Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE ITOOLU

‘Gbaara Ịkwa Iko Ọsọ’

‘Gbaara Ịkwa Iko Ọsọ’

“Ya mere, meenụ ka akụkụ ahụ́ unu ndị dị n’elu ụwa nwụọ n’ihe banyere ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ, ọchịchọ ọjọọ, na anyaukwu, nke bụ́ ikpere arụsị.”—NDỊ KỌLỌSI 3:5.

1, 2. Olee otú Belam si mee atụmatụ iwetara ndị Jehova nsogbu?

ONYE na-egbu azụ̀ gara ebe ọ na-egbutekarị azụ̀. O nwere ụdị azụ̀ o bu n’obi igbute. O tinyere ihe ga-arata azụ̀ na nko azụ̀ ma tụba ya n’ime mmiri. N’oge na-adịghị anya, eriri nko azụ̀ ahụ bịara sie ya ike n’aka. Osisi e kegidere eriri ahụ arọọkwa. Ya adọọ eriri ahụ ka ọ dọpụta azụ̀ o gbutere. Ọ mụmụrụ ọnụ ọchị, n’ihi na ọ ma na ya tinyere ezigbo ihe e ji arata azụ̀.

2 N’afọ 1473 T.O.A., otu nwoke aha ya bụ Belam chesiri echiche ike banyere ihe ọ ga-eji arata ndị mmadụ. Ma, ndị ọ chọrọ ịrata bụ ndị Chineke, ndị mara ụlọikwuu ha na Mbara Ọzara Moab, nke dị nso n’Ala Nkwa ahụ. Belam sịrị na ya bụ onye amụma Jehova, ma, n’ezie, ọ bụ onye anyaukwu e goro ka ọ bụọ ndị Izrel ọnụ. Otú ọ dị, Jehova mere ka ihe Belam meliri bụrụ naanị ịgọzi ndị Izrel. Ebe ọ bụ na Belam kpebisiri ike ịnata ụgwọ ọrụ ya, o chere na ya nwere ike ime ka Chineke bụọ ndị ya ọnụ, ma ọ bụrụ na a nwata ha ime mmehie jọgburu onwe ya. Ebe Belam bu ihe dị otú ahụ n’obi, o ji ụmụ agbọghọ Moab anya na-acha ọkụ mere ihe ọ ga-eji arata ha.—Ọnụ Ọgụgụ 22:1-7; 31:15, 16; Mkpughe 2:14.

3. Olee otú Belam nweruru ihe ịga nke ọma n’atụmatụ ya?

3 Atụmatụ ahụ ọ̀ dabara adaba? Ee, ọ dabatụrụ. Ọ ratara ọtụtụ iri puku ndị ikom Izrel, ‘ha na ndị inyom Moab enwee mmekọahụ rụrụ arụ.’ Ha malitere ife chi ndị Moab, nke gụnyere Bel nke Piọ na-asọ oyi, bụ́ chi ọmụmụ, ma ọ bụ chi mmekọahụ. N’ihi ya, iri puku ndị Izrel abụọ na puku anọ nwụrụ mgbe ọ fọrọ nnọọ ntakịrị ka ha banye n’Ala Nkwa ahụ. Nke ahụ bụ ọdachi dị egwu!—Ọnụ Ọgụgụ 25:1-9.

4. Gịnị mere e ji rata ọtụtụ puku ndị Izrel ime omume rụrụ arụ?

4 Gịnị kpatara ọdachi ahụ? Ọtụtụ ndị Izrel malitere inwe ajọ obi site n’ịhapụ Jehova, bụ́ Chineke ahụ nke napụtara ha n’Ijipt, nye ha nri n’ala ịkpa, ma durute ha n’ọnụ ọnụ ala nkwa ahụ n’enweghị ọkọ kọrọ ha. (Ndị Hibru 3:12) Pọl onyeozi chetara ihe ahụ merenụ, ma dee, sị: “Ka anyị ghara ịna-akwa iko, dị ka ụfọdụ n’ime ha kwara iko, puku iri abụọ na atọ n’ime ha wee nwụọ n’otu ụbọchị.” *1 Ndị Kọrịnt 10:8.

5, 6. Gịnị mere ihe Baịbụl kọrọ banyere mmehie ndị Izrel na Mbara Ọzara Moab ji baara anyị uru taa?

5 Ndị Chineke taa, bụ́ ndị ọ fọrọ ntakịrị ka ha banye n’ala nkwa ka ukwuu, nwere ọtụtụ ihe dị mkpa ha ga-amụta n’akụkọ ahụ dị n’Ọnụ Ọgụgụ. (1 Ndị Kọrịnt 10:11) Dị ka ihe atụ, ara mmekọahụ nke na-agba ụwa taa yiri nke ahụ gbara ndị Moab oge ochie, ọ bụ naanị na o zuziri ebe niile. Ihe ọzọ bụ na, kwa afọ a na-eji omume rụrụ arụ arata ọtụtụ puku Ndị Kraịst, bụ́ otu ihe ahụ e ji rata ndị Izrel. (2 Ndị Kọrịnt 2:11) Ụfọdụ ndị nọ n’etiti ndị Chineke taa na-eduhie ndị ọzọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst site n’iṅomi Zimraị bụ́ onye kara obi kpọrọ nwaanyị Midian bata n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu, banye n’ụlọikwuu nke ya.—Ọnụ Ọgụgụ 25:6, 14; Jud 4.

6 Ị̀ ghọtara na ị nọ na mbara ọzara Moab nke oge a? Ị̀ na-ahụ ụgwọ ọrụ gị n’ihu gị, nke bụ́ ụwa ọhụrụ ahụ ị tụwara anya ya kemgbe? Ọ bụrụ otú ahụ, mee ihe niile i nwere ike ime ka ị nọrọ n’ịhụnanya Chineke site n’irube isi n’iwu bụ́: ‘Gbaara ịkwa iko ọsọ.’—1 Ndị Kọrịnt 6:18.

Otú Mbara Ọzara Moab dị

GỊNỊ BỤ ỊKWA IKO?

7, 8. Gịnị bụ “ịkwa iko,” olee otú ndị na-akwa iko si aghọrọ mkpụrụ ha kụrụ?

7 Na Baịbụl, “ịkwa iko” (Grik, por·neiʹa) pụtara mmekọahụ na-ezighị ezi a na-enwe n’etiti ndị na-abụghị di na nwunye otú Akwụkwọ Nsọ si kwuo. Ọ gụnyere ịkwa iko nke ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye, ịgba akwụna, mmekọahụ nke ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye, nakwa isi n’ọnụ ma ọ bụ n’otule enwe mmekọahụ, mmadụ ịdịda onye na-abụghị di ya ma ọ bụ nwunye ya aka n’ihe o ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị. Ọ pụtakwara nwoke na nwoke nakwa nwaanyị na nwaanyị ime omume ndị dị otú ahụ, tinyere idina anụmanụ. *

8 Ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru doro nnọọ anya, ya bụ, ndị na-akwa iko enweghị ike ịnọgide n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ha agaghịkwa enweta ndụ ebighị ebi. (1 Ndị Kọrịnt 6:9; Mkpughe 22:15) Ihe ọzọ bụ na ọbụna ugbu a, ha na-akpatara onwe ha nsogbu, dị ka ịbụ ndị a na-atụkwasịghị obi, mmadụ ire ùgwù ya, esemokwu di na nwunye, obi amamikpe, ime ọkwà, ọrịa, na ọbụna ọnwụ. (Ndị Galeshia 6:7, 8) Gịnị mere mmadụ ga-eji etinye isi n’ụzọ nsogbu juru na ya? Ọ dị mwute na mgbe ọtụtụ ndị na-etinye aka n’ihe mbụ na-eduba n’ihe ọjọọ, ha anaghị eche echiche ihe ga-esi na ya pụta. Ihe dị otú ahụ na-abụkarị ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ.

IHE NA-AKPALI AGỤỤ MMEKỌAHỤ BỤ IHE MBỤ NA-EDUBA N’ỊKWA IKO

9. Ọ̀ bụ eziokwu na ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ enweghị ihe o mere, dị ka ụfọdụ kwuru? Kọwaa.

9 N’ọtụtụ obodo, ihe na-akpali agụụ mmekọahụ na-adị n’ebe a na-ere akwụkwọ akụkọ, n’egwú, nakwa na televishọn. O jupụtakwara n’Ịntanet. * Ọ̀ bụ eziokwu na o nweghị ihe o mere, dị ka ụfọdụ kwuru? Mbanụ! Ndị na-ekiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ nwere ike ịghọ ndị igbo onwe onye agụụ mmekọahụ riri ahụ́, ha na-echekwa banyere “agụụ mmekọahụ na-eme ihere,” nke nwere ike ime ka mmekọahụ rie mmadụ ahụ́, meekwa ka ọ na-enwe ọchịchọ rụrụ arụ, kpatakwa oké esemokwu n’etiti di na nwunye, ọbụna ịgba alụkwaghịm. * (Ndị Rom 1:24-27; Ndị Efesọs 4:19) Otu onye nke na-eme nchọpụta ji ịbụ onye mmekọahụ riri ahụ́ tụnyere ọrịa kansa. Ọ sịrị: “Ọ na-aka njọ ma na-agbasa agbasa. Ọ naghị ala ngwa ngwa. Ọ na-esikwa ike ngwọta.”

Ọ dị mma ịnọ naanị n’ebe na-ezoghị ezo n’ụlọ na-achọ ihe n’Ịntanet

10. Olee ụzọ ndị anyị nwere ike isi mee ihe e kwuru na Jems 1:14, 15? (Gụọkwa  igbe dị na peeji nke 101)

10 Chee echiche banyere ihe e dere na Jems 1:14, 15, nke sịrị: “A na-anwa onye ọ bụla mgbe ọchịchọ nke aka ya rapụtara ya wee rafuo ya. Mgbe ọchịchọ ahụ tụụrụ ime, ọ na-amụpụta mmehie; mgbe e mechara mmehie, ọ na-amụpụta ọnwụ.” Ya mere, ọ bụrụ na ọchịchọ ọjọọ abata gị n’obi, gbalịa wepụ ya ngwa ngwa! Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị hụ ihe na-akpali agụụ mmekọahụ na mberede, wepụ anya gị ngwa ngwa, ma ọ bụ, gbanyụọ kọmputa ahụ, ma ọ bụkwanụ gị agbanwee ihe ị na-ele na TV. Mee ihe ọ bụla i kwesịrị ime iji zere inwe ọchịchọ rụrụ arụ tupu ya erie gị isi ma merie gị!—Matiu 5:29, 30.

11. Mgbe anyị na ọchịchọ na-ezighị ezi na-alụ ọgụ, olee otú anyị ga-esi egosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi?

11 Chineke ma anyị karịa otú anyị ma onwe anyị. O nwekwara ezigbo ihe mere o ji gbaa anyị ume, sị: “Meenụ ka akụkụ ahụ́ unu ndị dị n’elu ụwa nwụọ n’ihe banyere ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ, ọchịchọ ọjọọ, na anyaukwu, nke bụ́ ikpere arụsị.” (Ndị Kọlọsi 3:5) N’eziokwu, ime otú ahụ nwere ike isi ike. Ma, cheta na anyị nwere Nna bi n’eluigwe, Onye hụrụ anyị n’anya, Onye nwere ndidi, Onye anyị nwekwara ike ịkpọku. (Abụ Ọma 68:19) Ya mere, kpọkuo ya ozugbo ọchịchọ ọjọọ batara gị n’uche. Kpee ekpere ka o nye gị “ike karịrị ike nkịtị.” Meekwa ka uche gị dịrị n’ihe ndị ọzọ.—2 Ndị Kọrịnt 4:7; 1 Ndị Kọrịnt 9:27; gụọ igbe dị na  peeji nke 104, bụ́ “Olee Otú M Ga-esi Akwụsị Àgwà Ọjọọ?”

12. Gịnị bụ “obi” anyị, gịnịkwa mere anyị ga-eji chebe ya?

12 Sọlọmọn bụ́ nwoke maara ihe dere, sị: “Karịa ihe niile ọzọ a ga-eche nche, chebe obi gị, n’ihi na ọ bụ na ya ka isi iyi nke ndụ si apụta.” (Ilu 4:23) “Obi” anyị bụ ihe anyị bụ n’ime, ya bụ, ụdị mmadụ anyị bụ n’anya Chineke. Ihe ga-ekpebikwa ma ànyị ga-enweta ndụ ebighị ebi ma ọ bụ na anyị agaghị enweta abụghị otú ndị ọzọ si ele anyị anya, kama ọ bụ otú Chineke si ele “obi” anyị anya. Okwu a doro anya. Ọ bụghịkwa ihe egwuregwu. Job bụ́ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi na anya ya gbara ndụ, ka ọ ghara ile nwaanyị anya ọjọọ. (Job 31:1) Nke ahụ bụụrụ anyị ezi ihe nlereanya! Otu ọbụ abụ mere ihe ahụ Job mere. O kpere ekpere, sị: “Mee ka anya m ghara ịhụ ihe na-abaghị uru.”—Abụ Ọma 119:37.

IHE NZUZU DAỊNA MERE

13. Ònye bụ Daịna, gịnị mere o ji bụrụ na ụdị ndị enyi ọ họọrọ bụ izuzu nzuzu?

13 Dị ka anyị hụrụ n’Isi nke Atọ, ndị enyi anyị nwere ike ime ka anyị mụta ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ. (Ilu 13:20; 1 Ndị Kọrịnt 15:33) Dị ka ihe atụ, chee echiche banyere Daịna, bụ́ ada nna ochie ahụ bụ́ Jekọb. (Jenesis 34:1) N’agbanyeghị ezigbo ọzụzụ e nyere Daịna, o zuzuuru gaa mee ụmụ agbọghọ Kenan enyi. Dị ka ndị Moab, a ma ndị Kenan ama na ha na-eme omume rụrụ arụ. (Levitikọs 18:6-25) Daịna yiri anụ oriri n’ebe ndị ikom Kenan nọ, gụnyere Shikem, bụ́ “onye a kasị asọpụrụ” n’ezinụlọ nna ya.—Jenesis 34:18, 19.

14. Olee otú ụdị ndị enyi Daịna họọrọ si kpata ọdachi?

14 Ma eleghị anya, Daịna ebughị mmekọahụ n’obi mgbe ọ hụrụ Shikem. Ma, Shikem mere ihe ọtụtụ n’ime ndị Kenan weere dị ka ihe ziri ezi mgbe agụụ mmekọahụ malitere ịgụ ha. Lịka lịka ọ bụla Daịna gbara mgbe oge gaferela abaghị uru ọ bụla, n’ihi na Shikem ‘kpọọrọ ya ma merụọ ya.’ O yiri ka Shikem mechara ‘hụ Daịna n’anya,’ ma nke ahụ agbanweghị ihe o mere ya. (Jenesis 34:1-4) Ọ bụghị naanị Daịna tara ahụhụ si na ya pụta. Ụdị ndị enyi ọ họọrọ mere ka o wetara ezinụlọ ha dum ihere na nkọcha.—Jenesis 34:7, 25-31; Ndị Galeshia 6:7, 8.

15, 16. Olee otú anyị ga-esi enweta ezi amamihe? (Gụọkwa  igbe dị na peeji nke 109.)

15 Ọ bụrụ na ọ dị ihe dị mkpa Daịna mụtara, ọ mụtara ya mgbe o tinyechara aka n’ọkụ. Ndị hụrụ Jehova n’anya ma na-erubere ya isi ekwesịghị itinye aka n’ọkụ tupu ha amụta ihe ná ndụ. Ebe ọ bụ na ha na-ege Chineke ntị, ha kpebiri ‘na ha na ndị maara ihe ga na-eje ije.’ (Ilu 13:20a) Ya mere, ha na-aghọta “ụzọ dum nke ihe dị mma,” na-ezerekwa nsogbu na ihe mgbu na-enweghị isi na ọdụ.—Ilu 2:6-9; Abụ Ọma 1:1-3.

16 Ndị niile amamihe Chineke na-agụ agụụ na-enweta ya. Otú ahụkwa ka ndị na-egosi na amamihe Chineke na-agụ ha agụụ na-enweta ya, n’ihi na ha na-ekpesi ekpere ike maka ya, na-amụchikwa Okwu Chineke na akwụkwọ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-ebipụta anya. (Matiu 24:45; Jems 1:5) Ihe ọzọ dị mkpa bụ ịdị umeala n’obi, nke ha na-egosi site n’ịdị njikere ige ntị na ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ. (2 Ndị Eze 22:18, 19) Dị ka ihe atụ, Onye Kraịst nwere ike ikweta na obi ya dị aghụghọ, bụrụkwa ihe siri ike njite. (Jeremaya 17:9) Ma mgbe o ruru n’omume, ọ̀ na-adị umeala n’obi ịnabata ndụmọdụ a kapịrị ọnụ na enyemaka e ji ịhụnanya nye ya?

17. Kọwaa ihe nwere ike ime n’ezinụlọ, gosikwa otú nna na nwa ya nwaanyị nwere ike isi tụgharịa uche n’okwu ahụ.

17 Chee echiche banyere ihe atụ a. Otu nna ekweghị ka nwa ya nwaanyị soro otu nwa okorobịa bụ́ Onye Kraịst kpapụ n’enweghị onye ọzọ so ha. Nwa agbọghọ ahụ agwa nna ya, sị: “Papa, ị́ tụkwasịghị m obi? Ọ dịghị ihe ọjọọ ọ bụla anyị ga-eme!” O nwere ike ịbụ na ọ hụrụ Jehova n’anya, burukwa n’obi ime ihe ziri ezi, ma ọ̀ ‘na-eje ije n’amamihe Chineke’? Ọ̀ ‘na-agbara ịkwa iko ọsọ’? Ka ò zuzuuru ‘na-atụkwasị obi n’obi nke ya’? (Ilu 28:26) I nwere ike icheta ụkpụrụ ndị ọzọ ga-enyere nna ahụ na nwa ya nwaanyị aka ịtụgharị uche n’okwu ahụ.—Gụọ Ilu 22:3; Matiu 6:13; 26:41.

JOSEF GBAARA ỊKWA IKO ỌSỌ

18, 19. Olee ọnwụnwa a nwara Josef, oleekwa otú o si merie ya?

18 Otu nwa okorobịa mara mma nke hụrụ Chineke n’anya ma gbaara ịkwa iko ọsọ bụ Josef, onye otu nna ji ya na Daịna. (Jenesis 30:20-24) Mgbe Josef bụ nwata, o ji anya ya hụ ihe si na nzuzu nwanne ya nwaanyị zuzuru pụta. O doro anya na ihe ndị ahụ Josef hụrụ na ọchịchọ o nwere ịnọrọ n’ịhụnanya Chineke chebere ya mgbe ọtụtụ afọ gachara, mgbe nwunye nna ya ukwu gbalịrị ịrata ya n’Ijipt “site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị.” N’ezie, ebe ọ bụ na Josef bụ ohu, o nweghị ike ịgba arụkwaghịm ma laa! Ọ ga-eji amamihe na obi ike na-emeso nwaanyị ahụ ihe. O mere otú ahụ site n’ịsị nwunye Pọtịfa mba ugboro ugboro, gbaakwara ya ọsọ n’ikpeazụ.—Jenesis 39:7-12.

19 Chegodị echiche: A sị na Josef bu ụzọ na-eche banyere nwaanyị ahụ ma ọ bụ mụrụ anya na-arọ nrọ mgbe niile banyere mmekọahụ, ọ̀ gaara enwe ike ikwesị ntụkwasị obi? Ikekwe, ọ garaghị eme otú ahụ. Kama ịna-eche echiche banyere ihe ọjọọ, Josef ji mmekọrịta ya na Jehova kpọrọ ihe, nke o gosiri n’okwu ọ gwara nwunye Pọtịfa. Ọ sịrị nwaanyị ahụ: ‘Ọ dịghị ihe ọ bụla nna m ukwu gbochiri m inweta ma e wezụga gị, n’ihi na ị bụ nwunye ya. Olee otú m ga-esi mee oké ihe ọjọọ a wee mehie Chineke?’—Jenesis 39:8, 9.

20. Olee otú Jehova si gbanwee ọnọdụ Josef?

20 Cheedị ụdị ọṅụ Jehova nwere mgbe ọ hụrụ ka nwa okorobịa bụ́ Josef kwesịrị ntụkwasị obi kwa ụbọchị, ọ bụ ezie na ọ nọghị nso n’ebe ezinụlọ ya nọ. (Ilu 27:11) Mgbe e mechara, Jehova gbanwere ọnọdụ Josef, nke mere ka a kpọpụta ya n’ụlọ mkpọrọ ma mee ya onyeisi na onye na-elekọta nri n’Ijipt! (Jenesis 41:39-49) Ihe ahụ e kwuru n’Abụ Ọma 97:10 bụ nnọọ eziokwu, ya bụ, “Unu ndị hụrụ Jehova n’anya, kpọọnụ ihe ọjọọ asị. Ọ na-eche mkpụrụ obi nke ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ nche; ọ na-anapụta ha n’aka ndị ajọ omume”!

21. Olee otú otu nwa okorobịa bụ́ Onye Kraịst n’otu obodo dị n’Africa si kwụsie ike n’omume ọma?

21 N’otu aka ahụ taa, ọtụtụ ndị ohu Chineke na-egosi na ha ‘kpọrọ ihe ọjọọ asị, hụkwa ezi ihe n’anya.’ (Emọs 5:15) Otu nwa okorobịa bụ́ Onye Kraịst n’otu obodo dị n’Africa kwuru na mgbe ha na-ele ule mgbakọ na mwepụ, otu nwa agbọghọ bụ́ nwa klas ha gwara ya n’asọghị anya na ọ bụrụ na o nyere ya aka, na ya na ya ga-enwe mmekọahụ. Ọ sịrị, “M jụrụ ihe ahụ ọ gwara m ozugbo. Site n’ikwesị ntụkwasị obi mgbe niile, o mere ka a na-akwanyere m ùgwù, nke bụ́ ihe dị oké ọnụ ahịa karịa ọlaọcha na ọlaedo.” N’ezie, mmehie nwere ike ‘ịtọ ụtọ ruo nwa oge,’ ma obi ụtọ nwa oge ahụ na-ewetakarị ihe mgbu dị ukwuu. (Ndị Hibru 11:25) Ihe ọzọ bụ na o nweghị ihe ọ bụ ma e were ya tụnyere obi ụtọ ebighị ebi a ga-enweta n’ihi irubere Jehova isi.—Ilu 10:22.

NABATA ENYEMAKA NKE CHINEKE EBERE NA-ENYE

22, 23. (a) Ọ bụrụ na Onye Kraịst emee mmehie dị oké njọ, gịnị mere o ji bụrụ na nke ya agwụbeghị? (b) Olee enyemaka onye mere ihe ọjọọ nwere ike inweta?

22 Ebe anyị bụ ndị na-ezughị okè, anyị niile na-alụ ọgụ ka agụụ anụ ahụ́ anyị ghara ịchị anyị, nakwa ka anyị na-eme ihe ziri ezi n’anya Chineke. (Ndị Rom 7:21-25) Jehova maara ọgụ a anyị na-alụ, “ọ na-echeta na anyị bụ ájá.” (Abụ Ọma 103:14) Ma, mgbe ụfọdụ, Onye Kraịst nwere ike ime mmehie dị oké njọ. Ọ̀ pụtara na nke ya agwụla? Mbanụ! N’ezie, onye ahụ mere ihe ọjọọ nwere ike ịghọrọ mkpụrụ ọjọọ ọ kụrụ, dị ka Eze Devid. N’agbanyeghị nke ahụ, Chineke ‘dịkwa njikere mgbe niile ịgbaghara’ ndị mmehie ha mere wutere, ha ‘ekwupụta’ ya.—Abụ Ọma 86:5; Jems 5:16; Ilu 28:13.

23 Chineke jikwa obiọma nye ọgbakọ Ndị Kraịst “onyinye n’ụdị mmadụ,” ya bụ, ndị ọzụzụ atụrụ tozuru okè n’ọgbakọ, bụ́ ndị ruru eru ma dị njikere inyere anyị aka. (Ndị Efesọs 4:8, 12; Jems 5:14, 15) Ihe ha bu n’obi bụ inyere onye ahụ mere ihe ọjọọ aka ka ya na Chineke dịghachi ná mma, dịkwa ka onye amamihe ahụ kwuru, ka o ‘nweta ezi uche’ nke ga-eme ka ọ ghara ime mmehie ahụ ọzọ.—Ilu 15:32.

‘NWETA EZI UCHE’

24, 25. (a) Olee otú nwa okorobịa ahụ a kọwara n’Ilu 7:6-23 si gosi na ya ‘enweghị uche’? (b) Olee otú anyị ga-esi ‘enweta ezi uche’?

24 Baịbụl kwuru okwu banyere ndị “na-enweghị uche” nakwa ndị “na-enweta ezi uche.” (Ilu 7:7) N’ihi aghọtachaghị nke a na-akọ n’Okwu Chineke nakwa enwechaghị ahụmahụ n’ozi Chineke, onye “na-enweghị uche” nwere ike ọ gaghị enwe nghọta na ezi uche. Dị ka nwa okorobịa ahụ a kọwara n’Ilu 7:6-23, e nwere ike ịrata ya ngwa ngwa, ya emee mmehie dị oké njọ. Otú ọ dị, “onye na-enweta ezi uche” na-echebara ụdị mmadụ ọ bụ echiche site n’ikpe ekpere na ịmụ Okwu Chineke mgbe niile. Ruo n’ókè ezughị okè ya kwere ya, ọ na-eme ka echiche ya, ọchịchọ ya, uche ya, na ihe mgbaru ọsọ ya ná ndụ daba adaba n’ihe dị Chineke mma. N’ihi ya, ọ “hụrụ mkpụrụ obi nke ya n’anya,” ma ọ bụ na-ewetara onwe ya ngọzi, ọ ‘ga-enwetakwa ihe ọma.’—Ilu 19:8.

25 Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ kwenyesiri ike na iwu Chineke ziri ezi? Ò doro m anya na irube isi n’iwu ndị ahụ ga-eme ka m nweta obi ụtọ kasị ukwuu?’ (Abụ Ọma 19:7-10; Aịzaya 48:17, 18) Ọ bụrụ na o dochaghị gị anya, lebara ya anya. Tụgharịa uche n’ihe ga-esi n’ileghara iwu Chineke anya pụta. ‘Detụkwa Jehova ire ma hụ na ọ dị mma’ site n’iji eziokwu ahụ na-ebi ndụ, sitekwa n’iche ihe dị mma, ya bụ, ihe bụ́ eziokwu, ihe ziri ezi, ihe dị ọcha, ihe na-akpali ịhụnanya, na omume ọma. (Abụ Ọma 34:8; Ndị Filipaị 4:8, 9) Ka obi sie gị ike na, ka ị na-emekwu otú ahụ, ị ga-ahụkwu Chineke n’anya, hụkwa ihe ndị ọ hụrụ n’anya n’anya, meekwa ka ị kpọọ ihe ndị ọ kpọrọ asị asị. Josef abụghị onye zuru okè. Ma, ọ ‘gbaara ịkwa iko ọsọ’ n’ihi na o kwere ka Jehova zụọ ya ruo ọtụtụ afọ ma mee ka o nwee uche. Ọ dị mma ka i mee otú ahụ o mere.—Aịzaya 64:8.

26. Olee isiokwu dị mkpa anyị ga-atụle n’Isi nke Iri na nke Iri na Otu?

26 Onye kere anyị nyere anyị akụkụ ahụ́ e ji amụta nwa, ọ bụghị ka anyị jiri ya na-egwuri egwu iji nweta obi ụtọ nkịtị, kama ọ bụ ka e jiri ya mụta nwa, jirikwa ya gosi ịhụnanya n’alụmdi na nwunye. (Ilu 5:18) A ga-atụle otú Chineke si ele alụmdi na nwunye anya n’Isi nke Iri na nke Iri na Otu.

^ par. 4 O doro anya na mmadụ ole ahụ e kwuru n’Ọnụ Ọgụgụ gụnyere ma ‘ndị isi nke ndị Izrel,’ bụ́ ndị ndị ikpe gburu, ma ndị Jehova ji aka ya gbuo. Ndị ahụ ndị ikpe gburu nwere ike iru otu puku mmadụ.—Ọnụ Ọgụgụ 25:4, 5.

^ par. 7 Gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ,” n’Ụlọ Nche July 15, 2006, nke Ndịàmà Jehova bipụtara, ka ị hụ ebe a kọwara ihe adịghị ọcha na omume rụrụ arụ pụtara.

^ par. 9 “Ihe na-akpali agụụ mmekọahụ” e kwuru ebe a pụtara foto, ihe e dere ede, ma ọ bụ okwu e kwuru iji kpalie agụụ mmekọahụ. Ihe na-akpali agụụ mmekọahụ nwere ike ịbụ foto onye gba ọtọ nke e sere iji kpalie agụụ mmekọahụ ma ọ bụ ebe e sere mmadụ abụọ ma ọ bụ ihe karịrị mmadụ abụọ nọ na-enwe mmekọahụ ndị na-awụ akpata oyi n’ahụ́.

^ par. 9 A kọwara igbo onwe onye agụụ mmekọahụ n’isiokwu dị na peeji nke 218-219.