Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE ATỌ

Hụ Ndị Chineke Hụrụ n’Anya n’Anya

Hụ Ndị Chineke Hụrụ n’Anya n’Anya

“Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe.”—ILU 13:20.

1-3. (a) Olee eziokwu doro anya Baịbụl kwuru? (b) Olee otú anyị ga-esi họrọ ndị enyi ga-eme ka anyị na-eme ihe ọma?

E NWERE ike ikwu na ndị mmadụ na-eme ka ákwà; ákwà na-amịrị mmiri dị n’ebe a wụnyere ya. Ọ naghị esi ike ma ọlị ịmụta àgwà nke ndị anyị na ha na-akpachi anya, tinyere ụkpụrụ ha na omume ha, ọbụna mgbe anyị na-achọghị ịmụta ha.

2 Baịbụl kwuru eziokwu doro anya mgbe ọ sịrị: “Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe, ma ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe.” (Ilu 13:20) Ihe ilu a na-ekwu abụghị naanị mmadụ na mmadụ imekọ ihe ugboro ole na ole. Okwu ahụ bụ́ ‘mmadụ na mmadụ ije ije’ pụtara mkpakọrịta na-aga n’ihu n’ihu. * Otu akwụkwọ e ji eme nnyocha na Baịbụl kwuru banyere amaokwu a, sị: “Mmadụ na mmadụ ije ije gosiri na ha abụọ hụrụ ibe ha n’anya, na-akpachikwa anya.” Ọ̀ bụ na i kwetaghị na anyị na-eṅomikarị ndị anyị hụrụ n’anya? N’ezie, ebe ọ bụ na obi anyị na-adịkarị n’ebe ndị anyị hụrụ n’anya nọ, anyị na-amụtakarị àgwà ha—ma ọ̀ bụ àgwà ọma ma ọ̀ bụ àgwà ọjọọ.

3 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọrọ n’ịhụnanya Chineke, ọ dị mkpa ka ndị anyị ga-emeta enyi bụrụ ndị ga-eme ka anyị na-eme ihe ọma. Olee otú anyị ga-esi mee otú ahụ? E kwuo ya ná nkenke, otú anyị ga-esi mee ya bụ ịhụ ndị Chineke hụrụ n’anya n’anya, ime ka ndị enyi ya bụrụ ndị enyi anyị. Chegodị echiche. Ọ̀ dị ndị enyi anyị ga-enweta ga-adị mma karịa ndị enyi nwere àgwà dị iche iche Jehova chọrọ ka ndị enyi ya nwee? Ya mere, ka anyị leba anya n’ụdị ndị Chineke hụrụ n’anya. Ọ bụrụ na anyị eburu echiche Jehova n’uche nke ọma, ọ ga-adịkwuru anyị mfe ịhọrọ ndị enyi kwesịrị ekwesị.

NDỊ CHINEKE HỤRỤ N’ANYA

4. Gịnị mere Jehova ji nwee ikike ịhọrọ ndị ọ chọrọ ka ha bụrụ ndị enyi ya, gịnịkwa mere Jehova ji kpọọ Ebreham “enyi m”?

4 N’ihe banyere ịbụ enyi, Jehova na-ahọ ndị ha na ya ga-abụ enyi ahọ. Ọ̀ bụ na o nweghị ikike ime otú ahụ? A sị ka e kwuwe, ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe eluigwe na ụwa. Mmadụ ịbụ enyi ya bụ ihe ùgwù kacha ihe ùgwù niile. Ya mere, ole ndị ka ọ na-ahọrọ ka ha bụrụ ndị enyi ya? Ndị Jehova na-akpa nso bụ ndị tụkwasịrị ya obi, ndị nwere okwukwe siri ike n’ebe ọ nọ. Dị ka ihe atụ, chee echiche banyere nna ochie ahụ bụ́ Ebreham, bụ́ nwoke a ma ama n’ihi okwukwe pụrụ iche o nwere. Ọ dịghị ihe ga-ele okwukwe nna mmadụ ule karịa ịgwa ya ka o were nwa ya nwoke chụọ àjà. * N’agbanyeghị nke ahụ, Ebreham ‘chọrọ ịchụ Aịzik n’àjà,’ n’ihi na o nwere okwukwe siri ike “na Chineke nwere ike ịkpọlite ya ọbụna site ná ndị nwụrụ anwụ.” (Ndị Hibru 11:17-19) N’ihi okwukwe na nrubeisi dị otú ahụ Ebreham nwere, Jehova ji ịhụnanya kpọọ ya “enyi m.”—Aịzaya 41:8; Jems 2:21-23.

5. Olee otú Jehova si ele ndị guzosiri ike n’ebe ọ nọ ma na-erubere ya isi anya?

5 Jehova na-ele ezigbo nrubeisi anya dị ka ihe dị oké mkpa. Ndị ọ hụrụ n’anya bụ ndị guzosiri ike n’ebe ọ nọ karịa n’ebe ndị ọzọ niile nọ. (2 Samuel 22:26) Dị ka anyị hụrụ n’Isi nke Mbụ n’akwụkwọ a, ndị kpebiri irubere Jehova isi n’ihi na ha hụrụ ya n’anya na-eme ka obi tọọ ya ụtọ nke ukwuu. Ilu 3:32 kwuru, sị: “Ya na ndị na-eme ihe n’eziokwu na-enwe mmekọrịta chiri anya.” Jehova ji obi ọma na-akpọ ndị guzosiri ike ma na-eme ihe ọ chọrọ òkù: Ha nwere ike ịbụ ndị ọbịa “n’ụlọikwuu” ya, ya bụ, ịbụ ndị ọ nabatara ka ha na-efe ya ofufe, na-ekpekukwa ya ekpere mgbe ọ bụla.—Abụ Ọma 15:1-5.

6. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị hụrụ Jizọs n’anya, oleekwa otú obi na-adị Jehova n’ebe ndị hụrụ Ọkpara ya n’anya nọ?

6 Ndị ọzọ Jehova hụrụ n’anya bụ ndị hụrụ Jizọs n’anya, ya bụ, Ọkpara ọ mụrụ naanị ya. Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla hụrụ m n’anya, ọ ga-edebe okwu m, Nna m ga-ahụkwa ya n’anya, anyị ga-abịakwutekwa ya wee mee ka ebe obibi anyị dị n’ebe ọ nọ.” (Jọn 14:23) Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị hụrụ Jizọs n’anya? N’ezie, ọ bụ site n’idebe ihe o nyere n’iwu, tinyere ọrụ ikwusa ozi ọma na ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. (Matiu 28:19, 20; Jọn 14:15, 21) Anyị na-egosikwa na anyị hụrụ Jizọs n’anya ma ọ bụrụ na anyị ‘na-esochi nzọụkwụ ya anya,’ na-eṅomi ya n’okwu anyị nakwa n’omume anyị ruo n’ókè o kwere anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè omume. (1 Pita 2:21) Mgbe ndị mmadụ na-agbalịsi ike iso nzọụkwụ Kraịst n’ihi na ha hụrụ Ọkpara Jehova n’anya, Jehova na-enwe obi ụtọ.

7. Gịnị mere anyị ji kwesị inwe ndị enyi bụ́ ndị enyi Jehova?

7 Okwukwe, ikwesị ntụkwasị obi, nrubeisi, na ịhụ Jizọs na iwu ya n’anya bụ ụfọdụ n’ime àgwà Jehova chọrọ ka ndị enyi Ya nwee. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Ndị mụ na ha na-akpachi anya hà nwere àgwà ndị ahụ na ụkpụrụ ndị ahụ? Ọ̀ bụ ndị enyi Jehova ka m metara enyi?’ Anyị kwesịrị ime otú ahụ. Ndị na-amụta àgwà Chineke ma jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ ga-abara anyị uru, mee ka anyị na-ebi ndụ kwekọrọ ná mkpebi anyị mere ime ihe dị Chineke mma.—Gụọ igbe dị na  peeji nke 29, bụ́ “Gịnị Ka Ezi Enyi Pụtara?

ỊMỤTA IHE N’IHE ATỤ DỊ NA BAỊBỤL

8. Gịnị masịrị gị ná mmekọrịta (a) Neomi na Rut? (b) ụmụ okorobịa Hibru atọ ahụ? (ch) Pọl na Timoti?

8 N’Akwụkwọ Nsọ, e nwere ọtụtụ ihe atụ na-egosi otú ndị mmadụ si rite uru n’ihi ịhọrọ ndị enyi dị mma. I nwere ike ịgụ banyere mmekọrịta Neomi na Rut nwunye nwa ya nwere, na nke ụmụ okorobịa Hibru atọ ndị bụ́ nnu na mmanụ na Babịlọn, nakwa nke Pọl na Timoti nwere. (Rut 1:16; Daniel 3:17, 18; 1 Ndị Kọrịnt 4:17; Ndị Filipaị 2:20-22) Ma, ka anyị leba anya n’ihe atụ ọzọ pụrụ iche, ya bụ, enyi Devid na Jọnatan bụ.

9, 10. Gịnị mere Devid na Jọnatan ji bụrụ enyi?

9 Baịbụl kwuru na mgbe Devid gbuchara Golayat, “e kekọtara mkpụrụ obi Jọnatan na mkpụrụ obi Devid, Jọnatan wee hụ ya n’anya dị ka mkpụrụ obi nke ya.” (1 Samuel 18:1) N’agbanyeghị na Jọnatan tọrọ Devid nke ọma, otú ahụ ka ha abụọ si malite ịbụ enyi nke yiri ụdọ a na-enweghị ike ịdọbi adọbi ruo mgbe Jọnatan nwụrụ n’ọgbọ agha. * (2 Samuel 1:26) Gịnị mere ka mmekọrịta ndị enyi abụọ a sie ike otú ahụ?

10 Ihe mere ka mmekọrịta Devid na Jọnatan sie ike bụ ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ, tinyere otú ha si kpebisie ike ikwesị ntụkwasị obi mgbe niile n’ebe ọ nọ. Otú ha si kpebisie ike ime ihe dị Chineke mma mere ka obi ha abụọ bụrụ otu. Onye ọ bụla n’ime ha na-akpa àgwà nke mere ka ibe ya hụ ya n’anya. O doro anya na Jọnatan nwere mmasị n’obi ike na ịnụ ọkụ n’obi onye ahụ na-eto eto gosiri, bụ́ onye lụrụ ọgụ maka aha Jehova n’atụghị egwu. O dokwara anya na Devid na-akwanyere nwoke ahụ tọrọ ya ùgwù, bụ́ onye ji obi ya dum na-akwado ndokwa Jehova, na-ebute ọdịmma Devid ụzọ n’achọghị ọdịmma nke onwe ya. Dị ka ihe atụ, chee echiche banyere ihe mere n’otu oge mgbe Devid dara mbà n’obi, mgbe ọ ghọrọ onye gbara ọsọ ndụ n’ala ịkpa ka ọ gbanahụ Eze Sọl iwe ji, nke bụ́ onye ọjọọ, bụrụkwa nna Jọnatan. Jọnatan guzosiri ike n’ebe Devid nọ n’ụzọ pụrụ iche. O biliri “gakwuru Devid . . . ka o wee mee ka o nwee ike n’ebe Chineke nọ.” (1 Samuel 23:16) Chee echiche otú obi dị Devid mgbe ezigbo enyi ya bịara nyere ya aka, gbaakwa ya ume! *

11. N’ihe atụ Jọnatan na Devid, gịnị ka ị mụtara banyere ịbụ enyi?

11 Gịnị ka anyị mụtara n’ihe atụ Jọnatan na Devid? Ihe pụrụ iche anyị mụtara bụ na anyị ghọtara na àgwà kacha mkpa ndị enyi kwesịrị inwe bụ iji mmekọrịta ha na Chineke kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na ndị anyị na ha na-akpachi anya bụ ndị anyị na ha kweere n’otu ihe, ndị anyị na ha na-eso otu ụkpụrụ omume, ndị chọkwara ikwesị ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ, anyị nwere ike ịgbarịta ibe anyị ume site n’ikwu ihe anyị chere, otú obi dị anyị, ma ọ bụ ịkọ ahụmahụ ndị ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. (Ndị Rom 1:11, 12) Anyị ga-enweta ndị enyi dị otú ahụ ji mmekọrịta ha na Chineke kpọrọ ihe n’etiti ndị anyị na ha na-efe Chineke. Ma, nke a ọ̀ pụtara na onye ọ bụla nke na-abịa ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze bụ onye anyị na ya kwesịrị ịna-akpakọrịta? Mbanụ, ọ bụchaghị otú ahụ.

OTÚ ANYỊ GA-ESI HỌRỌ NDỊ ANYỊ NA HA GA NA-AKPACHI ANYA

12, 13. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị ịhọ ndị anyị na ha na-akpakọrịta ahọ ọbụna n’etiti Ndị Kraịst ibe anyị? (b) Olee nsogbu ọgbakọ ụfọdụ nwere na narị afọ mbụ? Gịnị ka Pọl dọsiri ha aka ná ntị ike ka ha mee n’ihi ya?

12 Ọbụna n’ime ọgbakọ, anyị kwesịrị ịhọ ndị anyị na ha na-akpa ahọ ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ha na-eme ka mmekọrịta anyị na Chineke sikwuo ike. Nke a ò kwesịrị iju anyị anya? Mba. Ụfọdụ Ndị Kraịst nwere ike ịnọ ogologo oge tupu ha aghọọ ndị tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ, dị nnọọ ka mkpụrụ osisi ụfọdụ ndị dị n’elu osisi na-anọ ogologo oge tupu ha achaa. N’ihi ya, n’ọgbakọ ọ bụla, e nwere ma Ndị Kraịst ka bụ́ ndị ọhụrụ ma ndị tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ. (Ndị Hibru 5:12–6:3) N’ezie, anyị na-enwere ndị ọhụrụ ma ọ bụ ndị na-adịghị ike ndidi, hụkwa ha n’anya, n’ihi na anyị chọrọ inyere ha aka ito eto n’ụzọ ime mmụọ.—Ndị Rom 14:1; 15:1.

13 E nwere ike inwe mgbe ụfọdụ anyị kwesịrị ilezi anya n’ihe banyere ndị anyị na ha na-akpakọrịta. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ ndị na-akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị. Ndị ọzọ nwere ike na-ebu iwe n’obi, ma ọ bụ na-emekarị mkpesa. Ọgbakọ ụfọdụ ndị dị na narị afọ mbụ O.A. nwere ụdị nsogbu ahụ. N’agbanyeghị na ihe ka ọtụtụ n’ime ndị nọ n’ọgbakọ dị iche iche n’oge ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, ụfọdụ n’ime ha akpaghị àgwà kwesịrị ekwesị. Ebe ọ bụ na ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ Kọrịnt anabataghị ozizi ụfọdụ nke Ndị Kraịst, Pọl onyeozi dọrọ ọgbakọ Kọrịnt aka ná ntị, sị: “Unu ekwela ka e duhie unu. Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.” (1 Ndị Kọrịnt 15:12, 33) Pọl dọrọ Timoti aka ná ntị na ọbụna n’etiti Ndị Kraịst ibe ya, e nwere ike inwe ụfọdụ ndị na-adịghị eme omume kwesịrị ekwesị. Ọ gwara Timoti ka o zere ndị ahụ, ka ya na ha ghara ịkpachi anya.—2 Timoti 2:20-22.

14. Olee otú anyị ga-esi eme ihe Pọl kwo nye ịdọ aka ná ntị ndị ahụ o nyere banyere ndị anyị na ha ga na-akpa?

14 Olee otú anyị ga-esi mee ihe Pọl kwo nye ịdọ aka ná ntị ndị ahụ? Ọ bụ site n’izere onye ọ bụla nwere ike imebi àgwà ọma anyị—ma n’ime ọgbakọ ma n’èzí. (2 Ndị Tesalonaịka 3:6, 7, 14) Anyị aghaghị ichebe mmekọrịta anyị na Jehova. Cheta na dị ka ákwà, anyị na-amịrị àgwà ndị ezigbo enyi anyị na-akpa, tinyere ihe ha na-eme. Anyị agaghị awụnye ákwà n’ime mmanya gbara ụka, buru n’obi na ọ bụ mmiri ka ọ ga-amịrị. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị na ndị na-eme omume ọjọọ na-akpa, anyị ekwesịghị iburu n’obi na anyị ga-amụta omume ọma.—1 Ndị Kọrịnt 5:6.

Ị ga-enweta ndị enyi dị mma n’etiti ndị gị na ha na-efe Chineke

15. Gịnị ka ị ga-eme ka i nwee ike imeta ndị enyi n’ọgbakọ, bụ́ ndị ji mmekọrịta ha na Chineke kpọrọ ihe?

15 Obi dị anyị ụtọ na a naghị achọ ndị enyi na-akpa àgwà ọma achọ n’etiti ndị anyị na ha na-efe Chineke. (Abụ Ọma 133:1) N’ọgbakọ, olee otú ị ga-esi nweta ndị enyi ji mmekọrịta ha na Chineke kpọrọ ihe? Ka ị na-amụta àgwà Chineke na ụzọ ya, o doro anya na ndị ọzọ obi gị na ha bụ otu ga na-akpa gị nso. O nwekwara ike ịdị mkpa ka i mee ihe ụfọdụ iji bute ụzọ n’imeta ndị enyi ọhụrụ. (Gụọ igbe dị na  peeji nke 30, bụ́ “Otú Anyị Si Meta Ezi Ndị Enyi.”) Chọọ ndị na-akpa ụdị àgwà ndị ị chọrọ ka ị na-akpa. Soro ndụmọdụ Baịbụl ahụ bụ́ ‘meghee obi gị,’ ya bụ, imeta ndị enyi bụ́ ndị kwere ekwe ibe gị n’agbanyeghị agbụrụ ha, mba ha, ma ọ bụ omenala ha. (2 Ndị Kọrịnt 6:13; 1 Pita 2:17) Ahọrọla naanị ndị gị na ha bụ ọgbọ. Cheta na Jọnatan tọrọ Devid nke ọma. Ọtụtụ ndị tọrọ gị nwere ike iji ahụmahụ na amamihe dị ukwuu ha nwere mee ka enyi gị na ha bụ na-atọ ụtọ.

MGBE E NWERE NSOGBU

16, 17. Ọ bụrụ na Onye Kraịst ibe anyị emee ihe wutere anyị n’ụzọ ọ bụla, gịnị mere na anyị ekwesịghị ịhapụ ọgbakọ?

16 Ebe ọ bụ na ndị nọ n’ọgbakọ bụ ụdị mmadụ dị iche iche, ndị a zụlitekwara n’ụzọ dị iche iche, e nwere ike inwe nsogbu mgbe mgbe. Onye kwere ekwe ibe anyị nwere ike kwuo ihe ma ọ bụ mee ihe ga-ewute anyị. (Ilu 12:18) Mgbe ụfọdụ, ihe na-akpata nsogbu bụ àgwà dị iche iche ndị mmadụ nwere, nghọtahie, ma ọ bụ obi abụghị otu. Ànyị ga-asụ ngọngọ n’ihi nsogbu ndị ahụ, wee hapụ ọgbakọ? Anyị agaghị eme otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị hụrụ Jehova n’anya n’ezie, hụkwa ndị ọ hụrụ n’anya n’anya.

17 Ebe ọ bụ na Jehova bụ Onye kere anyị na Onye ji ndụ anyị, anyị kwesịrị ịhụ ya n’anya, jirikwa obi anyị dum na-efe ya ofufe. (Mkpughe 4:11) Anyị kwesịkwara iji obi anyị dum na-akwado ọgbakọ o ji na-arụ ọrụ. (Ndị Hibru 13:17) Ya mere, ọ bụrụ na Onye Kraịst ibe anyị emee ihe wutere anyị, ma ọ bụ mee ihe anyị na-atụghị anya ya n’ụzọ ọ bụla, anyị agaghị ahapụ ọgbakọ iji gosi na iwe na-ewe anyị. Anyị agaghịdị echetụ echiche ime otú ahụ. Ọ bụghị Jehova kpasuru anyị iwe. Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ ga-eme ka anyị ghara ịgbakụta ya na ndị ya azụ!—Abụ Ọma 119:165.

18. (a) Gịnị ka anyị ga-eme iji mee ka udo dịrị n’ọgbakọ? (b) Olee ngọzi ndị anyị ga-enweta ma ọ bụrụ na anyị agbaghara ndị ọzọ mgbe e nwere ezi ihe mere anyị ga-eji mee otú ahụ?

18 Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Ndị Kraịst ibe anyị nọ na-eme ka anyị na-eme ihe ga-eme ka udo dịrị n’ọgbakọ. Jehova adịghị atụ anya ka ndị ọ hụrụ n’anya bụrụ ndị zuru okè. Anyị kwesịkwara iṅomi ya. Ịhụnanya ga-eme ka anyị nwee ike ileghara obere ihe ha mejọrọ anya, cheta na anyị niile bụ ndị na-ezughị okè, na anyị na-emejọkwa ihe. (Ilu 17:9; 1 Pita 4:8) Ịhụnanya ga-enyere anyị aka ‘ịna-agbaghara ibe anyị kpamkpam.’ (Ndị Kọlọsi 3:13) Ọ naghị adị mfe mgbe niile iso ndụmọdụ a. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka iwe na-achị anyị, anyị nwere ike buru iwe n’obi, ma eleghị anya, na-eche na o nwere otú iwe anyị si enye onye ahụ mejọrọ anyị ntaramahụhụ. Ma, n’ezie, ibu iwe n’obi ga-emebiri anyị ihe. Ịgbaghara ndị ọzọ mgbe e nwere ezi ihe mere anyị ga-eji mee otú ahụ ga-ewetara anyị ngọzi dị ukwuu. (Luk 17:3, 4) Ọ ga-eme ka obi ruo anyị ala, meekwa ka udo dịrị n’ọgbakọ. Nke ka nke, ọ ga-echebe mmekọrịta anyị na Jehova.—Matiu 6:14, 15; Ndị Rom 14:19.

MGBE ANYỊ NA MMADỤ NA-AGAGHỊ AKPAKỌRỊTA

19. Olee mgbe ụfọdụ o nwere ike ịdị mkpa ka anyị na mmadụ ghara ịkpakọrịta?

19 Mgbe ụfọdụ, a na-agwa anyị ka anyị na onye nọbu n’ọgbakọ ghara ịkpakọrịta. Ọ na-abụkarị mgbe a chụpụrụ onye na-emebi iwu Chineke nke jụrụ ichegharị, ma ọ bụkwanụ mgbe mmadụ jụrụ okwukwe Ndị Kraịst site n’ịkụzi ozizi ụgha ma ọ bụ site n’ikewapụ onwe ya n’ọgbakọ. Okwu Chineke gwara anyị hoo haa ka anyị na ndị dị otú ahụ “kwụsị ịdị na-akpakọ.” * (1 Ndị Kọrịnt 5:11-13; 2 Jọn 9-11) O nwere ike ịbụ ihe siri ezigbo ike izere onye bụbu enyi anyị ma ọ bụ nwanne anyị ma eleghị anya. Ànyị ga-eguzosi ike, gosi na anyị na-asọpụrụ Jehova na iwu ezi omume ya karịa ihe ọ bụla ọzọ? Cheta na Jehova anaghị eji ịsọpụrụ ya na irubere ya isi egwuri egwu ma ọlị.

20, 21. (a) Gịnị mere ịchụpụ mmadụ n’ọgbakọ ji bụrụ ndokwa na-egosi ịhụnanya? (b) Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị jiri amamihe na-ahọrọ ndị anyị na ha na-akpa?

20 Ịchụpụ mmadụ n’ọgbakọ bụ n’ezie ndokwa ịhụnanya Jehova mere. N’ihi gịnị? Ịchụpụ onye mmehie nke na-ekweghị echegharị na-egosi na anyị hụrụ aha nsọ Jehova n’anya, hụkwa Jehova n’onwe ya na iwu ya n’anya. (1 Pita 1:15, 16) Ịchụpụ onye dị otú ahụ na-eme ka ọgbakọ dịrị ọcha. A na-echebe ndị kwesịrị ntụkwasị obi nọ n’ọgbakọ ka ha ghara ịmụta àgwà ọjọọ nke ndị gbara isi akwara na-eme mmehie. Ọ ga-eme ka obi sie ha ike mgbe ha na-efe Chineke na ọgbakọ bụ ebe e nwere nchebe n’ụwa ọjọọ a. (1 Ndị Kọrịnt 5:7; Ndị Hibru 12:15, 16) Ịdọ aka ná ntị ahụ siri ike a dọrọ onye ahụ mere ihe ọjọọ na-egosi na a hụrụ ya n’anya. O nwere ike iru ya n’ahụ́, mee ka anya doo ya, meekwa ka o mee ihe o kwesịrị ime iji laghachikwute Jehova.—Ndị Hibru 12:11.

21 O doro anya na ndị anyị na ha na-akpachi anya nwere ike ime ka anyị mụta ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ. Ya mere, ọ dị mkpa ka anyị jiri amamihe na-ahọrọ ndị anyị na ha na-akpa. Ọ bụrụ na anyị emeta ndị enyi bụ́ ndị enyi Jehova, ọ bụrụ na anyị ahụ ndị Chineke hụrụ n’anya n’anya, ndị ga-agba anyị gburugburu bụ ndị enyi kacha mma mmadụ nwere ike inwe. Ihe anyị ga-amụta n’aka ha ga-enyere anyị aka ibi ndụ nke ga-eme ka anyị mezuo mkpebi anyị mere ime ihe dị Jehova mma.

^ par. 2 Okwu Hibru ahụ e si sụgharịta “na-emekọ ihe” bụ otu okwu ahụ e si sụgharịta “nọnyeere” na ‘ịkpakọrịta.’—Ndị Ikpe 14:20; Ilu 22:24.

^ par. 4 Jehova ji ihe a ọ gwara Ebreham ka o mee mee ihe atụ àjà ya onwe ya ga-eji Ọkpara ọ mụrụ naanị ya chụọ. (Jọn 3:16) Na nke Ebreham, Jehova mere ka ọ ghara iji Aịzik chụọ àjà. O nyere ya ebule o ji chụọ àjà kama iji Aịzik.—Jenesis 22:1, 2, 9-13.

^ par. 9 Devid ka bụ onye na-eto eto mgbe o gburu Golayat—‘ọ ka bụ nwata.’ Mgbe Jọnatan nwụrụ, Devid dị ihe dị ka iri afọ atọ. (1 Samuel 17:33; 31:2; 2 Samuel 5:4) Jọnatan nwụrụ mgbe ọ gbara ihe dị ka iri afọ isii. O ji ihe dị ka iri afọ atọ tọọ Devid.

^ par. 10 Dị ka e dere na 1 Samuel 23:17, Jọnatan kwuru ihe ise iji gbaa Devid ume: (1) Ọ gwara Devid ka ọ ghara ịtụ egwu. (2) O mere ka obi sie Devid ike na mgbalị Sọl ga-akụ afọ n’ala. (3) O chetaara Devid na ọ ga-abụ eze, dị ka Chineke kwere ná nkwa. (4) O kwesiri Devid nkwa ike na ya kwụ ya n’azụ. (5) Ọ gwara Devid na ọbụna Sọl ma na ya kwụ Devid n’azụ.

^ par. 19 Ị chọọ ịmụtakwu otú ị ga-esi na-emeso ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ ma ọ bụ ndị kewapụrụ onwe ha, gụọ isiokwu dị na peeji nke 207-209.