Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE ASATỌ

Chineke Hụrụ Ndị Na-adị Ọcha n’Anya

Chineke Hụrụ Ndị Na-adị Ọcha n’Anya

“Ị ga-egosi onye na-edebe onwe ya ọcha na ị dị ọcha”—ABỤ ỌMA 18:26.

1-3. (a) Gịnị mere nne ji achọ ka nwa ya dịrị ọcha? (b) Gịnị mere Jehova ji chọọ ka ndị na-efe ya na-adị ọcha, gịnịkwa ga-eme ka anyị chọọ ịdị ọcha?

CHEE echiche banyere otu nne na-ejikere nwa ya nke chọrọ ịpụ apụ. Ọ sara ya ahụ́ ma hụ na uwe ya dị ọcha. Ọ ma na ezigbo ịdị ọcha dị mkpa maka ahụ́ ike nwa ya. Ọ ghọtakwara na otú nwa ya dị ga-eme ka e too ndị mụrụ ya ma ọ bụ kọchaa ha.

2 Jehova, bụ́ Nna anyị nke eluigwe, chọrọ ka ndị ohu ya dị ọcha. Okwu ya sịrị: “Ị ga-egosi onye na-edebe onwe ya ọcha na ị dị ọcha.” * (Abụ Ọma 18:26) Jehova hụrụ anyị n’anya; ọ makwa na ịdị ọcha ga-abara anyị uru. Ọ na-achọkwa ka anyị bụ́ Ndịàmà ya na-eme ihe ndị mmadụ ga-eji na-eto ya. N’ezie, ịdị ọcha anyị na omume ọma anyị ga-ewetara Jehova na aha nsọ ya otuto, ọ bụghị nkọcha.—Ezikiel 36:22; 1 Pita 2:12.

3 Ihe na-akpali anyị ịdị ọcha bụ na anyị ma na Chineke hụrụ ndị na-adị ọcha n’anya. Anyị chọrọ ka otú anyị si ebi ndụ na-ewetara ya otuto n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya. Anyị chọkwara ịnọrọ n’ịhụnanya ya. Ya mere, ka anyị tụlee ihe mere o ji dị mkpa ka anyị na-adị ọcha, ihe ịdị ọcha pụtara, na otú anyị ga-esi na-adị ọcha. Ịtụle ihe ndị ahụ ga-enyere anyị aka ịhụ ma ọ̀ dị ebe ndị anyị kwesịrị imezikwu ihe.

GỊNỊ MERE ANYỊ JI KWESỊ ỊNA-ADỊ ỌCHA?

4, 5. (a) Olee isi ihe mere anyị ji kwesị ịna-adị ọcha? (b) Olee otú e si ahụ ịdị ọcha Jehova n’ihe ndị o kere eke a na-ahụ anya?

4 Otu n’ime ụzọ Jehova si na-edu anyị bụ igosi anyị ihe nlereanya. N’ihi ya, Okwu ya na-agba anyị ume ka anyị ‘ghọọ ndị na-eṅomi Chineke.’ (Ndị Efesọs 5:1) Isi ihe mere anyị ji kwesị ịna-adị ọcha bụ na Jehova, bụ́ Chineke anyị na-efe, dị ọcha ma dị nsọ n’ụzọ niile.—Levitikọs 11:44, 45.

5 A na-ahụ ịdị ọcha Jehova n’ihe ndị o kere eke a na-ahụ anya, dịkwa ka a na-ahụ ọtụtụ àgwà ya na ụzọ ya n’ihe ndị o kere eke. (Ndị Rom 1:20) E kere ụwa ka ọ bụrụ ebe obibi dị ọcha maka mmadụ. Jehova kere ihe ndị na-eme ka ikuku na mmiri na-adị ọcha. Ụmụ nje ụfọdụ na-arụ ọrụ dị ka ngalaba na-azacha ihe, ha na-agbanwe ihe ha zapụtara n’ikuku na mmiri ka ọ ghara imerụ ihe ndị dị ndụ ahụ́. Ndị ọkà mmụta sayensị ejirila ụmụ nje ndị ahụ a na-adịghị ahụ anya mee ka ebe mmanụ gbawara n’osimiri dịrị ọcha, tinyere ihe ndị ọzọ ndị mmadụ metọrọ n’ihi anyaukwu na ịchọ ọdịmma onwe ha. O doro anya na ịdị ọcha dị ‘Onye kere ụwa’ mkpa. (Jeremaya 10:12) O kwesịkwara ịdị anyị mkpa.

6, 7. Olee otú Iwu Mozis si kwusie ike na Jehova chọrọ ka ndị na-efe ya na-adị ọcha?

6 Ihe ọzọ mere anyị ji kwesị ịna-adị ọcha bụ na Jehova, bụ́ Eze anyị kacha elu, chọrọ ka ndị na-efe ya na-adị ọcha. N’Iwu ahụ Jehova nyere ndị Izrel, e jikọtara ịdị ọcha na ofufe. Iwu ahụ kwuru na n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie, nnukwu onye nchụàjà ga-asa ahụ́ ugboro abụọ, ọ bụghị naanị otu ugboro. (Levitikọs 16:4, 23, 24) Iwu ahụ kwuru ka ndị nchụàjà na-eje ozi saa ụkwụ ha na aka ha tupu ha achụọrọ Jehova àjà. (Ọpụpụ 30:17-21; 2 Ihe E Mere 4:6) Iwu ahụ kwukwara ụzọ ihe iri asaa ga-eme ka mmadụ bụrụ onye na-adịghị ọcha n’anụ ahụ́ nakwa onye rụrụ arụ ife ofufe. Mgbe onye Izrel bụ onye na-adịghị ọcha, o nweghị ike iso fee ofufe, mgbe ụfọdụ, a ga-egbu ya ma o soro fee ofufe. (Levitikọs 15:31) Onye ọ bụla nke jụrụ ime ihe iwu kwuru ka o mee iji dị ọcha, nke gụnyere ịsa ahụ́ ya na uwe ya, ‘a ga-ebipụ ya n’etiti ọgbakọ Izrel.’—Ọnụ Ọgụgụ 19:17-20.

7 Ọ bụ ezie na anyị anọghị n’okpuru Iwu Mozis, ọ na-enyere anyị aka ịghọta otú Chineke si ele ihe anya. O doro anya na Iwu ahụ kwusiri ike na Chineke chọrọ ka ndị na-efe ya na-adị ọcha. Jehova agbanwebeghị. (Malakaị 3:6) Ọ gaghị anabata ofufe anyị ọ gwụla ma ọ̀ ‘dị ọcha ma bụrụ nke a na-emerụghị emerụ.’ (Jems 1:27) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịmata ihe ọ chọrọ ka anyị mee n’ihe banyere ịdị ọcha.

IHE ỊDỊ ỌCHA N’ANYA CHINEKE PỤTARA

8. Olee ụzọ dị iche iche Jehova chọrọ ka anyị na-adị ọcha?

8 N’ime Baịbụl, ihe ịdị ọcha pụtara abụghị naanị ịdị ọcha n’anụ ahụ́. Ịdị ọcha n’anya Chineke metụtara ihe niile anyị na-eme ná ndụ. Jehova chọrọ ka anyị na-adị ọcha n’ụzọ anọ bụ́ isi, ya bụ, n’ofufe anyị, n’omume anyị, n’echiche anyị, nakwa n’anụ ahụ́ anyị. Ka anyị tụlee ihe nke ọ bụla n’ime ha pụtara.

9, 10. Gịnị ka ife ofufe dị ọcha pụtara, gịnịkwa ka ezi Ndị Kraịst na-ezere?

9 Ofufe dị ọcha. E kwuo ya n’ụzọ dị mfe, ife ofufe dị ọcha pụtara na anyị agaghị agwakọta ezi ofufe na ofufe ụgha. Mgbe ndị Izrel hapụrụ Babịlọn lawa Jeruselem, a gwara ha ka ha gee ntị na ndụmọdụ nke si n’ike mmụọ nsọ bụ́: “Sinụ n’ebe ahụ pụọ, unu emetụla ihe na-adịghị ọcha aka; . . . debenụ onwe unu ọcha.” (Aịzaya 52:11) Isi ihe mere ndị Izrel ji na-alaghachi n’obodo ha bụ ịmaliteghachi ofufe Jehova. Ofufe ha kwesịrị ịdị ọcha, nke pụtara na a gaghị eji ozizi ọ bụla nke ndị Babịlọn merụọ ya, tinyere omume ha na omenala okpukpe ha.

10 Taa, anyị bụ́ Ndị Kraịst ga-akpachara anya ka a ghara iji ofufe ụgha merụọ anyị. (1 Ndị Kọrịnt 10:21) Anyị kwesịrị ịkpachara anya na nke a, n’ihi na okpukpe ụgha gbara anyị gburugburu. N’ọtụtụ obodo, omenala ndị mmadụ, ihe ha na-eme nakwa ememme ha dị iche iche sitere n’ozizi okpukpe ụgha, dị ka echiche ahụ bụ́ na ọ dị ihe dị n’ime mmadụ nke na-adịghị anwụ anwụ ma mmadụ nwụọ. (Ekliziastis 9:5, 6, 10) Ezi Ndị Kraịst na-ezere omenala ndị metụtara ihe okpukpe ụgha kweere. * Anyị agaghị ekwe ka ndị ọzọ mee ka anyị mebie ụkpụrụ Baịbụl nyere maka ofufe dị ọcha.—Ọrụ 5:29.

11. Gịnị ka ime omume dị ọcha pụtara, gịnịkwa mere o ji dị mkpa na omume anyị ga-adị ọcha?

11 Omume dị ọcha. Ime omume dị ọcha pụtara izere ụdị mmekọahụ ọ bụla rụrụ arụ. (Ndị Efesọs 5:5) Ọ dị mkpa ka omume anyị na-adị ọcha. Dị ka anyị ga-ahụ n’Isi nke Itoolu n’akwụkwọ a, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọrọ n’ịhụnanya Chineke, anyị aghaghị ‘ịgbara ịkwa iko ọsọ.’ Ndị na-akwa iko na-achọghị ichegharị “agaghị eketa alaeze Chineke.” (1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10, 18) N’anya Chineke, ndị dị otú ahụ so ná ‘ndị rụrụ arụ n’ihi omume ruru unyi’ ha na-eme. Ọ bụrụ na ha agbanweghị omume ọjọọ ha, “òkè ha ga-abụ . . . ọnwụ nke abụọ.”—Mkpughe 21:8.

12, 13. Olee ihe jikọrọ ihe mmadụ bu n’obi na omume ya, oleekwa otú anyị ga-esi mee ka echiche anyị na-adị ọcha?

12 Echiche dị ọcha. Ihe mmadụ bu n’obi ka ọ na-eme. Ọ bụrụ na anyị ana-eche ihe ọjọọ n’uche anyị nakwa n’obi anyị, anyị nwere ike itinye aka n’omume na-adịghị ọcha ugbu a ma ọ bụ mgbe e mechara. (Matiu 5:28; 15:18-20) Ma, ọ bụrụ na anyị ana-eche ihe ziri ezi n’uche anyị, ọ ga-eme ka anyị na-eme omume dị ọcha. (Ndị Filipaị 4:8) Olee otú anyị ga-esi mee ka echiche anyị na-adị ọcha? Otu n’ime ihe anyị kwesịrị izere bụ ụdị ntụrụndụ ọ bụla nke nwere ike imebi echiche anyị. * Ihe ọzọ bụ na anyị ga na-eche ihe ziri ezi n’uche anyị site n’ịmụ Okwu Chineke mgbe niile.—Abụ Ọma 19:8, 9.

13 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọrọ n’ịhụnanya Chineke, ọ dị mkpa ka ofufe anyị, omume anyị, nakwa echiche anyị na-adị ọcha. A kọwara ụdị ịdị ọcha ndị a nke ọma n’isiokwu ndị ọzọ dị n’akwụkwọ a. Ugbu a, ka anyị tụlee ụzọ nke anọ anyị kwesịrị ịdị ọcha, ya bụ, ịdị ọcha n’anụ ahụ́.

OLEE OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-ADỊ ỌCHA N’ANỤ AHỤ́?

14. Gịnị mere o ji bụrụ na ịdị ọcha n’anụ ahụ́ abụghị ihe gbasara naanị anyị?

14 Ịdị ọcha n’anụ ahụ́ pụtara idebe ahụ́ anyị na ebe anyị bi ọcha. Ịdị ọcha dị otú ahụ ọ̀ bụ ihe gbasara naanị anyị, n’enweghị onye ọzọ ọ gbasara? Ọ bụghị otú ahụ ka ndị na-efe Jehova kwesịrị isi lee ya anya. Dị ka anyị kwuru na mbụ, ihe mere ịdị ọcha n’anụ ahụ́ anyị ji gbasa Jehova abụghị naanị na ọ ga-abara anyị uru, kamakwa o nwere ike ime ka ndị mmadụ too ya ma ọ bụ kọchaa ya. Chee echiche banyere ihe atụ ahụ anyị nyere ná mmalite. Ọ bụrụ na ị hụ nwata na-erukarị unyi ma ọ bụ na-adị nkịkara, ọ̀ bụ na ọ gaghị eme ka i chewe banyere ụdị nne na nna o nwere? Anyị achọghị ka ihe ọ bụla metụtara ejiji anyị ma ọ bụ otú anyị si ebi ndụ wetara Nna anyị nke eluigwe nkọcha, ma ọ bụ mee ka ndị mmadụ ghara ige ntị n’ozi ọma anyị na-ekwusa. Okwu Chineke sịrị: “Anyị adịghị eme ihe ịsụ ngọngọ n’ụzọ ọ bụla, ka e wee ghara ịhụta mmejọ n’ozi anyị; kama, n’ụzọ niile, anyị na-eme ka a mata anyị dị ka ndị ozi Chineke.” (2 Ndị Kọrịnt 6:3, 4) Ya mere, olee otú anyị ga-esi na-adị ọcha n’anụ ahụ́?

15, 16. Gịnị ka ezigbo ịdị ọcha pụtara, oleekwa otú uwe anyị kwesịrị ịdị?

15 Idebe onwe anyị na ejiji anyị ọcha. Ọ bụ ezie na omenala mba dị iche iche abụghị otu, ebe ndị mmadụ bi abụghịkwa otu, ọtụtụ mgbe, ọ ga-ekwe anyị omume inweta ncha na mmiri ga-ezuru anyị ịsa ahụ́ mgbe niile, iji mee ka anyị na ụmụ anyị na-adị ọcha. Ezigbo ịdị ọcha pụtara na anyị ga na-eji ncha na mmiri akwọ aka tupu anyị erie nri ma ọ bụ metụ ihe oriri aka, nakwa mgbe anyị jechara mposi, mgbe anyị sachara nwatakịrị ahụ́ ma ọ bụ mgbe anyị gbanwechara ákwà a wara ya. Iji ncha na mmiri kwọọ aka nwere ike igbochi ọrịa, zọọkwa mmadụ ndụ. O nwekwara ike ime ka anyị ghara ibunye ndị ọzọ ụmụ nje ndị na-akpata ọrịa, si otú ahụ mee ka ha zere ọrịa ndị na-akpata afọ ọsịsa. Ná mba ebe ndị mmadụ na-enweghị ezigbo ebe a na-anyụ nsị, e nwere ike ili nsị n’ala, otú ahụ ndị Izrel oge ochie mere.—Diuterọnọmi 23:12, 13.

16 Anyị kwesịkwara ịsa uwe anyị mgbe niile iji mee ka ọ dị ọcha, dịkwa mma n’anya. Ọ pụtaghị na uwe Onye Kraịst ga-adịrịrị oké ọnụ ma ọ bụ bụrụ nke na-ewu ewu, kama, o kwesịrị ịdị ọcha, dịkwa mma n’anya. (1 Timoti 2:9, 10) N’agbanyeghị ebe anyị nọ, anyị chọrọ ka ejiji anyị ‘na-achọ ozizi Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Chineke, mma.’—Taịtọs 2:10.

17. Gịnị mere ebe anyị bi na ihe anyị nwere ji kwesị ịna-adị ọcha ma na-adị mma n’anya?

17 Ebe anyị bi na ihe anyị nwere. O nwere ike ịbụ na ebe anyị bi amaghị oké mma, ma o kwesịrị ịdị ọcha, dịkwa mma n’anya otú ike kwere anyị. Otú ahụkwa, ọ bụrụ na anyị na-eji ụgbọala anyị aga ọmụmụ ihe nakwa ozi ọma, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka ime ya na ahụ́ ya na-adị ọcha. Ka anyị ghara ichefu na ọ bụrụ na ebe anyị bi na ihe anyị nwere adịrị ọcha, ọ ga na-agbara ndị ọzọ àmà. A sị ka e kwuwe, anyị na-akụziri ndị mmadụ na Jehova bụ Chineke nke dị ọcha, na ọ ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa,’ nakwa na Alaeze ya ga-eme ka ụwa anyị a ghọọ paradaịs n’oge na-adịghị anya. (Mkpughe 11:18; Luk 23:43) N’ezie, anyị chọrọ ka otú ebe anyị bi na ihe anyị nwere dị mee ka ndị ọzọ mata na ọbụna ugbu a, anyị na-amụta ịdị ọcha a ga-eji na-ebi n’ụwa ọhụrụ ahụ na-abịanụ.

Ịdị ọcha n’anụ ahụ́ pụtara idebe ahụ́ anyị na ebe obibi anyị ọcha

18. Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị na-akwanyere Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị ùgwù?

18 Ebe anyị na-anọ efe Chineke. Ịhụnanya anyị hụrụ Jehova na-eme ka anyị na-akwanyere Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị ùgwù, nke bụ́ ebe anyị na-anọ efe ezi ofufe n’obodo anyị bi. Ọ bụrụ na ndị ọhụrụ abịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, anyị chọrọ ka ha na-ele ebe anyị na-anọ amụ ihe anya ọma. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ka Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị na-ama mma, anyị ga na-azacha ya ma na-arụzi ya. Ọ bụrụ na anyị na-akwanyere Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị ùgwù, anyị ga na-agbalịsi ike idebe ya ọcha. Ọ bụ ihe ùgwù ma ọ bụrụ na anyị ewepụta oge anyị soro na-azacha ebe anyị na-anọ efe Chineke, tinyere ‘ịrụzi ya na idozi ya.’ (2 Ihe E Mere 34:10) Otú ahụ ka ọ dịkwa mgbe anyị zukọtara n’Ụlọ Mgbakọ ma ọ bụ n’ebe ọzọ maka inwe mgbakọ ukwu ma ọ bụ mgbakọ nta.

ZERE ÀGWÀ NA OMUME NDỊ NA-EMERỤ MMADỤ

19. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị ọcha n’anụ ahụ́, gịnị ka anyị kwesịrị izere, oleekwa otú Baịbụl ga-esi enyere anyị aka izere ya?

19 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị ọcha n’anụ ahụ́, anyị kwesịrị izere àgwà na omume ndị na-emerụ mmadụ, ndị dị ka ịṅụ sịga, ịṅụbiga mmanya okè, ịṅụ ọgwụ ike ma ọ bụ ihe na-akpaghasị uche. Baịbụl akpọghị aha àgwà na omume niile na-adịghị ọcha na ndị rụrụ arụ e nwere n’ebe niile taa, ma o kwuru ụkpụrụ ndị ga-enyere anyị aka ịmata otú Jehova si ele ihe ndị dị otú ahụ anya. Ebe ọ bụ na anyị ma otú Jehova si ele ihe anya, ịhụnanya anyị hụrụ ya ga-akpali anyị ime ihe dị ya mma. Ka anyị leba anya n’ụkpụrụ ise ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ.

20, 21. Olee ụdị omume Jehova chọrọ ka anyị zere, oleekwa ezigbo ihe mere anyị ga-eji gee ya ntị?

20 “Ebe anyị nwere nkwa ndị a, ndị m hụrụ n’anya, ka anyị sachapụ onwe anyị mmerụ niile nke anụ ahụ́ na nke mmụọ, wee mee ka ịdị nsọ anyị zuo okè n’egwu Chineke.” (2 Ndị Kọrịnt 7:1) Jehova chọrọ ka anyị zere omume ndị ga-emerụ anụ ahụ́ anyị, omume ndị ga-emebi mmụọ anyị, ma ọ bụ otú anyị si eche echiche. Ya mere, anyị aghaghị izere omume ndị na-eri mmadụ ahụ́ bụ́ ndị a ma na ha na-emebi anụ ahụ́ na uche mmadụ.

21 Baịbụl kwuru ezigbo ihe mere anyị ga-eji “sachapụ onwe anyị mmerụ niile.” Cheta na ihe 2 Ndị Kọrịnt 7:1 bụ ụzọ kwuo bụ: “Ebe anyị nwere nkwa ndị a.” Olee nkwa ndị ọ bụ? Dị ka e kwuru n’amaokwu ndị bu ụzọ, Jehova kwere nkwa, sị: “M ga-akpọbatakwa unu. M ga-abụkwara unu nna.” (2 Ndị Kọrịnt 6:17, 18) Cheedị echiche: Jehova kwere nkwa na ya ga-echebe gị ma hụ gị n’anya dị ka nna si ahụ nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị n’anya. Ma Jehova ga-emezu nkwa ndị ahụ ma ọ bụrụhaala na i zere mmerụ nke “anụ ahụ́ na nke mmụọ.” N’ihi ya, ọ ga-abụ ihe nzuzu ma i kwe ka àgwà ma ọ bụ omume ọ bụla rụrụ arụ mee ka gị na Jehova ghara inwe ezigbo mmekọrịta chiri anya otú ahụ!

22-25. Olee ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị ga-enyere anyị aka izere àgwà na omume ndị na-adịghị ọcha?

22 “Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Matiu 22:37) Jizọs kwuru na ọ bụ iwu a kacha iwu niile. (Matiu 22:38) Jehova kwesịrị ka anyị hụ ya n’anya otú ahụ. Ọ bụrụ na anyị chọrọ iji obi anyị dum na mkpụrụ obi anyị dum na uche anyị dum hụ ya n’anya, anyị aghaghị izere omume ndị nwere ike ime ka anyị nwụchuo ọnwụ ma ọ bụ mee ka ikike iche echiche Chineke nyere anyị ghara ịrụ ọrụ nke ọma.

23 ‘Jehova na-enye mmadụ niile ndụ na ume na ihe niile.’ (Ọrụ 17:24, 25) Ndụ bụ onyinye Chineke nyere anyị. Anyị hụrụ Onye nyere anyị ya n’anya. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịkwanyere onyinye ahụ ùgwù. Anyị na-ezere àgwà ma ọ bụ omume ọ bụla nke nwere ike imebi ahụ́ ike anyị, n’ihi na anyị ghọtara na ime omume ndị dị otú ahụ ga-egosi na anyị anaghị akwanyere ndụ e nyere anyị ùgwù ma otu ma otu.—Abụ Ọma 36:9.

24 “Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Matiu 22:39) Àgwà na omume ndị na-adịghị ọcha na-emetụtakarị ma onye na-eme ya ma ndị nọ ya nso. Dị ka ihe atụ, ikuru anwụrụ ọkụ sịga nwere ike imerụ ndị na-anaghị aṅụ sịga ahụ́. Onye na-emerụ ndị nọ ya nso ahụ́ na-emebi iwu Chineke nyere, nke bụ́ na anyị kwesịrị ịhụ ndị agbata obi anyị n’anya. Onye ahụ na-egosi na ọ hụghị Chineke n’anya, ọ bụ ezie na ọ na-ekwu na ya hụrụ ya n’anya.—1 Jọn 4:20, 21.

25 ‘Na-edo onwe gị n’okpuru ọchịchị na ikike dị iche iche, na-erubekwara ha isi dị ka ndị na-achị achị.’ (Taịtọs 3:1) N’ọtụtụ obodo, inwe ọgwụ ụfọdụ ma ọ bụ ịṅụ ha aṅụ bụ imebi iwu. Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị ekwesịghị inwe ọgwụ ndị a machibidoro iwu ma ọ bụ ṅụọ ha.—Ndị Rom 13:1.

26. (a) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọrọ n’ịhụnanya Chineke, gịnị ka anyị kwesịrị ime? (b) Gịnị mere ịdị ọcha n’anya Chineke ji bụrụ ụzọ kacha mma anyị ga-esi bie ndụ?

26 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọrọ n’ịhụnanya Chineke, anyị kwesịrị ịdị ọcha, ọ bụghị naanị n’ihe ole na ole, kamakwa n’ihe niile. O nwere ike ọ gaghị adịcha mfe ịhapụ àgwà na omume ndị na-emerụ mmadụ na izere ha, ma a na-eme ya eme. * N’ezie, e nweghị ụzọ ọzọ ka mma anyị nwere ike isi bie ndụ, n’ihi na Jehova na-akụziri anyị otú anyị ga-esi abara onwe anyị uru mgbe niile. (Aịzaya 48:17) Nke ka nke, ọ bụrụ na anyị ana-adị ọcha mgbe niile, anyị ga-enweta obi ụtọ n’ihi na anyị ma na anyị na-ewetara Chineke anyị otuto, bụ́ onye anyị hụrụ n’anya, sikwa otú ahụ nọrọ n’ịhụnanya ya.

^ par. 2 Okwu Hibru e si sụgharịta “ịdị ọcha” apụtaghị naanị ịdị ọcha n’elu ahụ́ kamakwa ịdị ọcha n’omume ma ọ bụ n’ofufe anyị.

^ par. 10 Gụọ Isi nke Iri na Atọ n’akwụkwọ a ka ị hụ ebe a tụlere ememme na omenala ezi Ndị Kraịst na-ezere.

^ par. 26 Gụọ igbe dị na peeji nke 94, bụ́ “ M̀ Na-agbalịsi Ike Ime Ihe Ziri Ezi?” nakwa nke dị n’elu bụ́ “ N’ebe Chineke Nọ, Ihe Niile Kwere Omume.

^ par. 67 A gbanwere aha onye ahụ.