Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE IRI NA ABỤỌ

Na-ekwu ‘Okwu Dị Mma Maka Iwuli Mmadụ Elu’

Na-ekwu ‘Okwu Dị Mma Maka Iwuli Mmadụ Elu’

“Ka okwu rere ure ghara isi unu n’ọnụ pụta, kama nke ahụ, ka ọ bụrụ okwu dị mma maka iwuli elu.”—NDỊ EFESỌS 4:29.

1-3. (a) Olee otu n’ime onyinye Jehova nyere anyị, oleekwa otú e nwere ike isi jiri ya mebie ihe? (b) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọrọ n’ịhụnanya Chineke, gịnị ka anyị kwesịrị iji onyinye ikwu okwu na-eme?

Ọ BỤRỤ na i nyere onye ị hụrụ n’anya onyinye, olee otú obi ga-adị gị ma ọ kpachara anya mebie ya? Ka e were ya na i nyere ya ụgbọala, gị emechaa chọpụta na ọ nyara ya ka onye ara, merụọ ndị ọzọ ahụ́. Ọ̀ bụ na iwe agaghị ewe gị?

2 Ikwu ihe a na-aghọta aghọta bụ onyinye si n’aka Jehova, bụ́ Onye na-enye “ezi onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè.” (Jems 1:17) Onyinye a nke mere ka ụmụ mmadụ dị iche n’anụmanụ na-eme ka anyị nwee ike ịgwa ndị ọzọ otú obi dị anyị, ọ bụghị naanị ihe anyị chere. Otú ọ dị, dị ka ụgbọala, e nwere ike iji onyinye ikwu okwu mebie ihe. Ọ ga-ewe Jehova ezigbo iwe ma ọ bụrụ na anyị ekwuo okwu n’echeghị echiche, mee ka ọ gbawaa ndị ọzọ obi ma wute ha!

3 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọrọ n’ịhụnanya Chineke, anyị kwesịrị iji onyinye ikwu okwu na-eme ihe Onye nyere anyị ya chọrọ ka anyị jiri ya na-eme. Jehova gwara anyị hoo haa ụdị okwu na-adị ya mma. Okwu ya sịrị: “Ka okwu rere ure ghara isi unu n’ọnụ pụta, kama nke ahụ, ka ọ bụrụ okwu dị mma maka iwuli elu dị ka ọ pụrụ ịdị mkpa, ka o wee mee ka ndị na-anụ ya nweta ihe dị mma.” (Ndị Efesọs 4:29) Ka anyị tụlee ihe mere anyị kwesịrị iji kpachara anya n’otú anyị si ekwu okwu, ụdị okwu anyị kwesịrị izere, nakwa otú anyị ga-esi na-ekwu okwu “dị mma maka iwuli elu.”

IHE MERE ANYỊ KWESỊRỊ IJI NA-AKPACHARA ANYA N’IHE ANYỊ NA-EKWU

4, 5. Olee otú ilu ụfọdụ dị na Baịbụl si kọwaa ike okwu na-akpa?

4 Otu n’ime ihe mere anyị ga-eji na-akpachara anya n’ihe anyị na-ekwu bụ na okwu na-akpa ike. Ilu 15:4 sịrị: “Ire dị jụụ bụ osisi nke ndụ, ma ọ bụrụ na ọ gbagọrọ agbagọ, ọ na-eweta nkụda mmụọ.” * Otú ahụ mmiri si eme ka osisi na-akpọnwụ akpọnwụ dịghachi ndụ, otú ahụ ka okwu ọma e ji ire dị jụụ kwuo nwere ike ịgba ndị a gwara ya ume. N’aka nke ọzọ, okwu ọjọọ e ji ire gbagọrọ agbagọ kwuo nwere ike igbu mmụọ ndị ọzọ. N’ezie, okwu anyị na-ekwu nwere ike imerụ mmadụ ahụ́ ma ọ bụ gwọọ mmadụ.—Ilu 18:21.

5 Ilu ọzọ kọwakwuru otú okwu si akpa ike, sị: “E nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị echiche dị ka ebe e ji mma agha maa mmadụ, ma ire ndị maara ihe na-agwọ ọrịa.” (Ilu 12:18) Okwu e kwuru n’echeghị echiche nwere ike ịgbawa mmadụ obi ma mebie mmekọrịta mmadụ na ibe ya. À gwatụla gị okwu gbawara gị obi dị ka ebe e ji mma agha maa mmadụ? Otu ilu ahụ kwukwara ihe ọma e nwere ike iji ire mee, sị: “Ire ndị maara ihe na-agwọ ọrịa.” Okwu onye nwere amamihe Chineke chere echiche kwuo nwere ike ime ka obi ruo onye a gwara okwu gbawara ya obi ala ma mezie mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Ì nwere ike icheta mgbe a gwara gị okwu ọma mere ka obi ruo gị ala? (Ilu 16:24) Ebe anyị maara na okwu anyị na-ekwu na-akpa ike, anyị kwesịrị n’ezie ịgwa ndị ọzọ okwu ga-agba ha ume, ọ bụghị okwu ga-egbu mmụọ ha.

Okwu ọma na-eme ka ahụ́ ruo mmadụ ala

6. Gịnị mere ịchịkwa ire anyị ji bụrụ ọgụ na mgba?

6 Otú ọ sọkwara anyị gbalịa, anyị enweghị ike ịchịkwa ire anyị kpamkpam. Ya mere, ihe nke abụọ mere anyị ga-eji na-akpachara anya n’otú anyị si ekwu okwu bụ: Mmehie na ezughị okè na-eme ka anyị jiri ire anyị kwuo okwu na-ezighị ezi. Ihe anyị na-ekwu na-esi anyị n’obi, ‘ọchịchọ obi mmadụ jọkwara njọ.’ (Jenesis 8:21; Luk 6:45) N’ihi ya, ịchịkwa ire anyị bụ ọgụ na mgba. (Jems 3:2-4) Ọ bụ ezie na anyị enweghị ike ịchịkwa ire anyị kpamkpam, anyị nwere ike ịna-agbalịsi ike imezikwu otú anyị si eji ire anyị ekwu okwu. Otú ahụ onye chọrọ igwuru mmiri na-agbago ná mmiri na-asọ asọ ga-ejisi ike ka mmiri ghara iburu ya na-agbada agbada, otú ahụ ka anyị ga na-alụso ọchịchọ mmehie ọgụ ka anyị ghara iji ire anyị na-ekwu ihe na-ezighị ezi.

7, 8. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji zaa Jehova ajụjụ n’ihi ihe anyị na-ekwu?

7 Ihe nke atọ mere anyị ga-eji na-akpachara anya n’otú anyị si ekwu okwu bụ na anyị ga-aza Jehova ajụjụ n’ihi ihe anyị kwuru. Otú anyị si eji ire anyị ekwu okwu na-emetụta mmekọrịta anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị nakwa adịm ná mma nke anyị na Jehova. Jems 1:26 sịrị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chere na ya na-efe Chineke n’ụzọ ziri ezi ma ọ dịghị achịkwa ire ya, kama na-aghọgbu obi ya, ụdị ofufe onye a na-efe bụ ihe efu.” * Dị ka anyị hụrụ n’Isi nke Iri na Otu, okwu anyị adịghị iche n’ofufe anyị na-efe Chineke. Ọ bụrụ na anyị achịkwaghị ire anyị—jiri ya na-ekwu okwu ọjọọ na-agbawa obi—o nwere ike ime ka ọrụ niile anyị na-arụ dị ka Ndị Kraịst bụrụ ihe efu n’anya Chineke. Nke ahụ ọ́ bụghị ihe anyị kwesịrị ichebara echiche?—Jems 3:8-10.

8 O doro anya na anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji na-akpachara anya ka anyị ghara iji onyinye ikwu okwu na-eme ihe na-ezighị ezi. Tupu anyị eleba anya n’ụdị okwu ọma ndị na-ewuli mmadụ elu, ka anyị tụlee okwu ezi Onye Kraịst na-ekwesịghị ikwu ma otu ma otu.

OKWU NKE NA-EGBU MMỤỌ

9, 10. (a) Olee ụdị okwu a na-anụ kwa ụbọchị n’ụwa taa? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị izere okwu rụrụ arụ? (Gụọkwa ihe e dere n’ala ala peeji.)

9 Okwu rụrụ arụ. Ịkpọ iyi, okwu rere ure, na ụdị okwu rụrụ arụ ndị ọzọ bụ ihe a na-anụ kwa ụbọchị n’ụwa taa. Ọtụtụ ndị na-ekwu okwu rụrụ arụ iji mesie okwu ha ike ma ọ bụ n’ihi na ha amaghị otú ha ga-esi kọwaa ihe ha chọrọ ikwu. Ndị na-eme ihe ọchị na-ekwukarị okwu rụrụ arụ banyere mmekọahụ iji mee ka ndị mmadụ chịa ọchị. Otú ọ dị, okwu rụrụ arụ abụghị ihe ọchị. N’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, Pọl onyeozi e nyere ike mmụọ nsọ dụrụ ọgbakọ dị na Kọlọsi ọdụ ka ha wepụ “okwu rụrụ arụ.” (Ndị Kọlọsi 3:8) Pọl gwara ọgbakọ dị n’Efesọs na “okwu rụrụ arụ” so n’ihe a na-ekwesịghị ‘ịkpọtụdị aha n’etiti’ ezi Ndị Kraịst.—Ndị Efesọs 5:3, 4.

10 Okwu rụrụ arụ na-ewe Jehova iwe. Ọ na-ewekwa ndị hụrụ ya n’anya iwe. N’ezie, ịhụnanya anyị hụrụ Jehova na-eme ka anyị ghara ikwu okwu rụrụ arụ. Mgbe Pọl na-ekwu ihe ndị bụ́ “ọrụ nke anụ ahụ́,” ọ kpọrọ “adịghị ọcha” aha, nke gụnyere okwu na-adịghị ọcha. (Ndị Galeshia 5:19-21) Ihe a abụghị okwu e ji egwuri egwu. E nwere ike ịchụpụ mmadụ n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na a dụọ ya ọdụ ugboro ugboro, ya aka na-ekwu okwu rụrụ arụ ma ọ bụ okwu na-akwado omume rụrụ arụ, okwu na-eweda mmadụ ala, nakwa okwu na-emetọ mmadụ. *

11, 12. (a) Gịnị bụ asịrị, olee otú o nwere ike isi bụrụ nke na-emebi ihe? (b) Gịnị mere ndị na-efe Jehova ga-eji zere ikwu okwu nkwutọ?

11 Asịrị nke na-emebi ihe, nkwutọ. Ndị mmadụ na-ekwukarị banyere ndị ọzọ na ihe na-eme ná ndụ ha. Ọ̀ bụ ihe niile e kwuru banyere ndị mmadụ dị njọ? Mba, ma ọ bụrụ na anyị na-ekwurịta ihe na-anaghị emebi aha mmadụ, na-akọ akụkọ bara uru, dị ka ịkọ banyere onye a ka mere baptizim eme ma ọ bụ onye e kwesịrị ịgba ume. Ndị Kraịst na narị afọ mbụ nwere ezigbo mmasị n’ọdịmma nke Ndị Kraịst ibe ha, ha kọkwaara ibe ha akụkọ kwesịrị ekwesị banyere ndị kwere ekwe ibe ha. (Ndị Efesọs 6:21, 22; Ndị Kọlọsi 4:8, 9) Otú ọ dị, ikwu banyere ndị ọzọ nwere ike imebi ihe ma ọ bụrụ na ihe e kwuru bụ ụgha ma ọ bụ na a kọsara ihe mmadụ na-achọghị ka ndị ọzọ mara. Nke kacha njọ bụ na o nwere ike iduga ná nkwutọ, bụ́ nke na-emebikarị ihe. Nkwutọ bụ “ikwu ihe na-abụghị eziokwu. . . nke na-emebi aha mmadụ.” Dị ka ihe atụ, ndị Farisii ji obi ọjọọ kwutọọ Jizọs iji mebie aha ya. (Matiu 9:32-34; 12:22-24) Nkwutọ na-akpatakarị esemokwu.—Ilu 26:20.

12 Jehova anaghị ele ndị ji onyinye ikwu okwu emebi aha ndị ọzọ ma ọ bụ na-akpata nkewa anya ọma. Ọ kpọrọ ndị na-akpata “esemokwu n’etiti ụmụnne” asị. (Ilu 6:16-19) Okwu Grik e si sụgharịta “onye nkwutọ” bụ di·aʹbo·los, nke bụkwa ihe a na-akpọ Setan. Ọ bụ “Ekwensu,” bụ́ onye ọjọọ nke na-ekwutọ Chineke. (Mkpughe 12:9, 10) N’eziokwu, anyị kwesịrị izere okwu ndị ga-eme ka a kpọọ anyị Ekwensu. E kwesịghị ikwu okwu nkwutọ na-akpata ọrụ nke anụ ahụ́ ndị dị ka “esemokwu” na “nkewa” n’ọgbakọ. (Ndị Galeshia 5:19-21) N’ihi ya, tupu gị akọọ akụkọ ị nụrụ banyere onye ọzọ, jụọ onwe gị, sị: ‘Akụkọ a ọ̀ bụ eziokwu? Ọ̀ dị mma ka m kọọrọ ya onye ọzọ? Ọ̀ bara uru ka m kọsawa ya?’—1 Ndị Tesalonaịka 4:11.

13, 14. (a) Olee otú okwu mkparị si emetụta ndị a gwara ya? (b) Gịnị bụ nkwutọ, gịnị mere o ji bụrụ na onye nkwutọ na-etinye onwe ya ná nsogbu?

13 Okwu mkparị. Dị ka anyị kwuru na mbụ, okwu nwere ike imebi ihe. N’eziokwu, n’ihi ezughị okè, anyị niile na-ekwu okwu mgbe ụfọdụ ma kwaa mmakwaara. Otú ọ dị, Baịbụl dọrọ aka ná ntị ka anyị ghara ikwu ụdị okwu a na-ekwesịghị ikwu n’ezinụlọ Ndị Kraịst ma ọ bụ n’ọgbakọ. Pọl dụrụ Ndị Kraịst ọdụ, sị: “Wepụnụ obi ilu niile na iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị . . . n’etiti unu.” (Ndị Efesọs 4:31) Otú Baịbụl ndị ọzọ si sụgharịa okwu mkparị bụ “nkwulu,” “ịkọ ọnụ,” na “okwu ọjọọ.” Okwu mkparị—nke gụnyere ikwu okwu nke na-eweda mmadụ ala na ikwu okwu nkatọ mgbe niile—nwere ike imebi ùgwù ndị ọzọ ma mee ka ha chee na ha abaghịzi uru. Okwu mkparị na-aka ewute ụmụaka ngwa ngwa n’ihi na obi akabeghị ha, ha na-ekwerekwa ihe ọ bụla a gwara ha.—Ndị Kọlọsi 3:21.

14 Baịbụl ji okwu ndị gbara ọkpụrụkpụ katọọ ikwujọ mmadụ, ya bụ, iji okwu mkparị, okwu nlelị, ma ọ bụ okwu ọjọọ emebi aha ndị ọzọ. Onye na-ekwu okwu ndị dị otú ahụ mgbe niile na-etinye onwe ya ná nsogbu, n’ihi na e nwere ike ịchụpụ onye nkwutọ n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na ọ kwụsịghị ya, n’agbanyeghị mgbalị e mere ugboro ugboro inyere ya aka ịgbanwe. Ọ bụrụ na ọ hapụghị omume ọjọọ ahụ, ngọzi Alaeze ahụ agaghị eru ya aka. (1 Ndị Kọrịnt 5:11-13; 6:9, 10) N’ihi ya, o doro anya na o nweghị otú anyị ga-esi nọrọ n’ịhụnanya Chineke ma ọ bụrụ na anyị na-ekwu okwu rụrụ arụ, okwu ụgha, ma ọ bụ okwu ọjọọ. Ụdị okwu ahụ na-egbu mmụọ mmadụ.

ỤDỊ OKWU ‘NA-EWULI MMADỤ ELU’

15. Olee ụdị okwu “dị mma maka iwuli elu”?

15 Olee otú anyị ga-esi jiri onyinye ikwu okwu na-eme ihe Onye nyere anyị ya chọrọ ka anyị jiri ya na-eme? Cheta na Okwu Chineke gbara anyị ume ka anyị na-ekwu “okwu dị mma maka iwuli elu.” (Ndị Efesọs 4:29) Obi na-atọ Jehova ụtọ mgbe anyị kwuru okwu ndị na-ewuli ndị ọzọ elu, okwu na-agba ha ume, na okwu na-eme ka obi sie ha ike. Ikwu ụdị okwu ndị ahụ chọrọ ka anyị chee echiche nke ọma. Baịbụl enyeghị anyị iwu ndị a kapịrị ọnụ banyere okwu anyị ga na-ekwu; o depụtaghịkwa ụdị “okwu dị ọcha” niile anyị ga na-ekwu. (Taịtọs 2:8) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-ekwu okwu “dị mma maka iwuli elu,” anyị kwesịrị iburu n’obi ihe atọ dị mkpa e ji mara okwu na-ewuli elu: Ọ na-adị ọcha, ọ na-abụ eziokwu, ọ na-abụ okwu ọma. Ka anyị buru ihe ndị a n’obi tụlee ihe atụ ole na ole ndị na-egosi okwu na-ewuli elu.—Gụọ igbe dị na peeji nke 140, bụ́ “ Ihe M Na-ekwu Ọ̀ Na-ewuli Mmadụ Elu?”

16, 17. (a) Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-aja ndị ọzọ mma? (b) Olee mgbe anyị nwere ike ịja ndị mmadụ mma n’ọgbakọ? n’ezinụlọ anyị?

16 Ịja mma nke si n’obi. Ma Jehova ma Jizọs ghọtara na ikwu okwu ịja mma dị mkpa. (Matiu 3:17; 25:19-23; Jọn 1:47) Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị kwesịkwara ịja ndị ọzọ ezigbo mma. N’ihi gịnị? Ilu 15:23 sịrị: ‘Lee nnọọ ka okwu e kwuru n’oge ya si dị mma!’ Jụgodị onwe gị, sị: ‘Olee otú obi na-adị m ma mmadụ jiri obi ya dum jaa mụ mma? Ọ̀ bụ na ọ naghị eme m obi ụtọ, gbaakwa m ume?’ N’ezie, ọ bụrụ na mmadụ ejiri obi ya dum jaa gị mma, ọ ga-eme ka ị mara na onye ahụ hụrụ ihe ọma i mere, na ọ na-eche banyere gị, nakwa na mgbalị i tinyere mee ihe ahụ efughị ọhịa. Mma dị otú ahụ a jara gị ga-eme ka obi sie gị ike, gbaakwa gị ume ịrụsikwu ọrụ ike n’oge ọzọ. Ebe mma a jara gị na-adị gị mma, ọ̀ bụ na i kwesịghị ịgbalịsi ike ka ị na-aja ndị ọzọ mma?—Matiu 7:12.

17 Mụta ịhụ ihe ọma ndị ọzọ mere, ma jaa ha mma. N’ọgbakọ, i nwere ike ige okwu tọrọ gị ụtọ n’ọmụmụ ihe, hụ onye na-eto eto na-agbalị iru ihe mgbaru ọsọ ya, ma ọ bụkwanụ hụ agadi nke na-abịachi ọmụmụ ihe anya n’agbanyeghị nsogbu nke ime agadi. Ezigbo mma ị jara ndị dị otú ahụ nwere ike iru ha n’obi, meekwa ka ha kpebisie ike ife Chineke. N’ezinụlọ, di na nwunye kwesịrị ịja ibe ha ezigbo mma, gosikwa na obi dị ha ụtọ. (Ilu 31:10, 28) Ọ na-atọkwa ụmụaka ụtọ karịsịa mgbe ha ghọtara na a hụrụ ihe ọma ha mere nakwa na e ji ha kpọrọ ihe. Otú ahụ anwụ na mmiri na-eme ka ihe a kụrụ akụ na-eto, otú ahụkwa ka ịja mma na okwu ọma na-eme ka obi ruo nwatakịrị ala. Ndị nne na nna, gbalịanụ ka unu na-aja ụmụ unu mma mgbe ha kpara ezi àgwà ma rụsie ọrụ ike. Ịja mma dị otú ahụ nwere ike ịgba ụmụ unu ume, mee ka obi sie ha ike, meekwa ka ha gbalịsikwuo ike ime ihe ziri ezi.

18, 19. Gịnị mere anyị kwesịrị iji gbalịsie ike ịkasi ndị kwere ekwe ibe anyị obi, olee otú anyị ga-esi mee ya?

18 Nkasi obi na ngụgụ obi. Jehova na-echebara “ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha” na “ndị e gburu mmụọ ha” echiche. (Aịzaya 57:15) Okwu ya gbara anyị ume ka anyị ‘na-akasirịta ibe anyị obi,’ nakwa ka anyị ‘na-agụgụ mkpụrụ obi dara mbà.’ (1 Ndị Tesalonaịka 5:11, 14) Anyị kwesịrị inwe obi ike na Chineke na-ahụ mgbalị anyị na-etinye ịkasi ndị kwere ekwe ibe anyị obi, bụ́ ndị obi na-adịghị mma, obi na-atọkwa ya ụtọ.

Obi na-atọ Jehova ụtọ mgbe anyị gwara ndị ọzọ okwu ga-ewuli ha elu

19 Otú ọ dị, olee ihe i nwere ike ikwu iji wulie Onye Kraịst ibe gị dara mbà n’obi elu? Echela na ị ga-edozirịrị nsogbu ahụ. Ọtụtụ mgbe, ntakịrị okwu anyị gwara ha na-akacha abara ha uru. Mee ka obi sie onye ahụ dara mbà n’obi ike na ị hụrụ ya n’anya, na ị na-echebakwara ya echiche. Gwa ya na ị chọrọ ka i kpeere ya ekpere; i nwere ike ịrịọ Jehova ka o nyere onye ahụ aka ịghọta na ndị ọzọ hụrụ ya n’anya nke ukwuu, na Chineke hụkwara ya n’anya. (Jems 5:14, 15) Mee ka obi sie ya ike na ọ dị mkpa n’ọgbakọ, na ọgbakọ ejighị ya egwuri egwu. (1 Ndị Kọrịnt 12:12-26) Gụọrọ ya otu amaokwu Baịbụl ga-agba ya ume iji mee ka obi sie ya ike na ihe banyere ya na-emetụ Jehova n’obi n’ezie. (Abụ Ọma 34:18; Matiu 10:29-31) O doro anya na iwepụta ezigbo oge gwa onye dara mbà n’obi “okwu ọma,” na ịgwa ya okwu si gị n’obi ga-eme ka ọ mara na unu hụrụ ya n’anya, jirikwa ya kpọrọ ihe.—Ilu 12:25.

20, 21. Olee ihe ndị na-eme ka ndụmọdụ baa uru?

20 Ndụmọdụ nke bara uru. Ebe anyị bụ ndị na-ezughị okè, ndụmọdụ dị anyị niile mkpa mgbe niile. Baịbụl gbara anyị ume, sị: “Nụrụ ndụmọdụ, narakwa ịdọ aka ná ntị, ka i wee mara ihe n’ọdịnihu gị.” (Ilu 19:20) Ọ bụghị naanị ndị okenye na-enye ndị ọzọ ndụmọdụ. Ndị nne na nna na-enye ụmụ ha ndụmọdụ. (Ndị Efesọs 6:4) Ụmụnna nwaanyị tozuru okè nwere ike inye ụmụ agbọghọ ndụmọdụ. (Taịtọs 2:3-5) Ịhụnanya anyị hụrụ ndị ọzọ ga-eme ka anyị chọọ inye mmadụ ndụmọdụ nke na-agaghị egbu mmụọ ya. Gịnị ga-enyere anyị aka inye ụdị ndụmọdụ ahụ? Ka anyị leba anya n’ụzọ ihe atọ na-eme ka ndụmọdụ bakwuo uru: àgwà onye nyere ya na ihe o bu n’obi, ihe mere o ji nye ndụmọdụ ahụ, nakwa otú o si nye ya.

21 Ndụmọdụ bara uru dabeere n’onye nyere ya. Jụọ onwe gị, sị, ‘Olee mgbe ndụmọdụ na-adịrị m mfe ịnabata?’ Ọ ga-adịrị gị mfe ịnabata ndụmọdụ ma ọ bụrụ na ị ghọta na onye na-enye gị ndụmọdụ ahụ na-echebara gị echiche, na o bughị iwe n’obi, nakwa na o bughị ihe ọjọọ n’obi. Ya mere, mgbe ị na-enye ndị ọzọ ndụmọdụ, ọ́ bụghị otu ihe ahụ ka i kwesịrị ime? Ndụmọdụ bara uru na-adaberekwa n’Okwu Chineke. (2 Timoti 3:16) Ma ànyị na-ekwu kpọmkwem ihe Baịbụl kwuru ma ọ bụ na anyị anaghị ekwu, ndụmọdụ ọ bụla anyị na-enye kwesịrị ịdabere n’Akwụkwọ Nsọ. N’ihi ya, ndị okenye kwesịrị ịkpachara anya ka ha ghara ịmanye ndị ọzọ ime ihe ha chere; ha ekwesịghịkwa ịrọgharị ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, iji mee ka o yie ka Baịbụl ọ̀ kwadoro ihe ha chere. Ndụmọdụ na-akakwa aba uru ma ọ bụrụ na e nye ya n’ụzọ ziri ezi. Ndụmọdụ e ji obiọma nye na-aka adị mfe nnabata, meekwa ka onye e nyere ya ghara iche na a kparịrị ya.—Ndị Kọlọsi 4:6.

22. Gịnị ka i kpebisiri ike iji onyinye ikwu okwu na-eme?

22 N’ezie, okwu bụ onyinye bara uru Chineke nyere anyị. Ịhụnanya anyị hụrụ Jehova kwesịrị ime ka anyị jiri onyinye ahụ na-eme ihe ziri ezi, ọ bụghị ihe na-ezighị ezi. Ka anyị cheta na okwu anyị na-agwa ndị ọzọ na-akpa ike—o nwere ike iwuli ha elu ma ọ bụ gbuo mmụọ ha. N’ihi ya, ka anyị gbalịsie ike iji onyinye a na-eme ihe Chineke chọrọ ka anyị jiri ya na-eme, ya bụ, ‘iwuli mmadụ elu.’ Ọ ga-eme ka okwu anyị na-agba ndị nọ anyị gburugburu ume, meekwa ka anyị nọrọ n’ịhụnanya Chineke.

^ par. 4 Okwu Hibru a sụgharịrị “gbagọrọ agbagọ” n’Ilu 15:4 nwekwara ike ịpụta “ihe hịgọrọ ahịgọ ma ọ bụ ihe rụrụ arụ.”

^ par. 7 Okwu Grik e si sụgharịta “ihe efu” pụtakwara ‘ihe na-abaghị uru’ na ‘ihe na-adịghị amị mkpụrụ.’—1 Ndị Kọrịnt 15:17; 1 Pita 1:18.

^ par. 10 N’Akwụkwọ Nsọ, “adịghị ọcha” bụ okwu pụtara ọtụtụ ihe nke nwere ike ịgụnye ọtụtụ mmehie. Ọ bụ ezie na ọ bụghị adịghị ọcha niile ka a ga-ekwo hiwe òtù ikpe, e nwere ike ịchụpụ mmadụ n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na ọ na-eme omume adịghị ọcha jọgburu onwe ya ma jụ ichegharị.—2 Ndị Kọrịnt 12:21; Ndị Efesọs 4:19; gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke dị n’Ụlọ Nche July 15, 2006.