Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE IRI NA ATỌ

Ememme Ndị Na-adịghị Chineke Mma

Ememme Ndị Na-adịghị Chineke Mma

“Na-achọpụtanụ ihe dị Onyenwe anyị mma.”—NDỊ EFESỌS 5:10.

1. Olee ụdị ndị Jehova na-adọta ka ha bịakwute ya, gịnịkwa mere ha ga-eji lezie anya ịmata ihe dị Chineke mma?

JIZỌS sịrị: “Ndị na-efe ezi ofufe ga-efe Nna m n’ime mmụọ na n’eziokwu, n’ihi na, n’ezie, Nna m na-achọ ka ndị dị otú ahụ fee ya ofufe.” (Jọn 4:23) Mgbe Jehova chọtara ndị dị otú ahụ—dị ka ọ chọtara gị—ọ na-adọta ha ka ha bịakwute ya na Ọkpara ya. (Jọn 6:44) Nke ahụ bụ ezigbo ihe ùgwù! Otú ọ dị, ndị hụrụ eziokwu Baịbụl n’anya aghaghị ‘ịna-achọpụta ihe dị Onyenwe anyị mma,’ n’ihi na Setan bụ aka ochie n’ịghọ aghụghọ.—Ndị Efesọs 5:10; Mkpughe 12:9.

2. Kọwaa otú Jehova si ele ndị na-agbalị ịgwakọta ezi okpukpe na okpukpe ụgha anya.

2 Chee echiche banyere ihe mere n’ebe dị nso n’Ugwu Saịnaị mgbe ndị Izrel gwara Erọn ka o meere ha chi. Erọn kwetara, kpụọrọ ha nwa ehi ọlaedo ma kwuo ihe gosiri na nwa ehi ahụ nọchiri anya Jehova. Ọ sịrị: “E nwere ememme a ga-emere Jehova echi.” Ọ̀ bụ na Jehova achọghị ịma banyere ngwakọta a ha gwakọtara ezi okpukpe na okpukpe ụgha? Mbanụ. O gburu ihe dị ka puku mmadụ atọ bụ́ ndị kpeere arụsị. (Ọpụpụ 32:1-6, 10, 28) Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’ihe a? Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọrọ n’ịhụnanya Chineke, anyị agaghị “emetụ ihe na-adịghị ọcha aka.” Anyị ga-akpachakwara ezigbo anya ka anyị ghara iji ihe ọ bụla rụrụ arụ metọọ eziokwu ahụ.—Aịzaya 52:11; Ezikiel 44:23; Ndị Galeshia 5:9.

3, 4. Gịnị mere anyị kwesịrị iji gee ntị nke ọma n’ụkpụrụ Baịbụl mgbe anyị na-atụle omenala na ememme ndị a na-eme taa?

3 Ndịozi gbochiri Ndị Kraịst oge mbụ ịnabata ozizi nke ndị si n’ezi ofufe dapụ. Ma ọ dị mwute na mgbe ha nwụchara, ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst malitere ịnabata omenala na ememme ndị na-ekpere arụsị. Ndị ahụ ahụghịkwa eziokwu Baịbụl n’anya. Ha nabatakwara ụbọchị “nsọ” nke ndị na-ekpere arụsị, kpọzie ya nke Ndị Kraịst. (2 Ndị Tesalonaịka 2:7, 10) Ka ị na-atụle ụfọdụ ememme ndị a, ị ga-ahụ otú ha si egosi mmụọ nke ụwa, kama igosi mmụọ nke Chineke. E nwere ihe ndị e ji mara ememme niile ndị ụwa na-eme: Ha na-atọ anụ ahụ́ ụtọ, na-akwadokwa ozizi okpukpe ụgha nakwa mgbaasị—bụ́ ihe ndị e ji mara “Babịlọn Ukwu ahụ.” * (Mkpughe 18:2-4, 23) Burukwa n’uche na Jehova n’onwe ya hụrụ ememme okpukpe ụgha ndị ahụ jọgburu onwe ha, bụ́ ebe e si nweta ọtụtụ omenala ndị a na-eme taa. O doro anya na ememme ndị ahụ adịghị Chineke mma taa. Ihe kacha dịrị anyị mkpa ó kwesịghị ịbụ otú o si ele ihe anya?—2 Jọn 6, 7.

4 Ebe anyị bụ ezi Ndị Kraịst, anyị ma na e nwere ememme ndị na-adịghị Jehova mma. Ma, anyị kwesịrị ikpebisi ike n’obi anyị na ọ dịghị ihe ga-ejikọ anyị na ememme ndị ahụ. Ịtụle ihe mere ememme ndị ahụ ji akpasu Jehova iwe ga-eme ka anyị kpebisikwuo ike izere ihe ọ bụla ga-eme ka anyị ghara ịnọrọ n’ịhụnanya Chineke.

KRISMAS BỤ OFUFE ANYANWỤ A GỤGHARỊRỊ AHA

5. Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na a mụghị Jizọs n’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa iri na abụọ?

5 Baịbụl ekwughị na e meere Jizọs ememme ncheta ọmụmụ. N’eziokwu, anyị amaghị kpọmkwem ụbọchị a mụrụ ya. Ma, o doro anyị anya na a mụghị ya n’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa iri na abụọ, bụ́ oge oyi na-atụ n’obodo a mụrụ ya. * Ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ bụ na Luk dere na mgbe a mụrụ Jizọs, “e nwere ndị ọzụzụ atụrụ ndị bi n’ọhịa” na-azụ atụrụ ha. (Luk 2:8-11) Ọ bụrụ na ha ‘na-ebi n’ọhịa’ n’oge niile n’afọ, ọ gaaraghị adị mkpa ikwu ya. Otú ọ di, ebe ọ bụ na mmiri na-ezokarị na Betlehem n’oge oyi, snoo ana-adakwa, a na-edebe atụrụ n’ụlọ. N’ihi ya, ndị na-azụ atụrụ agaaraghị ‘ebi n’ọhịa.’ Ihe ọzọ bụ na Josef na Meri gara Betlehem n’ihi na Siza Ọgọstọs nyere iwu ka e deba aha ndị mmadụ n’akwụkwọ. (Luk 2:1-7) O yitụghị ka Siza ọ̀ ga-agwa ndị ahụ ọchịchị Rom na-ewe iwe ka ha gaa n’obodo ha n’oge ahụ oyi na-atụsi ike.

6, 7. (a) Olee ebe ọtụtụ n’ime ihe ndị a na-eme na Krismas si? (b) Gịnị bụ ihe dị iche n’onyinye a na-enye n’oge Krismas na onyinye Ndị Kraịst na-enyerịta ibe ha?

6 Krismas esighị n’Akwụkwọ Nsọ, kama o si n’ememme ndị na-ekpere arụsị n’oge ochie, dị ka nke ndị Rom a na-akpọ Saturnalia, bụ́ ememme a na-emere chi ọrụ ubi a na-akpọ Saturn. Otú ahụkwa, otu akwụkwọ ndị Katọlik (New Catholic Encyclopedia) kwuru na dị ka ndị na-efe chi agha a na-akpọ Mithra si chee, abalị iri abụọ na ise n’ọnwa iri na abụọ bụ “ụbọchị a mụrụ chi anyanwụ a na-apụghị imeri emeri. Ha na-emekwa ememme ncheta ọmụmụ ya n’ụbọchị ahụ.” Akwụkwọ ahụ kwukwara na “Krismas malitere mgbe ofufe chi anyanwụ na-ewu ewu n’obodo Rom,” n’ihe dị ka narị afọ atọ mgbe Kraịst nwụchara.

Ezi Ndị Kraịst na-enye ndị mmadụ onyinye n’ihi na ha hụrụ ha n’anya

7 N’oge ndị na-ekpere arụsị na-eme ememme ahụ, ha na-enyerịta ibe ha onyinye ma na-eri oriri, nke bụ́ ihe ndị na-agba Krismas na-eme taa. Otú ọ dị, ọtụtụ n’ime onyinye ndị a na-enye taa n’oge Krismas na ndị e nyere n’oge ochie adabaghị n’ihe Baịbụl kwuru ná 2 Ndị Kọrịnt 9:7, nke bụ́: “Ka onye ọ bụla nye dị ka o kpebiri n’obi ya, ọ bụghị ná mwute ma ọ bụ ná mmanye, n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.” Ezi Ndị Kraịst na-enye ndị mmadụ onyinye n’ihi na ha hụrụ ha n’anya. Ha anaghị ebu otu ụbọchị n’obi enye onyinye. Ha anaghịkwa atụ anya ka ndị ha nyere onyinye nyekwa ha onyinye. (Luk 14:12-14; Ọrụ 20:35) Obi dịkwa ha nnọọ ụtọ na a tọpụla ha ná ndụ gbalụ gbalụ Krismas na-akpatara ha, nakwa na ha enwerela onwe ha n’oké ụgwọ ọtụtụ ndị na-eji n’oge ahụ.—Matiu 11:28-30; Jọn 8:32.

8. Ndị na-agụ kpakpando hà nyere Jizọs onyinye n’ụbọchị a mụrụ ya? Kọwaa.

8 Ma, ụfọdụ ndị nwere ike ịjụ, sị, Ọ̀ bụ na ndị na-agụ kpakpando enyeghị Jizọs onyinye n’ụbọchị a mụrụ ya? Mbanụ. Onyinye ha nyere Jizọs bụ ụzọ ha si sọpụrụ ya dị ka onye pụrụ nnọọ iche. Nke ahụ bụ omenala e ji mara ndị biri n’oge Baịbụl. (1 Ndị Eze 10:1, 2, 10, 13; Matiu 2:2, 11) N’eziokwu, ọ bụdịghị n’abalị ahụ a mụrụ Jizọs ka ha bịara. Mgbe ha bịara, Jizọs abụghịzi nwa ọhụrụ e nyiwere n’ihe e ji etinye nri anụ ụlọ, kama ọ nọọla ọtụtụ ọnwa. Ha hụkwara ya n’ụlọ.

IHE BAỊBỤL KWURU BANYERE ỤBỌCHỊ ỌMỤMỤ

9. Gịnị mere n’oge ememme ncheta ọmụmụ abụọ Baịbụl kọrọ akụkọ ha?

9 N’agbanyeghị na ndị mmadụ na-aṅụrị ọṅụ ma a mụọ nwa ọhụrụ, o nweghị ebe Baịbụl kwuru na onye fere Chineke mere ememme ncheta ụbọchị a mụrụ ya. (Abụ Ọma 127:3) Ndị dere Baịbụl hà chefuru ya echefu? Mbanụ. Baịbụl gwara anyị mmadụ abụọ mere ememme ụbọchị ọmụmụ ha, ya bụ, Fero eze Ijipt na Herọd Antipas. (Jenesis 40:20-22; Mak 6:21-29) Otú ọ dị, Baịbụl ekwughị okwu ọma banyere ememme ncheta abụọ ahụ, nke ka nke, nke Herọd, bụ́ ụbọchị e gbupụrụ Jọn isi.

10, 11. Olee otú Ndị Kraịst oge mbụ si lee ememme ụbọchị ọmụmụ anya, n’ihi gịnịkwa?

10 Otu akwụkwọ (The World Book Encyclopedia) kwuru, sị: “Ndị Kraịst oge mbụ lere ememme ncheta ọmụmụ nke onye ọ bụla anya dị ka omenala ndị na-ekpere arụsị.” Dị ka ihe atụ, ndị Grik oge ochie kweere na onye ọ bụla nwere mmụọ na-echebe ya, nke na-abịa n’ụbọchị a mụrụ onye ahụ ma na-eche ya nche mgbe e mechara. Otu akwụkwọ a kpọrọ Nkụzi Omenala Banyere Ụbọchị Ọmụmụ (nke dị n’asụsụ Bekee) kwuru na mmụọ ahụ “na chi nke ụbọchị a mụrụ onye ahụ na-enwe mmekọrịta dị omimi.” Kemgbe ụwa, e jikọrọ ememme ụbọchị ọmụmụ na ịgụ kpakpando na iji kpakpando akọ ọdịnihu.

11 Ihe mere ndị ohu Chineke n’oge ochie emeghị ememme ncheta ọmụmụ abụghị naanị na o si n’omenala ndị na-ekpere arụsị nakwa n’aka ndị mmụọ ọjọọ, kama o yiri ka ọ̀ bụ n’ihi iwu Chineke. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ndị ohu Chineke n’oge ochie bụ ndị ikom na ndị inyom dị umeala n’obi, ndị na-echeghị na ọmụmụ a mụrụ ha n’ụwa dị oké mkpa imere ya ememme ncheta. * (Maịka 6:8; Luk 9:48) Kama nke ahụ, ha nyere Jehova otuto ma kelee ya maka ndụ dị oké ọnụ ahịa o nyere ha. *Abụ Ọma 8:3, 4; 36:9; Mkpughe 4:11.

12. Gịnị ga-eme ka ụbọchị anyị nwụrụ ka ụbọchị a mụrụ anyị mma?

12 Chineke na-echeta ndị niile nwụrụ n’ikwesị ntụkwasị obi. Ọ ga-akpọlitekwa ha n’ọdịnihu. (Job 14:14, 15) Ekliziastis 7:1 sịrị: “Ezi aha dị mma karịa ezigbo mmanụ, ụbọchị ọnwụ mmadụ dịkwa mma karịa ụbọchị a mụrụ ya.” “Ezi aha” anyị bụ aha ọma anyị meere onwe anyị n’ebe Chineke nọ n’ihi ozi anyị ji ikwesị ntụkwasị obi jeere ya. Ka anyị buru n’obi na ihe e nyere Ndị Kraịst iwu ka ha na-echeta abụghị ọmụmụ Jizọs kama ọ bụ naanị ọnwụ ya, n’ihi na “aha” magburu onwe ya o meere onwe ya ga-eme ka a zọpụta anyị.—Luk 22:17-20; Ndị Hibru 1:3, 4.

ISTA BỤ OFUFE CHI ỌMỤMỤ A GỤGHARỊRỊ AHA

13, 14. Olee ebe omenala ndị a na-eji agba Ista si?

13 Ọ bụ ezie na a na-asị na Ista bụ ememme e ji echeta mbilite n’ọnwụ Kraịst, ọ malitere n’okpukpe ụgha n’ezie. Aha ahụ bụ́ Ista sitere n’okwu bụ́ Eostre, ma ọ bụ Ostara, nke bụ́ aha chi nwaanyị chi ọbụbọ na nke oge opupu ihe ubi nke ndị Germany biri n’England n’oge ochie. Olee otú e si malite iji àkwá na ewi eme ememme Ista? Otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma (Encyclopædia Britannica) kwuru na “ọ dịla anya a na-eji àkwá eme ihe atụ ndụ ọhụrụ na mbilite n’ọnwụ.” O kwukwara na ọ dịla anya a na-eji ùrúrù na ewi eme ihe atụ ọmụmụ. N’ihi ya, Ista bụ n’ezie ememme chi ọmụmụ nke a gụgharịrị ememme ncheta mbilite n’ọnwụ Kraịst. *

14 Jehova ọ̀ ga-akwado ka e jiri ememme chi ọmụmụ na-asọ oyi na-echeta mbilite n’ọnwụ Ọkpara ya? Tụfịakwa! (2 Ndị Kọrịnt 6:17, 18) N’ezie, a sị ka e kwuwe, Akwụkwọ Nsọ enyeghị iwu ka a na-eme ememme ncheta mbilite n’ọnwụ Jizọs. Ya mere, ime ememme ncheta mbilite n’ọnwụ ya bụ nnupụisi ma ya fọdụkwa ịgụ ya Ista.

EMEMME HALLOWEEN ADỊTỤDỊGHỊ NSỌ

15. Olee ebe ememme Halloween si, oleekwa ihe e nwere ike ikwu banyere ụbọchị a họọrọ ime ememme ahụ?

15 Ihe ọzọ a na-akpọ ememme Halloween bụ Abalị Ndị Nsọ Niile. Ihe e ji mara ya bụ ndị amoosu na ihe na-emenye mmadụ ụjọ. Ihe e ji achọ ebe a na-anọ eme ya mma bụ ngwongwo na ngwongwo ndị na-abaghị uru. Ọ bụ ndị Celt, ndị biri na Britain na Ireland n’oge ochie, malitere ememme ahụ. Mgbe ọ bụla ọnwa ji gbazuo tupu chi abalị mbụ n’ọnwa iri na otu abọọ, ha na-eme ememme Samhain, nke pụtara “Ngwụsị Oge Okpomọkụ.” Ha kweere na n’oge ememme Samhain, a na-ewepụ ihe gbochiri ndị mmụọ na ndị mmadụ ịna-emekọrịta ihe, mezie ka ndị mmụọ ọma na ndị mmụọ ọjọọ na-akpagharị n’ụwa. Ha kwekwaara na mkpụrụ obi ndị nwụrụ anwụ na-alọta ụlọ, ndị ezinụlọ ha na-edewekwara ha ihe oriri na ihe ọṅụṅụ iji mee ka obi dị ha mma. Ya mere, taa, mgbe ụmụaka jiri ejiji ka ndị mmụọ ma ọ bụ ndị amoosu, na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ na-emenye ndị mmadụ ụjọ ma ọ bụrụ na e nyeghị ha ihe, ha na-eme ememme Samhain n’amaghị ama.

DEBE AGBAMAKWỤKWỌ GỊ ỌCHA

16, 17. (a) Mgbe di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst na-ejikere ịgba akwụkwọ, gịnị mere o ji dị mkpa ka ha jiri ụkpụrụ Baịbụl tụlee omenala obodo ha banyere agbamakwụkwọ? (b) Olee ihe Ndị Kraịst kwesịrị ịtụle n’ihe banyere omenala ndị dị ka ịwụsa osikapa na ihe ndị yiri ya n’ala?

16 N’oge na-adịghị anya, “a gakwaghị anụ olu nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ na nke nwaanyị a na-alụ ọhụrụ n’ime [Babịlọn Ukwuu Ahụ] ọzọ.” (Mkpughe 18:23) N’ihi gịnị? Otu n’ime ihe kpatara ya bụ mgbaasị ọ na-eme, nke nwere ike imerụ alụmdi na nwunye malite n’ụbọchị a gbara akwụkwọ.—Mak 10:6-9.

17 Omenala obodo dị iche iche. Omenala ụfọdụ ndị yiri ka hà dị mma nwere ike isi n’omenala ndị Babịlọn, bụ́ ndị a sịrị na ha ga-ewetara ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ ma ọ bụ ndị ọbịa ha ‘ịhụ ọma.’ (Aịzaya 65:11) Otu n’ime omenala ndị ahụ bụ ịwụsa osikapa ma ọ bụ ihe ndị yiri ya n’ala. O nwere ike ịbụ na ihe mere ha ji awụsa ihe ndị ahụ n’ala bụ na ha kweere na nri ahụ ga-eme ka obi jụrụ ndị mmụọ ọjọọ ma mee ka ha ghara imerụ di na nwunye ahụ ahụ́. Ọzọkwa, kemgbe ụwa, ihe ndị e jikọtara ha na osikapa n’ụzọ dị omimi bụ ọmụmụ, obi ụtọ, na ogologo ndụ. O doro anya na ndị niile chọrọ ịnọrọ n’ịhụnanya Chineke ga-ajụ omenala ndị dị otú ahụ rụrụ arụ.—2 Ndị Kọrịnt 6:14-18.

18. Olee ụkpụrụ Baịbụl ndị kwesịrị iduzi ma di na nwunye na-ejikere ịgba akwụkwọ ma ndị ha kpọrọ òkù?

18 Ndị ohu Jehova na-ezerekwa omume ndị ụwa ndị nwere ike ime ka agbamakwụkwọ na oriri agbamakwụkwọ mebie ùgwù Ndị Kraịst, ma ọ bụ nye akọnuche ụfọdụ ndị nsogbu. Dị ka ihe atụ, ha na-ezere ikwu okwu mkparị ndị na-egbu mmụọ mmadụ ma ọ bụ okwu gbasara mmekọahụ rụrụ arụ. Ha na-ezerekwa ikwu okwu njakịrị ndị nwere ike imenye ma ndị ahụ lụrụ di na nwunye ọhụrụ ma ndị ọzọ ihere. (Ilu 26:18, 19; Luk 6:31; 10:27) Ha na-ezerekwa oriri agbamakwụkwọ na-efu oké ego, nke bụ́ “oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ,” kama igosi imeru ihe n’ókè. (1 Jọn 2:16) Ọ bụrụ na ị na-ejikere ịgba akwụkwọ, echefukwala na Jehova chọrọ ka ụbọchị ahụ pụrụ iche bụrụ ụbọchị ọ ga-abụ, mgbe ọ bụla i chetara ya, obi atọọ gị ụtọ, kama ịkwa mmakwaara. *

ỊṄỤ MMANYA IJI GỌỌRỌ MMADỤ ỌFỌ—Ò NWERE IHE JIKỌRỌ YA NA OKPUKPE?

19, 20. Gịnị ka otu akwụkwọ na-abụghị nke okpukpe kwuru banyere otú ịṅụ mmanya iji gọọrọ mmadụ ọfọ si malite, gịnịkwa mere Ndị Kraịst anaghị eme omenala ahụ?

19 Ịṅụ mmanya iji gọọrọ mmadụ ọfọ bụ ihe a na-emekarị n’agbamakwụkwọ nakwa n’ememme ndị ọzọ. Otu akwụkwọ e bipụtara n’afọ 1995 nke kwuru banyere mmanya na-aba n’anya na omenala kwuru, sị: “O nwere ike ịbụ na ịṅụ mmanya iji gọọrọ mmadụ ọfọ bụ ihe na-agbasaghị okpukpe. O yiri ka ò sitere n’àjà a na-achụrụ chi dị iche iche n’oge ochie, nke a na-anọ na ya atụrụ ha ihe dị nsọ n’ala . . . iji rịọ ha arịrịọ ma na-ekwu ihe ndị dị ka ‘nye anyị ogologo ndụ!’ ma ọ bụ ‘nye anyị ahụ́ ike!’”

20 N’eziokwu, o nwere ike ịbụ na ọtụtụ ndị echeghị na o nwere ihe jikọrọ ịṅụ mmanya iji gọọrọ mmadụ ọfọ na okpukpe ma ọ bụ nkwenkwe ụgha. N’agbanyeghị nke ahụ, e nwere ike ile omenala ahụ bụ́ ibuli iko mmanya elu anya dị ka arịrịọ a na-arịọ “eluigwe,” ya bụ, ndị mmụọ, iji nweta ngọzi. Otú ha si arịọ ya megidere ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru.—Jọn 14:6; 16:23. *

“UNU NDỊ HỤRỤ JEHOVA N’ANYA, KPỌỌNỤ IHE ỌJỌỌ ASỊ”

21. Olee ememme ndị a ma ama Ndị Kraịst ga-ezere n’agbanyeghị na o nwere ike ịbụ na o nweghị ihe jikọrọ ha na okpukpe, n’ihi gịnịkwa?

21 Ụfọdụ mba na-akwado ememme oriri na nkwari a na-eme kwa afọ, ya bụ, ememme ndị a na-agba egwú rụrụ arụ na ha, ndị e nwekwara ike iji na-akwado nwoke idina nwoke na nwaanyị idina nwaanyị. Ihe ndị a na-egosi na omume ọma na-anwụ n’ike n’ike n’ụwa a. Babịlọn Ukwu ahụ sikwa ụzọ dị iche iche na-akwado ya. ‘Onye hụrụ Jehova n’anya’ ò kwesịrị ịga ememme dị otú ahụ ma ọ bụ lee ya na TV? Ọ bụrụ na o mee otú ahụ, ọ̀ na-egosi na ọ kpọrọ ihe ọjọọ asị n’ezie? (Abụ Ọma 1:1, 2; 97:10) Ọ ka mma iṅomi ọbụ abụ, bụ́ onye kpere ekpere, sị: “Mee ka anya m ghara ịhụ ihe na-abaghị uru”!—Abụ Ọma 119:37.

22. Olee mgbe Onye Kraịst nwere ike iji akọnuche ya kpebie ma ọ̀ ga-eso eme ememme ma ọ bụ na ọ gaghị eso?

22 N’ụbọchị ndị ụwa na-eme ememme ha, Onye Kraịst ga-akpachapụ anya n’ihe ọ na-eme, ka ọ ghara ime ka ndị ọzọ chewe na o so na-eme ya. Pọl dere, sị: “Ma ùnu na-eri ihe ma ùnu na-aṅụ ihe ọṅụṅụ ma ùnu na-eme ihe ọ bụla ọzọ, na-emenụ ihe niile iji nye Chineke otuto.”(1 Ndị Kọrịnt 10:31; gụọ igbe dị na peeji nke 158-159, bụ́ “ Iji Amamihe Eme Mkpebi.”) Otú ọ dị, ọ bụrụ na omenala ma ọ bụ ememme enweghị ihe jikọrọ ya na okpukpe ụgha, ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ ịhụ mba n’anya, ọ bụrụkwa na o megideghị ụkpụrụ Baịbụl, Onye Kraịst nwere ike ikpebi ma ọ̀ ga-eme ya ma ọ bụ na ọ gaghị eme ya. Ọ ga-echebakwara ihe ndị ọzọ ga-ekwu echiche, ka ọ ghara ime ka ha sụọ ngọngọ.

NA-ETO CHINEKE N’OKWU ỌNỤ NAKWA N’OMUME

23, 24. Olee otú anyị nwere ike isi gbaa ezi àmà banyere ụkpụrụ ezi omume Jehova?

23 Ọtụtụ ndị na-ewere ụbọchị ndị a na-eji eme ememme ụfọdụ a ma ama dị ka oge kacha mma ha na ndị ikwu na ibe ha ga-anọrị. N’ihi ya, ọ bụrụ na mmadụ echee na mkpebi anyị mere nke dabeere na Baịbụl adịghị mma, anyị ga-emeda obi kọwaara ya na Ndịàmà Jehova anaghị eji nnọkọ dị mma nke ndị ikwu na ibe egwuri egwu. (Ilu 11:25; Ekliziastis 3:12, 13; 2 Ndị Kọrịnt 9:7) Ọ na-atọ anyị ụtọ ka anyị na ndị anyị hụrụ n’anya na-anọrị n’oge ndị ọzọ n’afọ. Ma, n’ihi ịhụnanya anyị hụrụ Chineke na ụkpụrụ ezi omume ya, anyị achọghị iji omenala ndị na-ewe ya iwe mebie nnọkọ obi ụtọ ndị dị otú ahụ.—Gụọ igbe dị na  peeji nke 156, bụ́ “Ezi Ofufe Na-eweta Ezigbo Ọṅụ.”

24 Ụfọdụ Ndịàmà enweela ihe ịga nke ọma n’iji isi nke iri na isii n’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? * zaa ajụjụ ndị nwere ezi obi jụrụ. Ma, cheta na ihe anyị bu n’obi bụ ime ka ndị mmadụ bata n’eziokwu, ọ bụghị imeri n’arụmụka. N’ihi ya, na-akwanyere ndị mmadụ ùgwù, na-adị umeala n’obi, ‘ka okwu gị dịrịkwa n’amara mgbe niile, ka ọ bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ.’—Ndị Kọlọsi 4:6.

25, 26. Olee otú ndị nne na nna ga-esi enyere ụmụ ha aka ime ka okwukwe ha sie ike, meekwa ka ha hụkwuo Jehova n’anya?

25 Ebe anyị bụ ndị ohu Jehova, a kụzierela anyị ihe nke ọma. Anyị ma ihe mere anyị ji kwere n’ihe ụfọdụ, na-emekwa ha, marakwa ihe mere anyị ji ajụ ihe ndị ọzọ. (Ndị Hibru 5:14) Ya mere, ndị nne na nna, kụzierenụ ụmụ unu ichebara ụkpụrụ Baịbụl echiche. Ọ bụrụ na unu emee otú ahụ, unu ga-eme ka okwukwe ha sie ike, nyekwara ha aka iji Akwụkwọ Nsọ zaa ndị jụrụ ha ajụjụ banyere ihe ha kweere ajụjụ ha, unu ga-emekwa ka obi sie ha ike na Jehova hụrụ ha n’anya.—Aịzaya 48:17, 18; 1 Pita 3:15.

26 Ndị niile na-efe Chineke “n’ime mmụọ na eziokwu” anaghị ezere naanị ememme ndị na-esiteghị n’Akwụkwọ Nsọ, kama ha na-agbalịsi ike ime ihe n’eziokwu n’ihe niile ha na-eme ná ndụ. Taa, ọtụtụ ndị na-ele ime ihe n’eziokwu anya dị ka ihe a na-anaghị eme eme. Ma, dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu ọzọ, ụzọ Chineke kacha mma mgbe niile.

^ par. 3 Gụọ igbe dị na  peeji nke 148-149, bụ́ “M̀ Kwesịrị Iso Mee Ememme A?” N’akwụkwọ Watch Tower Publications Index, nke Ndịàmà Jehova bipụtara, e depụtara ọtụtụ ụbọchị “nsọ” na ememme ndị a na-eme taa.

^ par. 5 Dabere n’otú e si gụkọọ oge na Baịbụl, nakwa dị ka akụkọ ihe mere eme nke ụwa si kwuo, o yiri ka à mụrụ Jizọs n’afọ 2 T.O.A. n’ọnwa ndị Juu a na-akpọ Etanim, nke dabara n’ọnwa itoolu na ọnwa iri na kalenda anyị.—Gụọ akwụkwọ Insight on the Scriptures, nke 2, peeji nke 56-57, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 11 Gụọ igbe dị na peeji nke 150, bụ́ “ Ụbọchị ‘Nsọ’ na Ofufe Setan.”

^ par. 11 Ọgbụgba ndụ Iwu ahụ kwuru na nwaanyị mụọ nwa ọhụrụ, ọ ga-achụrụ Chineke àjà mmehie. (Levitikọs 12:1-8) Iwu ahụ chetaara ndị Izrel na ụmụ mmadụ na-ebufere ụmụ ha mmehie. O mekwara ka ha nwee echiche ziri ezi banyere ọmụmụ nwa. O nwekwara ike ịbụ ya mere ha amụtaghị ime ememme ncheta ọmụmụ nke ndị na-ekpere arụsị.—Abụ Ọma 51:5.

^ par. 13 Ista bụkwa chi nwaanyị ọmụmụ. Akwụkwọ ọkọwa okwu [bụ́ The Dictionary of Mythology] kwuru na chi nwaanyị ahụ “nwere ùrúrù na-ata àkwá n’ọnwa, mgbe ụfọdụ, a na-akpụkwa ya ka o nwee isi ùrúrù.”

^ par. 18 Gụọ isiokwu atọ kwuru banyere agbamakwụkwọ na nnọkọ oriri na ọṅụṅụ n’Ụlọ Nche October 15, 2006, peeji nke 18-31.

^ par. 24 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.