Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE ISII

Otú Anyị Ga-esi Na-ahọrọ Ntụrụndụ Dị Mma

Otú Anyị Ga-esi Na-ahọrọ Ntụrụndụ Dị Mma

“Na-emenụ ihe niile iji nye Chineke otuto.”—1 NDỊ KỌRỊNT 10:31.

1, 2. Olee ihe anyị kwesịrị ime n’ihe banyere ntụrụndụ?

KA E were ya na ị chọrọ ịta mkpụrụ osisi na-atọ ụtọ, ma gị ahụ na o nwere ebe rere ere. Gịnị ka ị ga-eme? Ị chọọ, i nwere ike ịtacha mkpụrụ osisi ahụ, ma ebe dị mma ma ebe ahụ mebiri emebi; i nwere ike ịtụfu mkpụrụ osisi ahụ dum, ma ebe dị mma ma ebe ahụ mebiri emebi; ma ọ bụkwanụ, gị ebepụ ebe ahụ mebiri emebi, tazie ebe dị mma. Olee nke ị ga-eme?

2 E nwere ike ikwu na ntụrụndụ yiri mkpụrụ osisi ahụ. Mgbe ụfọdụ, i nwere ike ịchọ ịtụrụtụ ndụ, ma gị achọpụta na ọtụtụ n’ime ntụrụndụ ndị e nwere ugbu a rụrụ arụ, reekwa ere. Ya mere, gịnị ka ị ga-eme? Ụfọdụ ndị nwere ike ịnabata ihe na-adịghị mma, ma na-atụrụ ụdị ndụ ọ bụla e nwere n’ụwa a. Ndị ọzọ nwere ike izere ntụrụndụ niile iji hụ na ha etinyeghị aka n’ihe ọjọọ ọ bụla. Ndị ọzọ nwere ike ilezi anya zere ntụrụndụ na-adịghị mma ma mgbe ụfọdụ soro nwee ntụrụndụ dị mma. Olee ntụrụndụ i kwesịrị ịhọrọ iji nọrọ n’ịhụnanya Chineke?

3. Gịnị ka anyị ga-atụle ugbu a?

3 Ọtụtụ n’ime anyị ga-ahọrọ nke atọ ahụ. Anyị ghọtara na ọ dị mma inwe ntụrụndụ, ma anyị chọrọ inwe naanị ntụrụndụ dị mma. Ya mere, anyị kwesịrị ịtụle otú anyị ga-esi amata ntụrụndụ dị mma na nke na-adịghị mma. Ma, ka anyị burugodị ụzọ tụlee otú ntụrụndụ anyị na-ahọrọ nwere ike isi metụta ofufe anyị na-efe Jehova.

“NA-EMENỤ IHE NIILE IJI NYE CHINEKE OTUTO”

4. Olee otú nrara anyị raara onwe anyị nye Chineke kwesịrị isi emetụta ntụrụndụ anyị na-ahọrọ?

4 O nwere mgbe otu Onyeàmà merela agadi, nke e mere baptizim n’afọ 1946, kwuru, sị: “Emere m ka ọ bụrụ iwu na m ga-anọ mgbe ọ bụla a na-ekwu okwu baptizim, geekwa ntị nke ọma, dị ka à ga-asị na ọ bụ m ka a na-aga ime baptizim.” N’ihi gịnị? O kwuru, sị, “Iburu nraranye m n’uche mgbe niile bụ ihe dị mkpa nke na-enyere m aka ikwesị ntụkwasị obi.” O doro anya na ị ga-ekweta ihe ahụ o kwuru. Icheta na i kwere Jehova nkwa na ị ga-eji ndụ gị niile jeere ya ozi ga-eme ka ị na-atachi obi. (Ekliziastis 5:4; Ndị Hibru 10:7) N’ezie, ịtụgharị uche ná nrara ị raara onwe gị nye Chineke ga-emetụta ọ bụghị naanị otú i si ele ozi Ndị Kraịst anya, kamakwa, otú i si ele ihe niile ọzọ a na-eme ná ndụ anya, ma ntụrụndụ. Mgbe Pọl onyeozi na-edegara Ndị Kraịst nọ n’oge ya akwụkwọ, o mere ka eziokwu ahụ doo anya, sị: “Ma ùnu na-eri ihe ma ùnu na-aṅụ ihe ọṅụṅụ ma ùnu na-eme ihe ọ bụla ọzọ, na-emenụ ihe niile iji nye Chineke otuto.”—1 Ndị Kọrịnt 10:31.

5. Olee otú Levitikọs 22:18-20 si enyere anyị aka ịghọta ịdọ aka ná ntị ahụ dị ná Ndị Rom 12:1?

5 Ihe niile ị na-eme ná ndụ na-emetụta ofufe ị na-efe Jehova. N’akwụkwọ ozi Pọl degaara Ndị Rom, o kwuru okwu gbara ọkpụrụkpụ iji mee ka ndị kwere ekwe ibe ya ghọta na nke a bụ eziokwu. Ọ gbara ha ume, sị: ‘Nyefeenụ Chineke ahụ́ unu dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke mma, ya bụ, ozi dị nsọ site n’ike iche echiche unu.’ (Ndị Rom 12:1) Ahụ́ gị bụ ma uche gị ma obi gị ma ike gị. Ị na-eji ihe a niile ejere Chineke ozi. (Mak 12:30) Pọl kwuru na ozi ahụ e ji mkpụrụ obi dum na-eje bụ àjà. O nwere ihe okwu ahụ bụ́ “àjà” na-adọ aka ná ntị ya. N’Iwu Mozis, Chineke anaghị anabata àjà na-adịghị mma. (Levitikọs 22:18-20) Otú ahụkwa, ọ bụrụ na ihe ọ bụla emetọọ àjà ime mmụọ Onye Kraịst na-achụ, Chineke agaghị anabata ya. Ma, olee otú nke ahụ nwere ike isi mee?

6, 7. Olee otú Onye Kraịst nwere ike isi metọọ ahụ́ ya, gịnịkwa ka o nwere ike ịkpatara ya?

6 Pọl dụrụ Ndị Kraịst nọ na Rom ọdụ, sị: “Unu enyefekwala akụkụ ahụ́ unu n’aka mmehie.” Pọl gwakwara ha ka ha ‘mee ka omume niile nke ahụ́ nwụọ.’ (Ndị Rom 6:12-14; 8:13) N’akwụkwọ ozi ahụ o dere, o bularị ụzọ kwuo ihe ụfọdụ ndị bụ́ ‘omume nke ahụ́.’ Baịbụl kwuru banyere ụmụ mmadụ na-emehie emehie, sị: ‘Ọnụ ha jupụtara n’ịbụ ọnụ.’ “Ụkwụ ha dị ngwa ịwụfu ọbara.” “Ha adịghị atụ egwu Chineke.” * (Ndị Rom 3:13-18) Onye Kraịst ga-emerụ ahụ́ ya ma ọ bụrụ na o jiri “akụkụ ahụ́” ya na-eme mmehie ndị dị otú ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na Onye Kraịst akpachara anya taa na-ele ihe rụrụ arụ, dị ka ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ ma ọ bụ ime ihe ike jọgburu onwe ya, ọ ‘na-enyefe anya ya n’aka mmehie,’ sikwa otú ahụ na-emerụ ahụ́ ya dum. Ofufe ọ bụla ọ na-efe Chineke ga-abụ àjà na-adịkwaghị nsọ, nke Chineke na-anaghị anabata. (Diuterọnọmi 15:21; 1 Pita 1:14-16; 2 Pita 3:11) Nke ahụ bụ inweta ụsụ ahịa dị ukwuu n’ihi itinye aka ná ntụrụndụ na-adịghị mma!

7 O doro anya na ntụrụndụ Onye Kraịst họọrọ nwere ike ịkpatara ya oké nsogbu. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịhọrọ ntụrụndụ nke ga-eme ka àjà anyị na-achụrụ Chineke ka mma, ọ bụghị nke ga-emetọ ya. Ka anyị tụlezie otú anyị ga-esi achọpụta ụdị ntụrụndụ dị mma na nke na-adịghị mma.

“KPỌỌNỤ IHE ỌJỌỌ ASỊ”

8, 9. (a) Olee ụzọ abụọ e nwere ike ikwu na ntụrụndụ dị? (b) Olee ụdị ntụrụndụ ndị anyị na-ezere, n’ihi gịnịkwa?

8 E nwere ike ikwu na ntụrụndụ dị ụzọ abụọ. Otu bụ ntụrụndụ nke Ndị Kraịst ga-ezere kpamkpam; nke ọzọ abụrụ ntụrụndụ nke Ndị Kraịst nwere ike họrọ ma ọ bụ jụ. Ka anyị burugodị ụzọ leba anya na nke mbụ ahụ, ya bụ, ntụrụndụ nke Ndị Kraịst ga-ezere.

9 Dị ka anyị kwuru n’Isi nke Mbụ, ihe a na-eme ná ntụrụndụ ụfọdụ bụ ihe Baịbụl kwuru hoo haa na ọ dịghị mma. Dị ka ihe atụ, chee echiche banyere Ịntanet, fim, TV, na egwú, bụ́ ndị na-egosi ebe a na-arụ ụrụ, ebe a na-eme ihe ndị mmụọ ọjọọ, ebe a na-egosi ndị gba ọtọ, ma ọ bụ egwú ndị na-akwado omume rụrụ arụ ndị jọgburu onwe ha. Ebe ọ bụ na ihe a na-eme ná ntụrụndụ ndị rụrụ arụ dị otú ahụ megidere ụkpụrụ Baịbụl ma ọ bụ iwu ya, ezi Ndị Kraịst kwesịrị izere ihe ndị ahụ n’agbanyeghị na a na-egosi ha dị ka ihe dị mma. (Ọrụ 15:28, 29; 1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10; Mkpughe 21:8) Ọ bụrụ na ị jụ ntụrụndụ dị otú ahụ na-adịghị mma, ị na-egosi Jehova na ị ‘kpọrọ ihe ọjọọ asị’ n’ezie, na ị ‘na-esikwa n’ihe ọjọọ wezụga onwe gị’ mgbe niile. Ọ ga-egosikwa na i nwere ‘okwukwe na-abụghị nke ihu abụọ.’—Ndị Rom 12:9; Abụ Ọma 34:14; 1 Timoti 1:5.

10. Olee echiche dị ize ndụ ụfọdụ ndị nwere banyere ntụrụndụ, n’ihi gịnịkwa?

10 Ma, ụfọdụ ndị nwere ike iche na ile ihe ntụrụndụ ndị na-egosi omume rụrụ arụ enweghị ihe o mere. Ha na-eche, sị, ‘Enwere m ike ile ya na fim ma ọ bụ na TV, ma, agaghị m eme ụdị ihe ahụ.’ Mmadụ iche otú ahụ bụ ịghọgbu onwe ya, ọ dịkwa ize ndụ. (Jeremaya 17:9) Ọ bụrụ na ọ na-atọ anyị ụtọ ile ihe Jehova sịrị na ọ dịghị mma, ànyị ‘kpọrọ ihe ọjọọ asị’ n’ezie? Ile ebe a na-eme omume ọjọọ kwa mgbe kwa mgbe ga-emebi echiche anyị. (Abụ Ọma 119:70; 1 Timoti 4:1, 2) Ime otú ahụ nwere ike imetụta ihe anyị na-eme ma ọ bụ otú anyị si ele omume ọjọọ nke ndị ọzọ anya.

11. Olee otú Ndị Galeshia 6:7 si bụrụ eziokwu n’ihe banyere ntụrụndụ?

11 Ihe ahụ emeela ụfọdụ ndị n’ezie. Ụfọdụ Ndị Kraịst emeela omume rụrụ arụ n’ihi na ha na-elekarị ihe ntụrụndụ na-adịghị mma. Ahụhụ ha tara kụziiri ha na ‘mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, ọ bụ ya ka ọ ga-aghọrọ.’ (Ndị Galeshia 6:7) Ma, e nwere ike izere mkpụrụ ọjọọ dị otú ahụ. Ọ bụrụ na i lezie anya kụọ mkpụrụ dị mma n’obi gị, ị ga-eji obi ụtọ ghọrọ mkpụrụ dị mma ná ndụ gị.—Gụọ igbe dị na peeji nke 67, bụ́ “ Olee Ụdị Ntụrụndụ M Kwesịrị Ịhọrọ?

 

IHE MMADỤ GA-EJI ỤKPỤRỤ BAỊBỤL KPEBIE

12. Olee otú Ndị Galeshia 6:5 si gbasa ntụrụndụ, olee ihe kwesịrị iduzi anyị n’ikpebi ihe anyị ga-eme?

12 Ka anyị leba anya ugbu a n’ụdị ntụrụndụ nke abụọ, ya bụ, ụdị ntụrụndụ Okwu Chineke na-ekwughị hoo haa na ọ dịghị mma, ma ọ sịghịkwanụ kpọmkwem na ọ dị mma. Mgbe Onye Kraịst ọ bụla na-ahọrọ ụdị ntụrụndụ ahụ, o kwesịrị iji aka ya kpebie ihe ọ maara dị mma. (Ndị Galeshia 6:5) Otú ọ dị, mgbe anyị chọrọ ikpebi ụdị ihe ahụ, anyị nwere ihe ga-eduzi anyị. Baịbụl nwere ụkpụrụ ma ọ bụ eziokwu dị mkpa ndị ga-eme ka anyị ghọta ihe bụ́ uche Jehova n’okwu ahụ. Ọ bụrụ na anyị echebara ụkpụrụ ndị ahụ echiche, anyị ga-aghọta “ihe uche Jehova bụ” n’ihe niile, ọbụna n’ihe banyere ntụrụndụ anyị na-ahọrọ.—Ndị Efesọs 5:17.

13. Gịnị ga-eme ka anyị zere ntụrụndụ na-adịghị Jehova mma?

13 O doro anya na nghọta Ndị Kraịst niile nwere banyere ntụrụndụ abụghị otu. (Ndị Filipaị 1:9) Ihe ọzọkwa bụ na Ndị Kraịst maara na ntụrụndụ masịrị otu onye nwere ike ọ gaghị amasị onye ọzọ. Ya mere, a gaghị atụ anya na Ndị Kraịst niile ga-ahọrọ otu ụdị ntụrụndụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụrụ na anyị ejiri ụkpụrụ Chineke na-eduzi uche anyị na obi anyị mgbe niile, ọ ga na-anụ anyị ọkụ n’obi mgbe niile izere ụdị ntụrụndụ ọ bụla na-adịghị Jehova mma.—Abụ Ọma 119:11, 129; 1 Pita 2:16.

14. (a) Olee ihe anyị kwesịrị ichebara echiche mgbe anyị na-ahọrọ ntụrụndụ? (b) Olee otú anyị ga-esi ebute Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ anyị?

14 Mgbe ị na-ahọrọ ntụrụndụ, o nwere ihe ọzọ dị mkpa ị ga-echebara echiche, ya bụ, oge gị. Ọ bụ ezie na ụdị ntụrụndụ ị na-ahọrọ na-egosi ihe dị gị mma, otú ị na-etinyeru oge na ya na-egosi ihe i weere na ọ bụ ihe kacha gị mkpa. N’ezie, ihe kacha Ndị Kraịst mkpa bụ ihe metụtara ofufe Chineke. (Matiu 6:33) Gịnịzi ka ị ga-eme iji jide n’aka na ị na-ebute ihe metụtara Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ gị? Pọl onyeozi sịrị: “Na-echesinụ nche ike ka otú unu si na-eje ije ghara ịdị ka ndị na-amaghị ihe kama dị ka ndị maara ihe, na-azụtara onwe unu oge kwesịrị ekwesị.” (Ndị Efesọs 5:15, 16) N’eziokwu, ikpebisi ike na ị gaghị etinyebiga oge ókè ná ntụrụndụ ga-eme ka i nwee oge ị ga-eji na-eme “ihe ndị ka mkpa,” ya bụ, ihe ndị ga-eme ka mmekọrịta gị na Chineke ka mma.—Ndị Filipaị 1:10.

15. Gịnị mere anyị ji kwesị ịgbara nsogbu ọsọ mgbe anyị na-ahọrọ ntụrụndụ?

15 Mgbe anyị na-ahọrọ ntụrụndụ, anyị kwesịkwara ịgbara nsogbu ọsọ. Gịnị ka nke ahụ pụtara? Chee echiche ọzọ banyere ihe atụ ahụ e ji mkpụrụ osisi mee. Ọ bụrụ na ị chọghị ịta ebe ahụ rere ere, ebe ị ga-ebepụ abụghị naanị ebe ahụ mebiri emebi, kamakwa, gburugburu ya. N’otu aka ahụ, anyị kwesịrị ịgbara nsogbu ọsọ mgbe anyị na-ahọrọ ntụrụndụ. Ihe Onye Kraịst maara ihe na-ezere abụghị naanị ntụrụndụ a ma nke ọma na o megidere ụkpụrụ Baịbụl, kamakwa, ọ na-ezere ụdị ntụrụndụ ndị a na-enyo enyo ma ọ bụ ndị yiri ka hà ga-emebi mmekọrịta ya na Chineke. (Ilu 4:25-27) Isochi ndụmọdụ dị n’Okwu Chineke anya ga-enyere gị aka ime otú ahụ.

“IHE Ọ BỤLA NKE DỊ ỌCHA”

Mgbe anyị na-ahọrọ ntụrụndụ, ime ihe Baịbụl kwuru ga-eme ka anyị ghara imebi mmekọrịta anyị na Chineke

16. (a) Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị na-ele omume ọma anya otú Jehova si ele ya anya? (b) Olee otú ime ihe Baịbụl kwuru ga-esi bụrụ ụzọ i si ebi ndụ?

16 Mgbe ezi Ndị Kraịst na-ahọrọ ntụrụndụ, ihe mbụ ha na-eme bụ ichebara ihe bụ́ uche Jehova echiche. Baịbụl na-agwa anyị echiche Jehova na ụkpụrụ ya. Dị ka ihe atụ, Eze Sọlọmọn depụtara ihe dị iche iche Jehova kpọrọ asị, ihe ndị dị ka “ire na-agha ụgha, na aka na-awụfu ọbara nke na-emeghị ihe ọjọọ, obi nke na-echepụta ihe ọjọọ, ụkwụ nke na-eme ngwa ịgbaga n’ihe ọjọọ.” (Ilu 6:16-19) Olee otú echiche Jehova kwesịrị isi emetụta echiche gị? Ọbụ abụ gbara ume, sị: “Unu ndị hụrụ Jehova n’anya, kpọọnụ ihe ọjọọ asị.” (Abụ Ọma 97:10) Ntụrụndụ ndị ị na-ahọrọ kwesịrị igosi na ị kpọrọ ihe Jehova kpọrọ asị asị n’ezie. (Ndị Galeshia 5:19-21) Burukwa n’uche na ihe na-egosi ụdị onye ị bụ n’ezie bụ ihe ị na-eme mgbe naanị gị nọ, ọ bụghị naanị ihe ị na-eme mgbe gị na ndị ọzọ nọ. (Abụ Ọma 11:4; 16:8) Ya mere, ọ bụrụ na i ji obi gị dum chọọ ka ihe niile ị na-eme ná ndụ na-egosi na ị na-ele omume ọma anya otú Jehova si ele ya anya, ị ga na-ahọrọ ntụrụndụ ndị kwekọrọ n’ụkpụrụ Baịbụl mgbe niile. Ime otú ahụ ga-abụ ụzọ i si ebi ndụ.—2 Ndị Kọrịnt 3:18.

17. Tupu anyị ahọrọ ntụrụndụ, olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

17 Olee ihe ọzọ ị ga-eme iji jide n’aka na ị ga na-eme ihe kwekọrọ n’otú Jehova si eche echiche mgbe ị na-ahọrọ ntụrụndụ? Jụọ onwe gị, sị, ‘Olee otú ihe a ga-esi emetụta m, oleekwa otú ọ ga-esi emetụta mmekọrịta mụ na Chineke?’ Dị ka ihe atụ, tupu gị ekpebie ma ị̀ ga-ele fim e wetaara gị, jụọ onwe gị, sị, ‘Olee otú ihe dị na fim a ga-esi emetụta akọnuche m?’ Ka anyị leba anya n’ụkpụrụ ndị ga-abara anyị uru n’okwu a.

18, 19. (a) Olee otú ụkpụrụ ahụ dị ná Ndị Filipaị 4:8 ga-esi enyere anyị aka ịmata ma ntụrụndụ anyị ọ̀ dị mma? (b) Olee ụkpụrụ ndị ọzọ ga-enyere gị aka ịhọrọ ntụrụndụ dị mma? (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji.)

18 Otu n’ime ụkpụrụ ndị dị mkpa bụ nke ahụ dị ná Ndị Filipaị 4:8, nke sịrị: “Ihe ọ bụla nke bụ́ eziokwu, ihe ọ bụla nke dị mkpa, ihe ọ bụla nke ziri ezi, ihe ọ bụla nke dị ọcha, ihe ọ bụla nke na-akpali ịhụnanya, ihe ọ bụla nke a na-ekwu okwu ọma banyere ya, omume ọma ọ bụla dịnụ na ihe ọ bụla dịnụ nke kwesịrị otuto, na-echebaranụ ihe ndị a echiche.” N’ezie, Pọl anaghị ekwu banyere ntụrụndụ, kama ọ na-ekwu banyere ihe anyị na-atụgharị n’uche, nke kwesịrị ịbụ ihe dị Chineke mma. (Abụ Ọma 19:14) Ma, e nwere ike iji ụkpụrụ dị n’okwu Pọl kọwaa ihe banyere ntụrụndụ. Olee otú a ga-esi akọwa ya?

19 Jụọ onwe gị, sị, ‘Fim, egwuregwu vidio, ma ọ bụ ụdị ntụrụndụ ndị ọzọ m na-ahọrọ hà na-eme ka m na-eche banyere “ihe ọ bụla nke dị ọcha”?’ Dị ka ihe atụ, mgbe i lechara fim, olee ihe ndị ị hụrụ na fim ahụ ndị ị na-eche banyere ha mgbe niile? Ọ bụrụ na ha dị mma, zie ezie, na-emekwa ka ahụ́ ruo gị ala, mara na ntụrụndụ ahụ kwesịrị ekwesị. Otú ọ dị, ọ bụrụ na fim ahụ i lere na-eme ka ị na-eche banyere ihe na-adịghị ọcha, mara na ntụrụndụ ahụ adịghị mma, ọ na-akpatakwa nsogbu. (Matiu 12:33; Mak 7:20-23) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na iche banyere omume rụrụ arụ ga-eme ka obi ghara iru gị ala, mebie akọnuche gị e ji Baịbụl zụọ, nweekwa ike imebi mmekọrịta gị na Chineke. (Ndị Efesọs 5:5; 1 Timoti 1:5, 19) Ebe ọ bụ na ntụrụndụ dị otú ahụ ga-akpatara gị nsogbu, kpebisie ike izere ya. * (Ndị Rom 12:2) Mee dị ka ọbụ abụ, bụ́ onye kpekuru Jehova ekpere, sị: “Mee ka anya m ghara ịhụ ihe na-abaghị uru.”—Abụ Ọma 119:37.

NA-ACHỌ ỌDỊMMA NKE NDỊ ỌZỌ

20, 21. Olee otú 1 Ndị Kọrịnt 10:23, 24 si gbasa ịhọrọ ntụrụndụ dị mma?

20 Pọl kwuru otu n’ime ụkpụrụ Baịbụl ndị anyị kwesịrị ichebara echiche mgbe anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme. Ọ sịrị: “Iwu kwadoro ihe niile; ma ọ bụghị ihe niile na-ewuli elu. Ka onye ọ bụla na-achọ, ọ bụghị uru nke ya, kama nke onye nke ọzọ.” (1 Ndị Kọrịnt 10:23, 24) Olee otú ụkpụrụ ahụ si gbasa ịhọrọ ntụrụndụ dị mma? I kwesịrị ịjụ onwe gị, sị, ‘Olee otú ntụrụndụ m na-ahọrọ ga-esi emetụta ndị ọzọ?’

21 Akọnuche gị nwere ike ikwe ka ị na-enwe ụdị ntụrụndụ i weere na ọ bụ ‘ihe iwu kwadoro,’ ma ọ bụ na ọ dị mma. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ị chọpụta na ọ dịghị Ndị Kraịst ndị ọzọ mma, bụ́ ndị akọnuche ha na-anaghị ekwe ka ha mee ihe ụfọdụ, i nwere ike ikpebi ịhapụ ya. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ị chọghị ‘imehie ụmụnna gị’—ma ọ bụkwanụ ‘imehie Kraịst,’ dị ka Pọl kwuru—site n’ime ka o siere Ndị Kraịst ibe gị ike karị ikwesị ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ. Buru ndụmọdụ ahụ n’uche, nke bụ́: ‘Unu abụla ihe ịsụ ngọngọ.’ (1 Ndị Kọrịnt 8:12; 10:32) Ndụmọdụ ahụ Pọl nyere na-egosi ichebara ndị ọzọ echiche, amamihe dịkwa na ya. Ezi Ndị Kraịst taa na-anabata ya site n’izere ntụrụndụ nke nwere ike ịbụ ‘ihe iwu kwadoro,’ ma bụrụ nke na-adịghị ‘ewuli elu.’—Ndị Rom 14:1; 15:1.

22. Gịnị mere Ndị Kraịst ji anabata echiche dị iche iche n’ihe mmadụ kwesịrị ikpebiri onwe ya?

22 Ma, e nwere ihe ọzọ e kwesịrị ilebara anya n’ihe banyere ịchọ ọdịmma nke ndị ọzọ. Onye Kraịst nke akọnuche ya na-anaghị ekwe ka o mee ihe Ndị Kraịst ibe ya na-eme ekwesịghị isi ọnwụ na ndị niile nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst ga na-eme ihe o chere bụ́ ntụrụndụ kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụ na o mee otú ahụ, ọ ga-adị ka ọkwọ ụgbọala nke siri ọnwụ na ndị ọkwọ ụgbọala ndị ọzọ niile ha na ya na-agba n’otu okporo ụzọ ga na-agba otú ọ chọrọ isi na-agba. Ikwu ụdị ihe ahụ adịghị mma. N’ihi inwe ịhụnanya Ndị Kraịst, onye akọnuche ya na-anaghị ekwe mee ihe ụfọdụ kwesịrị ịkwanyere Ndị Kraịst ibe ya ùgwù, bụ́ ndị otú ha si ele ntụrụndụ anya dị iche n’otú o si ele ya anya, ma ya abụrụ nke na-emebighị ụkpụrụ Ndị Kraịst. Ọ ga-esi otú ahụ ‘mee ka mmadụ niile mara na o nwere ezi uche.’—Ndị Filipaị 4:5; Ekliziastis 7:16.

23. Olee otú ị ga-esi achọpụta ma ntụrụndụ ị na-ahọrọ ọ̀ dị mma?

23 E gbuo ya nkenke, olee otú ị ga-esi achọpụta ma ntụrụndụ ị na-ahọrọ ọ̀ dị mma? Zere ụdị ntụrụndụ ọ bụla nke na-egosi omume rụrụ arụ n’ezoghị ihe ọ bụla ezo, ya bụ, ihe Okwu Chineke kwuru hoo haa na ọ dịghị mma. Soro ụkpụrụ Baịbụl ndị e nwere ike iji kọwaa ụdị ntụrụndụ ndị ahụ Baịbụl na-ekwughị ihe ọ bụla banyere ha. Zere ntụrụndụ nke ga-emebi akọnuche gị, kpebiekwa ịhapụ ụdị ntụrụndụ ndị nwere ike inye akọnuche ndị ọzọ nsogbu, karịsịa nke Ndị Kraịst ibe gị. Kpebisie ike ime otú ahụ ma wetara Chineke otuto. Ọ ga-emekwa ka gị na ezinụlọ gị nọrọ n’ịhụnanya ya.

^ par. 6 Otú e si dee ya n’asụsụ Grik bụ: “Ha anaghị atụ egwu Chineke n’anya ha.”

^ par. 19 Ị ga-ahụ ụfọdụ ụkpụrụ ndị ọzọ metụtara ntụrụndụ n’Ilu 3:31; 13:20; Ndị Efesọs 5:3, 4; na Ndị Kọlọsi 3:5, 8, 20.