtara?

7 Jọn kọwara ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara: “Anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu.” Olee ihe Chineke nyere n’iwu? Jehova nyere anyị iwu dị iche iche a kapịrị ọnụ site n’Okwu ya bụ́ Baịbụl. Dị ka ihe atụ, ọ sịrị anyị emela ihe ndị dị ka ịṅụbiga mmanya okè, ịkwa iko, ikpere arụsị, izu ohi, na ịgha ụgha. (1 Ndị Kọrịnt 5:11; 6:18; 10:14; Ndị Efesọs 4:28; Ndị Kọlọsi 3:9) Idebe ihe Chineke nyere n’iwu pụtara ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị doro anya o nyere na Baịbụl banyere omume ọma.

8, 9. Olee otú anyị pụrụ isi mata ihe dị Jehova mma ọbụna n’ebe iwu Baịbụl na-ekwughị ihe ọ bụla kpọmkwem? Nye ihe atụ.

8 Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe dị Jehova mma, ihe anyị ga-eme abụghị naanị irube isi n’ihe o kwuru bụ́ iwu ya. Jehova ejighị iwu ga-eduzi ihe niile anyị na-eme ná ndụ kwa ụbọchị kee anyị agbụ. Ya mere, kwa ụbọchị, anyị pụrụ ịhụ ọtụtụ ihe iwu Baịbụl na-ekwughị ihe ọ bụla banyere ha. N’ihe ndị dị otú ahụ, olee otú anyị ga-esi mata ihe ga-adị Jehova mma? N’ime Baịbụl, e nwere ọtụtụ ihe na-eme ka ihe bụ́ echiche Chineke doo anya. Ka anyị na-amụ Baịbụl, anyị na-amata ihe Jehova hụrụ n’anya na ihe ọ kpọrọ asị. (Abụ Ọma 97:10; Ilu 6:16-19) Anyị na-aghọta àgwà na omume na-atọ ya ụtọ. Ka anyị na-amụkwu banyere àgwà Jehova na ụzọ ya, otú ahụ ka anyị ga-enwekwu ike ime ka echiche ya na-eduzi mkpebi anyị nakwa ihe anyị na-eme. Ya mere, ọbụna mgbe a na-enweghị iwu a kapịrị ọnụ Baịbụl nyere, anyị nwere ike ịghọta “ihe uche Jehova bụ.”—Ndị Efesọs 5:17.

9 Dị ka ihe atụ, ọ dịghị iwu Baịbụl nyere nke sịrị ka anyị ghara ile vidio ma ọ bụ TV ebe a na-egosi ime ihe ike jọgburu onwe ya ma ọ bụ mmekọahụ rụrụ arụ. Ma, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịma na ile ihe ndị ahụ adịghị mma, ọ bụrụgodị na ọ dịghị iwu ọ bụla sịrị ka anyị ghara ile ha? Anyị ma otú Jehova si ele ihe ndị ahụ anya. Okwu ya gwara anyị hoo haa, sị: ‘Mkpụrụ obi Jehova kpọrọ onye ọ bụla nke hụrụ ime ihe ike n’anya asị.’ (Abụ Ọma 11:5) Baịbụl kwukwara, sị: “Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko ikpe.” (Ndị Hibru 13:4) Ọ bụrụ na anyị echebara okwu ndị ahụ si n’ike mmụọ nsọ echiche, anyị pụrụ ịghọta n’ụzọ doro anya ihe bụ́ uche Jehova. Ọ bụ ya mere anyị ji kpebie na anyị agaghị ele TV ebe a na-egosi ụdị omume ndị ahụ n’ezoghị ihe ọ bụla ezo, bụ́ ihe Chineke anyị kpọrọ asị. Anyị ma na ọ ga-adị Jehova mma ma ọ bụrụ na anyị ezere omume retọrọ eretọ, nke ụwa a na-agbalị igosi ndị mmadụ, na-asị na ọ bụ ntụrụndụ dị mma. *

10, 11. Gịnị mere anyị ji kpebie irubere Jehova isi mgbe niile, oleekwa ụdị isi anyị na-erubere ya?

10 Olee isi ihe mere anyị ji edebe ihe Chineke nyere n’iwu? Gịnị mere anyị ji kpebie ibi ndụ kwa ụbọchị n’ụzọ kwekọrọ n’ihe anyị ma na ọ bụ otú Chineke si eche echiche? Ihe mere anyị ji kpebie ime otú ahụ abụghị naanị ka a ghara inye anyị ntaramahụhụ ma ọ bụ ka anyị zere ihe ndị leghaara iwu Chineke anya na-eji aka ha ekotere onwe ha. (Ndị Galeshia 6:7) Kama nke ahụ, anyị ghọtara na irubere Jehova isi bụ ohere anyị ga-eji gosi na anyị hụrụ ya n’anya. Otú ahụ o si anụ nwatakịrị ọkụ n’obi ime ihe ga-adị nna ya mma, otú ahụ ka anyị chọrọ isi na-eme ihe dị Jehova mma. (Abụ Ọma 5:12) Ọ bụ Nna anyị. Anyị hụkwara ya n’anya. Ọ dịghị ihe na-eme ka anyị nwee ọṅụ ma ọ bụ afọ ojuju dị ukwuu karịa ịma na otú anyị si ebi ndụ ga-eme ka anyị ‘nweta ihu ọma Jehova.’—Ilu 12:2.

11 Ya mere, isi anyị na-erubere Chineke abụghị ihe na-esighị anyị n’obi; anyị adịghịkwa erubere ya isi naanị n’ihe ole na ole. * Anyị adịghị ahọrọ mgbe anyị ga-erubere ya isi, ya bụ, irube isi naanị mgbe ọ dị anyị mma ma ọ bụ mgbe irube isi na-agaghị esiri anyị ike. Kama nke ahụ, anyị ‘na-esi n’obi anyị erube isi.’ (Ndị Rom 6:17) Anyị kwetara ihe ọbụ abụ so dee Baịbụl kwuru, bụ́ onye dere, sị: “Ihe i nyere n’iwu, bụ́ nke m hụrụ n’anya, ga na-atọ m ụtọ.” (Abụ Ọma 119:47) N’ezie, anyị hụrụ irubere Jehova isi n’anya. Anyị ghọtara na ọ bụ ya ka anyị kwesịrị iji obi anyị dum na-erubere isi n’ihe niile. Nke ahụ bụkwa ihe ọ chọrọ ka anyị na-eme. (Diuterọnọmi 12:32) Ihe Okwu Jehova kwuru banyere Noa ka anyị chọrọ ka Jehova kwuo banyere anyị. Nna ochie ahụ nke kwesịrị ntụkwasị obi gosiri na ọ hụrụ Chineke n’anya site n’irubere ya isi ruo ọtụtụ iri afọ. Baịbụl kwuru banyere ya, sị: “Noa wee mee dị ka ihe niile Chineke nyere ya n’iwu si dị. O mere nnọọ otú ahụ.”—Jenesis 6:22.

12. Gịnị ga-eme ka isi anyị na-erube mee ka obi Jehova ṅụrịa?

12 Olee otú obi na-adị Jehova ma anyị jiri obi anyị dum na-erubere ya isi? Okwu ya kwuru na ‘obi ya na-aṅụrị’ ma anyị na-eme otú ahụ. (Ilu 27:11) Ọ bụrụ na anyị erube isi, ọ̀ ga-eme ka obi Ọkaakaa Onyenwe eluigwe na ụwa ṅụrịa n’ezie? Ee, ọ ga-eme ka ọ ṅụrịa—e nwekwara ezi ihe kpatara ya! Jehova kere anyị, kwe ka anyị na-ahọrọ ihe anyị chọrọ ime. Nke a pụtara na anyị nwere ikike ikpebi ihe anyị ga-eme; anyị nwere ike ikpebi irubere Chineke isi, ma ọ bụkwanụ kpebie inupụrụ ya isi. (Diuterọnọmi 30:15, 16, 19, 20) Ọ bụrụ na anyị ekpebie iji obi anyị dum na-erubere Jehova isi, ọ bụrụkwa na anyị ekpebie ime otú ahụ n’ihi na anyị ji obi anyị dum hụ Chineke n’anya, anyị ga-eme ka obi tọọ Nna anyị nke eluigwe ụtọ nke ukwuu, meekwa ka o nwee ọṅụ. (Ilu 11:20) Ọ pụtakwara na anyị ahọrọla ụzọ ndụ nke kacha mma.

“IHE O NYERE N’IWU ADỊGHỊ ARỌ”

13, 14. Gịnị mere a ga-eji kwuo na ‘ihe Chineke nyere n’iwu adịghị arọ’? Olee ihe atụ e nwere ike iji kọwaa ya?

13 Jọn onyeozi gwara anyị ihe ga-eme ka obi sie anyị ike nke ukwuu n’ihe Jehova chọrọ ka anyị na-eme: “Ihe o nyere n’iwu adịghị arọ.” Otú e si dee okwu Grik a sụgharịrị “arọ” na 1 Jọn 5:3 bụ “ịnyị arọ.” * Otú e si sụgharịa ya na Baịbụl ọzọ bụ: ‘Idebezu iwu Chineke nile adịghị enye nsogbu.’ (Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Ihe Jehova chọrọ ka anyị na-eme abụghị ihe ezi uche na-adịghị na ya ma ọ bụ ihe dị arọ. Iwu ya abụghị ihe ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-enweghị ike idebe.

14 Dị ka ihe atụ, otu ezigbo enyi gị gwara gị ka ị bịa nyere ya aka mgbe ọ chọrọ ịkwapụ ebe o bi. E nwere ọtụtụ igbe a ga-ebu. Ụfọdụ n’ime ha dị mfe nke na ha agaghị esiri otu onye ike obubu. Ma, ndị ọzọ dị arọ nke na ọ bụ mmadụ abụọ ga-enwe ike ibu ha. Enyi gị agwa gị igbe ndị ọ chọrọ ka i buru. Ọ̀ ga-agwa gị ka i buru igbe ndị ọ ma na ị gaghị ebuli? Ee e. Ọ gaghị achọ ka i merụọ onwe gị ahụ́ n’ebe ị na-agbalị ka naanị gị buru igbe ndị ahụ. N’otu aka ahụ, Chineke anyị bụ́ onye nwere ịhụnanya na obiọma agwaghị anyị ka anyị debe iwu ndị siri ike bụ́ ndị anyị na-agaghị enwe ike idebe. (Diuterọnọmi 30:11-14) Ọ dịghị mgbe ọ ga-agwa anyị ka anyị buru ibu arọ dị otú ahụ. Jehova ma adịghị ike anyị, n’ihi na “ya onwe ya maara nnọọ otú e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ ájá.”—Abụ Ọma 103:14.

15. Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na ihe Jehova nyere n’iwu bụ maka ọdịmma anyị?

15 Ihe Jehova nyere n’iwu adịghị arọ ma ọlị; o nyere ya maka ọdịmma anyị. (Aịzaya 48:17) Ọ bụ ya mere Mozis ji gwa ndị Izrel oge ochie, sị: “Jehova nyere anyị iwu ka anyị debe ụkpụrụ ndị a niile, ịtụ egwu Jehova bụ́ Chineke anyị ka o wee dịrị anyị mma mgbe niile, ka anyị wee dịrị ndụ dị ka anyị dị taa.” (Deuterọnọmi 6:24) Obi kwesịkwara isi anyị ike na ihe Jehova bu n’obi nye anyị iwu ya bụ ka ọ dịrị anyị mma ruo ogologo oge—ọbụna ruo mgbe ebighị ebi. N’ezie, ọ̀ dị ihe mere anyị ga-eji nwee obi abụọ? Jehova bụ Chineke nke nwere amamihe na-enweghị nsọtụ. (Ndị Rom 11:33) Ya mere, ọ ma ihe ga-akacha baara anyị uru. Jehova bụkwa ịhụnanya n’onwe ya. (1 Jọn 4:8) Ịhụnanya bụ isi sekpụ ntị n’àgwà ya. Ọ bụ ihe na-emetụta ihe niile ọ na-ekwu na ihe niile ọ na-eme. Ọ bụ ebe iwu niile o nyere ndị ohu ya dabeere.

16. N’agbanyeghị otú ụwa a rụrụ arụ si akpa ike n’ahụ́ ndị mmadụ, n’agbanyeghịkwa ihe na-agụkarị anụ ahụ́ anyị na-ezughị okè, gịnị mere anyị ga-eji nwee ike irube isi mgbe niile?

16 Nke a apụtaghị na irubere Chineke isi bụ ihe dị mfe. Anyị aghaghị ịlụso ụwa a rụrụ arụ ọgụ, ya bụ, ụwa nke “dị n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Anyị aghaghịkwa ịlụso anụ ahụ́ anyị na-ezughị okè ọgụ, ya bụ, anụ ahụ́ nke na-achọkarị ka anyị mebie iwu Chineke. (Ndị Rom 7:21-25) Ma, ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ pụrụ ime ka anyị merie. Jehova na-agọzi ndị chọrọ igosi na ha hụrụ ya n’anya site n’irubere ya isi. Ọ na-ewere mmụọ nsọ ya nye “ndị na-erubere ya isi dị ka onye na-achị achị.” (Ọrụ 5:32) Mmụọ ahụ na-amịpụta mkpụrụ ndị magburu onwe ha n’ime anyị, ya bụ, àgwà ndị pụrụ inyere anyị aka irubere Chineke isi mgbe niile.—Ndị Galeshia 5:22, 23.

17, 18. (a) Gịnị ka anyị ga-atụle n’akwụkwọ a? Mgbe anyị na-atụle ya, gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche? (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya n’Isi nke Abụọ?

17 N’akwụkwọ a, anyị ga-eleba anya n’ụkpụrụ dị iche iche Jehova nyere na iwu ndị o nyere banyere omume ọma, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-egosi ihe bụ́ uche ya. Ka anyị na-eleba anya n’ihe ndị a, anyị kwesịrị iburu ihe ụfọdụ dị mkpa n’uche. Ka anyị cheta na Jehova anaghị amanye anyị ka anyị rube isi n’iwu ya nakwa n’ụkpụrụ ya; ọ chọrọ ka isi anyị na-erubere ya si anyị n’ala ala obi. Ka anyị ghara ichefu na Jehova na-agwa anyị ka anyị na-ebi ndụ n’ụzọ ga-eme ka anyị nweta ngọzi dị ukwuu ugbu a, nwetakwa ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu. Ka anyị mara na isi anyị ji obi anyị dum na-erubere Jehova bụ ohere na-enweghị atụ anyị ga-eji gosi ya na anyị hụrụ ya n’anya nke ukwuu.

18 Iji nyere anyị aka ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi, Jehova nyere anyị akọnuche n’ihi ịhụnanya ya. Ma, ọ bụrụ na akọnuche anyị ga-abụ ezigbo ihe nduzi, e kwesịrị ịzụ ya azụ, dị ka a ga-atụle n’Isi nke Abụọ.

^ par. 9 Gụọ Isi nke Isii n’akwụkwọ a, ka ị hụ ebe a tụlere otú anyị ga-esi na-ahọrọ ntụrụndụ dị mma.

^ par. 11 Ọbụna ndị mmụọ ọjọọ nwere ike irube isi nke na-esighị ha n’obi. Mgbe Jizọs nyere ndị mmụọ ọjọọ iwu ka ha si n’ime ụfọdụ ndị mmụọ ọjọọ ji pụta, a manyere ndị mmụọ ọjọọ ahụ ime ihe o kwuru. Ha rubere isi, n’agbanyeghị na o sighị ha n’obi.—Mak 1:27; 5:7-13.

^ par. 13 Na Matiu 23:4, e ji okwu a kọwaa “ibu dị arọ,” ya bụ, iwu ndị dị rịgọ rịgọ na ọdịnala ndị mmadụ chepụtara nke ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii bokwasịrị ndị mmadụ. N’Ọrụ Ndị Ozi 20:29, 30, a kpọrọ okwu ahụ “ndị obi tara mmiri.” E jikwa ya kọwaa ndị dị aka ike si n’ezi ofufe dapụ, ndị ga “na-ekwu ihe gbagọrọ agbagọ,” na-agbalịkwa iduhie ndị ọzọ.