Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Ọgwụ Ike Ma Ọ Bụ Mmanya Eriela Papa M Ma Ọ Bụ Mama M Ahụ́?

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Ọgwụ Ike Ma Ọ Bụ Mmanya Eriela Papa M Ma Ọ Bụ Mama M Ahụ́?

ISI NKE 23

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Ọgwụ Ike Ma Ọ Bụ Mmanya Eriela Papa M Ma Ọ Bụ Mama M Ahụ́?

“Papa m gwara anyị ka ya gaa rụzie ụgbọala ya, anyị echegide ya chi ejiwe, anyị ahụghị ya. Mama m akpọọ ya n’ekwe ntị, ma ọ zaghị. Ka oge gatụrụ, achọpụtara m na obi erukwaghị mama m ala, ya ejikerewe ịpụ. Ọ gwaziri m, sị: ‘Ana m aga ịchọ papa gị.’

“E mechaa, mama m lọtara—naanị ya. Ajụrụ m ya, sị: ‘Ọ̀ bụ papa m anọghị ebe ahụ?’ Ya asị m, ‘Mba.’

“Amataziri m na papa m amalitekwala aghụghọ ahụ ọ na-aghọ. Ọ bụkwa ihe o mere oge gara aga. Ihe kpatara ya bụ na ọgwụ ike eriela papa m ahụ́. Mgbe ọ lọtara, ezigbo iwe ji mụ na mama m. N’echi ya, atụpụghịrị m ya ọnụ, ihe ahụ m mere wutekwara m.”—Karen, dị afọ iri na anọ.

ỌTỤTỤ nde ndị na-eto eto na-achị obi n’aka kwa ụbọchị n’ihi na ha na-edi nsogbu papa ha ma ọ bụ mama ha ọgwụ ike ma ọ bụ mmanya riri ahụ́ na-enye ha. Ọ bụrụ na ụdị ihe ahụ eriela papa gị ma ọ bụ mama gị ahụ́, o nwere ike na-emechu gị ihu, na-eme gị obi ọjọọ ma na-akpasu gị iwe.

Dị ka ihe atụ, papa Mary na-eyi ezigbo mmadụ ma ọ pụọ n’èzí. Ma ndị mmadụ amaghị na ọ bụ onye aṅụrụma. Ọ na-agwa ndị ezinụlọ ya okwu ọjọọ ma na-emesi ha ike. Mary kwara arịrị, sị: “Ndị mmadụ na-abịa agwa anyị na anyị nwere ezigbo nna, nakwa na nke anyị ka mma.” *

Ọ bụrụ na mmanya ma ọ bụ ọgwụ ike eriela papa gị ma ọ bụ mama gị ahụ́, olee otú ị ga-esi na-edi ya?

Chọpụta Ihe Kpatara Ya

Ihe mbụ bụ na ọ bara uru ka ị ghọta nsogbu papa gị na mama gị na-enwe. Ilu 1:5 kwuru, sị: “Onye nwere nghọta na-enweta ezi ntụziaka.” N’ihi ya, ọ ga-abara gị uru ma ị mata ihe ihe iri mmadụ ahụ́ pụtara, onye mmanya ma ọ bụ ọgwụ ike na-eri ahụ́, nakwa ihe mere o ji rie ya ahụ́.

Dị ka ihe atụ, ịbụ onye aṅụrụma apụtaghị ịṅụbiga mmanya ókè mgbe ụfọdụ. Kama, onye aṅụrụma bụ onye na-aṅụ oké mmanya mgbe niile, onye ọ na-anaghịkwa ekwe nkwụsị. * Ọ bụ onye mmanya riri ahụ́, ọ naghịkwa ejideli onwe ya ma ọ ṅụwa mmanya. Mmanya riri ya ahụ́ na-akpatara ezinụlọ ya nsogbu, na-emebi ọrụ ya, na-akpatakwara ya ọrịa.

Ọ bụ eziokwu na ihe nwere ike ime ka mmanya rie ụfọdụ ndị ahụ́ bụ na o si ha n’ọbara, ihe ọzọ nwekwara ike ịbụ otú obi na-adị ha. N’eziokwu, ọtụtụ ndị aṅụrụma na-echere onwe ha echiche na-adịghị mma. (Ilu 14:13) A mụdịrị ụfọdụ n’ime ha n’ezinụlọ ebe papa na mama bụcha ndị aṅụrụma. Ụdị ndị ahụ na-aṅụ oké mmanya iji chefuo ihe ndị mere ha mgbe ha bụ ụmụaka. Ihe ndị ahụ nwekwara ike ime ka mmadụ bụrụ onye ọgwụ ike riri ahụ́.

N’ezie, mmadụ ịṅụ oké mmanya ma ọ bụ ọgwụ ike ga-eme ka nsogbu ya ka njọ; ọ na-eme ka ọ ghara iche echiche nke ọma, meekwa ka ọ ghara inwe obi mmadụ. N’ihi ya, o nwere ike ịdị mkpa ka papa gị ma ọ bụ mama gị gakwuru ndị ọkachamara ka ha nyere ya aka ịkwụsị mmanya ma ọ bụ ọgwụ ike ahụ riri ya ahụ́.

Atụla Anya Ihe Ha Na-agaghị Emeli

N’eziokwu, ịmata ihe mere papa gị ma ọ bụ mama gị ji na-akpa àgwà na-adịghị mma agaghị eme ka nsogbu ahụ kwụsị. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụrụ na ị mata ihe mere mmanya ma ọ bụ ọgwụ ike ji rie ya ahụ́, ọ ga-eme ka i metara ya ebere.

Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na papa gị ma ọ bụ mama gị gbajiri ụkwụ, ị̀ ga-atụ anya ka gị na ya gbaa bọl? Ọ́ bụrụkwanụ na ị ma na ihe mere o ji gbajie ụkwụ bụ na o zuzuru nzuzu? O doro anya na obi agaghị adị gị mma. Otú ọ dị, ị ma na ụkwụ ya agaghị ekwe ya gbaa bọl ruo mgbe ọ dịrị ya mma. Ị ghọta ya otú ahụ, ọ ga-eme ka ị ghara ịtụ anya ka o mee ihe ọ na-agaghị emeli.

N’otu aka ahụ, papa ma ọ bụ mama bụ́ onye aṅụrụma ma ọ bụ onye ọgwụ ike riri ahụ́ agaghị na-eche echiche nke ọma, isi agaghịkwa akpakọ ya ọnụ. N’eziokwu, ọ bụ onye ahụ ji aka ya kpatara onwe ya nsogbu ahụ. Nzuzu papa gị ma ọ bụ mama gị na-ezuzu kwesịrị iwe gị iwe. Otú ọ dị, papa gị ma ọ bụ mama gị agaghị enwe ike ilekọta gị nke ọma ruo mgbe a gwọrọ ya nsogbu ya. Ọ bụrụ na ị ghọta na ihe ahụ riri papa gị ma ọ bụ mama gị ahụ́ mere ka ọ dị ka onye gbajiri ụkwụ, o nwere ike ime ka ị ghara ịtụ anya ka o mee ihe ọ na-agaghị emeli.

Ihe Ị Ga-eme

Ghọta na ị ga na-edi nsogbu papa gị ma ọ bụ mama gị na-enye gị, ọ gwụla ma ọ gbanwere omume ya. Ma, olee ihe ị ga-eme ugbu a?

Echela na ọ bụ gị kpatara nsogbu ahụ. Ọ bụ papa gị ma ọ bụ mama gị kpatara nsogbu ahụ, ọ bụghị onye ọzọ. Ndị Galeshia 6:5 kwuru, sị: “Onye ọ bụla ga-ebu ibu nke ya.” Ọ bụghị gị ga-agwọ ya nsogbu ya, ọ bụghịkwanụ iwu na ị ga-eme ka ọ ghara ịta ahụhụ ga-esi n’omume ya pụta. Dị ka ihe atụ, i kwesịghị ịghara onye were ya n’ọrụ ụgha, ọ bụghịkwa iwu na ị ga-ekubata ya n’ime ụlọ ma ọ nọrọ n’ihu ụlọ na-ehi ụra mmanya.

Gwa ya ka ọ chọọ onye ga-agwọ ya. Ihe ga-akacha bụrụ nsogbu ya nwere ike ịbụ ikwetadị na ya nwere nsogbu. Ọ bụrụ na ọ bụ papa gị nwere nsogbu ahụ, mgbe anya doro ya, mama gị na ụmụnne gị ndị tọrọ gị nwere ike ịgakwuru ya, gwa ya nsogbu omume ya na-ewetara ezinụlọ unu nakwa ihe o kwesịrị ime.

Ọzọkwa, ọ ga-abara ya uru ma o dee azịza ajụjụ ndị a: Gịnị ga-eme mụ na ezinụlọ m ma ọ bụrụ na mụ akwụsịghị ịṅụ oké mmanya ma ọ bụ ọgwụ ike? Olee uru ọ ga-abara m ma m kwụsị ya? Gịnị ka m ga-eme ka e nyere m aka?

Ọ bụrụ na nsogbu chọrọ ịmalite n’ụlọ, pụọ. Ilu 17:14 kwuru, sị: “Tupu esemokwu amalite, si n’ebe ahụ pụọ.” Etinyela ọnụ n’esemokwu n’ihi na ọ ga-eme ka ị baa ná nsogbu. I nwere ike ịbanye n’ime ụlọ gị ma ọ bụ gaa n’ụlọ enyi gị. Ọ bụrụ na ọ dawa tigbuo zọgbuo, i nwere ike ịkpọ ndị mmadụ ka ha bịa nye aka.

Ekwela ka obi gị na-ama gị ikpe. Obi na-ama ụfọdụ ndị na-eto eto ikpe ma ha wesa papa ha ma ọ bụ mama ha mmanya ma ọ bụ ọgwụ ike riri ahụ́ iwe. Ọ dịghị njọ ma i wee iwe, nke ka nke, ma ọ bụrụ na omume ya mere ka ọ ghara ịhụ gị n’anya ma na-elekọta gị otú kwesịrị ekwesị. N’eziokwu, Baịbụl nyere gị iwu ka ị sọpụrụ papa gị na mama gị. (Ndị Efesọs 6:2, 3) Ma ‘ịsọpụrụ’ papa gị ma ọ bụ mama gị pụtara irubere ya isi, otú ahụ i kwesịrị irubere onye uwe oji ma ọ bụ ọkàikpe isi. Ọ pụtaghị na omume ya dị gị mma. (Ndị Rom 12:9) Ọ pụtaghịkwa na ị bụ onye ọjọọ ma ọ bụrụ na mmanya ma ọ bụ ọgwụ ike ahụ riri ya ahụ́ adịghị gị mma; a sị ka e kwuwe, ịṅụ oké mmanya na ọgwụ ike abụghị ihe ọma!—Ilu 23:29-35.

Nwee ezigbo ndị enyi. Ọ bụrụ na nsogbu na-adị n’ụlọ, o nwere ike ime ka i chefuo ihe i kwesịrị ime. N’ihi ya, o kwesịrị ekwesị ka gị na ndị uche ha kpakọrọ ọnụ nakwa ndị ha na Jehova dị ná mma na-akpa. Ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst nwere ike ịgba gị ume ma nyere gị aka, meekwa ka ahụ́ na-eru gị ala n’agbanyeghị nsogbu dị n’ezinụlọ unu. (Ilu 17:17) Ọ bụrụ na ị na-akpa ezinụlọ ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ nso, ị ga-amụta otú e kwesịrị isi na-ebi n’ezinụlọ, nke ga-eme ka ị ghara ịmụta ihe nlereanya ọjọọ ị na-ahụ n’ezinụlọ unu.

Chọọ enyemaka. Ihe ga-enyere gị aka bụ ịchọta dimkpa bụ́ ezigbo mmadụ, onye ihe na-adabara gị na ya, ị ga na-akọrọ otú obi dị gị. Ndị okenye ọgbakọ ga-enyere gị aka ma ị chọọ. Baịbụl kwuru na ha dị ka “ebe izere ifufe na ebe mgbaba iji zere oké mmiri ozuzo, dị ka mmiri iyi ndị dị n’ala mmiri na-adịghị, dị ka ndò nke oké nkume dị elu n’ala kpọrọ nkụ.” (Aịzaya 32:2) N’ihi ya, ụjọ atụla gị, emekwala ihere ịgakwuru ha ka ha kasie gị obi ma dụọ gị ọdụ.

N’ime ụzọ ihe isii e kwuru ebe a, dee nke ị ga-achọ ibu ụzọ mee. ․․․․․

O nwere ike ị gaghị akwụsịli nsogbu dị n’ụlọ unu, ma i nwere ike ime ka ọ ghara ime gị obi ọjọọ. Kama ịchọwa ka ị na-agwa papa gị ma ọ bụ mama gị ihe ọ ga-eme, gwawa onwe gị ihe ị ga-eme. Pọl onyeozi dere, sị: ‘Na-eme ihe ga-ewetara onwe gị nzọpụta.’ (Ndị Filipaị 2:12) Ime otú ahụ ga-enyere gị aka inwe olileanya, o nwekwara ike ime ka papa gị ma ọ bụ mama gị chọọ onye ga-enyere ya aka n’ihe ahụ riri ya ahụ́.

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Olee ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na papa gị na mama gị na-esekarị okwu? Olee otú ị ga-esi die obi ọjọọ ọ na-eme gị?

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 7 Ọ bụrụ na papa gị ma ọ bụ mama gị bụ́ onye aṅụrụma na-emesi gị ike, i kwesịrị ịchọ onye ga-enyere gị aka. Gwa ya onye toro eto ị tụkwasịrị obi. Ọ bụrụ na ị bụ Onyeàmà Jehova, i nwere ike ịkọrọ ya okenye ọgbakọ ma ọ bụ Onye Kraịst ọzọ tozuru okè.

^ par. 11 Onye aṅụrụma ma ọ bụ onye ọgwụ ike riri ahụ́ nwere ike ịbụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị.

AMAOKWU BAỊBỤL

Nghọta mmadụ nwere na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ.Ilu 19:11.

NDỤMỌDỤ

Kama ịkpọ papa gị ma ọ bụ mama gị asị, kpọọ ihe ọjọọ ahụ ọ na-eme asị.—Ilu 8:13; Jud 23.

Ị̀ MA NA . . . ?

N’ime Baịbụl, ‘nsọpụrụ’ nwere ike ịpụta irubere mmadụ isi n’ihi ikike e nyere ya. (Ndị Efesọs 6:1, 2) N’ihi ya, ịsọpụrụ papa gị ma ọ bụ mama gị apụtaghị na omume ya ga-adị gị mma mgbe niile.

IHE M GA-EME!

Ọ bụrụ na papa m ma ọ bụ mama m na-akpọ mmadụ iyi ma ọ bụ na-akụ mmadụ ihe, ihe m ga-eme bụ

Otú m ga-esi agwa papa m ma ọ bụ mama m ka ọ chọọ enyemaka bụ

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ

GỊNỊ KA I CHERE?

Gịnị mere mmanya ma ọ bụ ọgwụ ike ji eri ụfọdụ ndị ahụ́?

Gịnị mere o ji bụrụ na ọ bụghị gị mere ka mmanya ma ọ bụ ọgwụ ike rie papa gị ma ọ bụ mama gị ahụ́?

Olee ihe ị ga-agbanweli n’ọnọdụ gị, oleekwa otú i nwere ike isi eme ya?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 192]

“Ama m na papa m na mama m nwere ike imechu m ihu n’ọdịnihu, ma amakwa m na ọ bụrụ na mụ atụkwasị Jehova obi, ọ ga-enye m ike idi ya.”—Maxwell

Igbe dị na peeji nke 198]

Ihe Ị Ga-eme Ma Papa Gị Ma Ọ Bụ Mama Gị Kwụsị Ife Jehova

Ọ bụrụ na papa gị ma ọ bụ mama gị akwụsị ime ihe Baịbụl kwuru—ma eleghị anya, kwuodị na ya achọkwaghị ịbụ Onyeàmà Jehova—gịnị ka ị ga-eme?

Buru n’obi na Jehova agaghị ata gị ụta maka àgwà ọjọọ papa gị ma ọ bụ mama gị na-akpa. Baịbụl kwuru, sị: “Onye ọ bụla n’ime anyị ga-aza Chineke ajụjụ maka onwe ya.”Ndị Rom 14:12.

Ejikwala onwe gị na-atụnyere ndị ọzọ na-eto eto, ndị ọnọdụ ha ka nke gị mma. (Ndị Galeshia 5:26) Otu nwa okorobịa papa ya hapụrụ ezinụlọ ha kwuru, sị: “Kama ịnọ na-eche ụdị ihe ahụ, ọ ka mma iche otú ị ga-esi edi ya.”

Na-akwanyere papa ma ọ bụ mama gị ahụ na-akpa àgwà ọjọọ ùgwù. Ya sị gị mee ihe, mee ya ma ọ bụrụ na o megideghị ihe Baịbụl kwuru. Jehova nyere ụmụ iwu ka ha na-asọpụrụ papa ha na mama ha, ma papa ha ma ọ bụ mama ha ọ̀ bụ onye kwere ekwe ma ọ bụ na ọ bụghị. (Ndị Efesọs 6:1-3) Ọ bụrụ na ị na-asọpụrụ papa gị na mama gị ma na-erubere ha isi n’agbanyeghị ihe ha na-emejọ, ị na-egosi na ị hụrụ Jehova n’anya.—1 Jọn 5:3.

Ka gị na ọgbakọ Ndị Kraịst na-akpachi anya. Ọgbakọ a bụ ezinụlọ buru ibu na-efe Chineke, nke ga-eme ka ahụ́ ruo gị ala. (Mak 10:30) E nwere otu nwa okorobịa aha ya bụ David. Mgbe papa ya kwụsịrị ife Jehova, ụjọ tụrụ ya na ndị ọgbakọ ha ga na-agbara ya na ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ ha ọsọ. Ma David chọpụtara na ụjọ na-atụ ya enweghị isi na ọdụ. O kwuru, sị: “Ha emeghị anyị ka ndị a jụrụ ajụ. O mere ka o doo m anya na ọgbakọ hụrụ anyị n’anya n’ezie.”

[Foto dị na peeji nke 194]

Ị ghọta na ihe ahụ riri papa gị ma ọ bụ mama gị ahụ́ mere ka ọ dị ka onye gbajiri ụkwụ, o nwere ike ime ka ị ghara ịtụ anya ka o mee ihe ọ na-agaghị emeli