Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okwu Nwoke na Nwaanyị

Okwu Nwoke na Nwaanyị

NKEBI NKE 1

Okwu Nwoke na Nwaanyị

Ọ bụrụ na ị hụ ka nwa okoro na nwa agbọghọ jidere ibe ha aka na-aga na paseeji ụlọ akwụkwọ n’oge a na-anaghị amụ ihe, olee otú ọ ga-adị gị?

□ Agaghị m achọ ịma

□ Ọ ga-adịtụ m ka m bụrụ ha

□ Ọ ga-adị m nnọọ ka m bụrụ ha

Ọ bụrụ na gị na ndị enyi gị nọ na-ele fim, gị ahụ na onye nke ọ bụla n’ime ha na enyi ya nwoke ma ọ bụ enyi ya nwaanyị nọ, ma o nweghị onye gị na ya nọ, olee otú ọ ga-adị gị?

□ Ọ gaghị agbasa m

□ Ọ ga-agbakasị m ahụ́

□ Ọ ga-adị m ka m bụrụ ha

Ọ bụrụ na ezigbo enyi gị amalite inwe mmasị n’ebe onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya nọ, ya na onye ahụ amalite ịkpa, olee otú ọ ga-adị gị?

□ Obi ga-adị m ụtọ

□ Ọ ga-adịtụ m ka m bụrụ ha

□ Ọ ga-ewe m iwe

Nwa okoro na nwa agbọghọ, nwa agbọghọ na nwa okoro. Ha nọ n’ebe ọ bụla i lere anya—n’ụlọ akwụkwọ, n’okporo ámá, n’ahịa. Mgbe ọ bụla ị hụrụ ha, inwe enyi nwoke ma ọ bụ enyi nwaanyị agụsiwe gị agụụ ike. Ma ị̀ chọwala ịlụ di ma ọ bụ nwunye? Ọ bụrụ na ị chọwala, olee otú ị ga-esi chọta onye ihe ga-adabara gị na ya? Ọ bụrụ na ị chọta, olee otú ị ga-esi mee ka unu ghara ime omume rụrụ arụ mgbe unu na-akpa? Isi nke 1 ruo nke 5 ga-enyere gị aka ịza ajụjụ ndị a.

[Foto juru ihu peeji nke 12 na nke 13]