Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU NDỊ ỌZỌ

Irighiri Ihe Ndị Si n’Ọbara na Otú E Si Awa Mmadụ Ahụ́

Irighiri Ihe Ndị Si n’Ọbara na Otú E Si Awa Mmadụ Ahụ́

Irighiri Ihe Ndị Si n’Ọbara. E si n’ihe anọ bụ́ isi dị n’ọbara nweta irighiri ihe ndị si n’ọbara. Ihe anọ ndị ahụ bụ mkpụrụ ndụ na-acha uhie uhie, mkpụrụ ndụ na-acha ọcha, mkpụrụ ndụ nke na-eme ka ọbara kwụsị ịgba, na mkpụrụ ndụ bụ́ mmiri dị n’ọbara. Dị ka ihe atụ, mkpụrụ ndụ na-acha uhie uhie nwere ihe na-eme ka ahụ́ na-eto eto a gwakọtara ya na ikuku ndụ. A na-eji ihe ndị e nwetara na mkpụrụ ndụ a nke si n’ahụ́ mmadụ ma ọ bụ anụmanụ agwọ ndị ọbara na-adịghị n’ahụ́ ma ọ bụ ndị ọbara gbara nnukwu.

Mkpụrụ ndụ bụ́ mmiri dị n’ọbara na-ebu mmiri ọgwụ ahụ́ a na-akpọ hormone, nnu, ihe na-agbari nri, ihe na-edozi ahụ́, na ihe ndị yiri ya. Ihe ndị ọzọ na-adị na ya bụ ihe ndị na-eme ka ọbara kwụsị ịgba, ihe ndị e ji alụso ọrịa ọgụ, na ihe ndị na-eme ka ahụ́ na-eto eto. O nwere ụdị ọrịa ọ ga-abụ mmadụ bute, ndị dọkịta asị ka a gbaa ya ọgwụ a na-akpọ gamma globulin, nke e nwetara ná mkpụrụ ndụ bụ́ mmiri dị n’ọbara, nke si n’ahụ́ ndị na-anaghị arịa ụdị ọrịa ahụ. E nwere ike iji mkpụrụ ndụ na-acha ọcha na-adị n’ọbara mepụta ọgwụ ndị a na-akpọ interferon na interleukin, bụ́ ndị a na-eji agwọ ọrịa ụfọdụ e butere na nje nakwa ọrịa kansa.

Ndị Kraịst hà kwesịrị ikweta ka e jiri irighiri ihe ọ bụla si n’ọbara gwọọ ha ọrịa? Baịbụl ekwughị ihe niile banyere ya. N’ihi ya, onye ọ bụla ga-eji akọnuche ya kpebie ihe ọ ga-eme n’ihu Chineke. Ụfọdụ ndị nwere ike ịjụ irighiri ihe niile si n’ọbara, n’ihi na iwu Chineke nyere ndị Izrel kwuru na ha ‘ga-awụpụ ọbara ọ bụla si n’ahụ́ anụ ma ọ bụ n’ahụ́ mmadụ n’ala.’ (Diuterọnọmi 12:22-24) Ndị ọzọ nwere ike ikwe ka e jiri irighiri ihe si n’ọbara gwọọ ha ọrịa, ma ha agaghị ekwe ka a mịnye ha ọbara ma ọ bụ isi ihe ndị dị n’ọbara. Obi ha nwere ike ịgwa ha na o nwere otú a ga-ekeriru irighiri ihe ndị si n’ọbara, ọ gaghị anọchikwa anya ndụ onye ahụ ọbara ahụ si n’ahụ́ ya.

Mgbe ị na-ekpebi ma à ga-eji irighiri ihe ndị si n’ọbara gwọọ gị ọrịa, jụọ onwe gị, sị: M̀ ghọtara na ọ bụrụ na achọghị m ka e jiri irighiri ihe ọ bụla si n’ọbara gwọọ m ọrịa, ọ pụtara na agaghị m anabata ọgwụ ndị nwere ihe ndị si n’ọbara, bụ́ ndị e ji alụso ọrịa ọgụ ma ọ bụ ndị na-eme ka ọbara kpụkọọ ma kwụsị ịgba? Ènwere m ike ịkọwara dọkịta m ihe mere m ji jụ ma ọ bụ kweta ka e jiri irighiri ihe ụfọdụ si n’ọbara gwọọ m ọrịa?

Otú E Si Awa Mmadụ Ahụ́. Ụfọdụ n’ime ụzọ ndị ahụ bụ ịgwa ọbara agwa na ichete ọbara. Otú e si agwa ọbara agwa bụ e wepụta ya n’ahụ́ onye ọrịa, a gbanye onye ahụ ọgwụ ndị na-eme ka ọbara mụbaa n’ahụ́ ma mechaa mịnyeghachi ya ọbara ahụ n’ahụ́. Mgbe a na-echete ọbara bụ ma a na-awa mmadụ ahụ́. E chetechaa ọbara ahụ, a zaa ya ma mịnyeghachi ya onye ahụ mgbe a wachara ya ahụ́. Ebe ọ bụ na otú ndị dọkịta si eme ihe ndị a anaghị abụ otu, Onye Kraịst kwesịrị ịjụta dọkịta ya otú ọ chọrọ isi eme ya.

Mgbe ị na-ekpebi ma ị̀ ga-ekwe ka e si ụzọ ndị ahụ waa gị ahụ́, jụọ onwe gị, sị: ‘Ọ bụrụ na a ga-eme ka ọbara m si m n’ahụ́ banye n’ígwè ọrụ, ma eleghị anya, ya anọtụ anọtụ n’ígwè ọrụ ahụ, akọnuche m ọ̀ ga-ekwe m ka m were ọbara ahụ dị ka nke nọ m n’ahụ́, nke a na-ekwesịghị ‘ịwụpụ n’ala’? (Diuterọnọmi 12:23, 24) Akọnuche m e ji Baịbụl zụọ ọ̀ ga-enye m nsogbu ma ọ bụrụ na a mịrị ọbara m n’oge a na-agwọ m, gwaa ya ọgwụ ma mịnyeghachi ya n’ahụ́ m? Ọ bụrụ na achọghị m ka e jiri ọbara m gwọọ m ọrịa n’ụdị ọ bụla, m̀ ghọtara na ọ pụtara na m gaghị ekwe ka a mịrị ọbara m gaa chọpụta ihe m na-arịa, na m gaghịkwa ekwe ka a mịpụta ya ma mechaa mịnyeghachi ya, ma ọ bụkwanụ ka e mee ka ọbara m si n’ahụ́ m na-abanye n’ígwè na-arụ ọrụ obi na akpa ume na-arụ ma mechaa banyeghachi m n’ahụ́?’

Onye Kraịst ga-ekpebi otú a ga-esi eme ọbara ya ma a na-awa ya ahụ́. Ọ ga-ekpebikwa otú a ga-esi eji ọbara ya chọpụta ihe ọ na-arịa, kpebiekwa ma à ga-amịrị ọbara ya, ma eleghị anya, gwaa ya ọgwụ ma mịnyeghachi ya n’ahụ́ ya.