Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE IRI NA ASAA

“Iwuli Onwe Unu Elu n’Okwukwe Unu nke Kasị Nsọ”

“Iwuli Onwe Unu Elu n’Okwukwe Unu nke Kasị Nsọ”

“Site n’iwuli onwe unu elu n’okwukwe unu nke kasị nsọ, . . . nọrọnụ n’ịhụnanya Chineke.”—JUD 20, 21.

1, 2. Olee ọrụ iwu ụlọ ihe atụ ị na-arụ, gịnịkwa mere otú i si rụọ ọrụ ahụ ji dị oké mkpa?

KA E were ya na ị na-arụsi ọrụ ike n’ụlọ ị na-ewu. Ọ dịtụla anya ị malitere iwu ụlọ ahụ, ị ga-arụkwa ya ọtụtụ afọ. Ka ọ dị ugbu a, ọrụ ahụ siri ike ma na-enye obi ụtọ. Mee elu mee ala, i kpebisiri ike na ị gaghị akwụsị ya n’ihi na otú i si rụọ ya ga-emetụta ndụ gị, metụtakwa ọdịnihu gị. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụ gị bụ ụlọ ahụ ị na-ewu!

2 Jud, bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs, kwusiri okwu ike na anyị kwesịrị iwuli onwe anyị elu. Mgbe ọ gbara Ndị Kraịst ume ka ha ‘nọrọ n’ịhụnanya Chineke,’ o kwukwara ihe ga-enyere ha aka ime ya n’otu ebe ahụ, sị: “Site n’iwuli onwe unu elu n’okwukwe unu nke kasị nsọ.” (Jud 20, 21) Olee ụzọ ụfọdụ ị ga-esi ewuli onwe gị elu ma mee ka okwukwe gị sikwuo ike, nke ga-eme ka ị nọrọ n’ịhụnanya Chineke? Ka anyị leba anya n’ụzọ ihe atọ ga-eme ka i wulie okwukwe gị elu.

NA-EWUSI OKWUKWE I NWERE N’IWU EZI OMUME JEHOVA IKE

3-5. (a) Olee echiche na-ezighị ezi banyere iwu Jehova Setan chọrọ ime ka i nwee? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele iwu Chineke anya, oleekwa otú o kwesịrị isi emetụta otú anyị si ele ihe anya? Nye ihe atụ.

3 Nke mbụ bụ na anyị kwesịrị iwusi okwukwe anyị nwere n’iwu Chineke ike. Kemgbe ị mụwara akwụkwọ a, ị mụọla banyere ọtụtụ iwu ezi omume Jehova nyere. Olee otú i si ele ha anya? Setan chọrọ iduhie gị ka i chee na iwu Jehova, ụkpụrụ ya na ntụziaka ya na-eke mmadụ agbụ, na-emekpọkwa mmadụ ọnụ. O ji ụzọ aghụghọ ahụ na-arụ ala kemgbe o ji ya duhie mmadụ n’Iden. (Jenesis 3:1-6) Ọ̀ ga-eji ya duhie gị? Ọ dabeere n’otú i si ele ihe anya.

4 Dị ka ihe atụ: Ka e were ya na ị na-akpagharị n’otu ebe mara mma a na-edebe anụ ọhịa, gị ahụ otu ebe a gbachiri ogige dị elu n’ebe ahụ. Ebe ahụ a gbachiri ogige mara ezigbo mma. Na mbụ, i nwere ike ile ogige ahụ anya ọjọọ dị ka ihe gbochiri gị ịbanye n’ebe ahụ. Ma, mgbe i lebara anya n’ebe ahụ, gị ahụ ọdụm dị egwu nọ n’otu akụkụ na-achọ ihe ọ ga-eri! Mgbe ahụ ka ọ ga-edo gị anya na ihe mere e ji gbachie ebe ahụ ogige bụ ka e chebe ndị mmadụ. È nwere onye yiri anụ ọjọọ na-eri mmadụ nke na-edè gị ugbu a? Okwu Chineke dọrọ aka ná ntị, sị: “Nweenụ uche ziri ezi, na-echenụ nche. Onye mmegide unu, bụ́ Ekwensu, na-ejegharị dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa.”—1 Pita 5:8.

5 Setan yiri anụ ọjọọ na-eri mmadụ. Ebe ọ bụ na Jehova achọghị ka anyị ghọọrọ Setan anụ oriri, O nyere anyị iwu ndị ga-echebe anyị ka ajọ onye ahụ ghara iji ọtụtụ “atụmatụ aghụghọ” ya rata anyị. (Ndị Efesọs 6:11) N’ihi ya, mgbe ọ bụla anyị na-atụgharị uche n’iwu Chineke, anyị kwesịrị ile iwu ndị ahụ anya dị ka ihe gosiri na Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya. Ọ bụrụ na anyị elee iwu Chineke anya otú ahụ, ha ga-ewetara anyị ọṅụ na nchebe. Jems bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs dere, sị: “Onye na-enyocha iwu ahụ zuru okè nke na-eweta nnwere onwe, onye nọgidekwara n’ime ya, ga-enwe obi ụtọ n’ime ya eme.”—Jems 1:25.

6. Olee ụzọ kacha mma ị ga-esi eme ka okwukwe i nwere n’iwu ezi omume Chineke na ụkpụrụ ya sie ike? Nye ihe atụ.

6 Irube isi n’iwu Chineke bụ ụzọ kacha mma anyị ga-esi mee ka okwukwe anyị nwere n’ebe Onye na-enye anyị iwu nọ sie ike, meekwa ka okwukwe anyị nwere n’amamihe dị n’iwu ya sie ike. Dị ka ihe atụ, otu n’ime “iwu nke Kraịst” bụ iwu ahụ Jizọs nyere ka anyị kụziere ndị ọzọ ‘ihe niile o nyere n’iwu.’ (Ndị Galeshia 6:2; Matiu 28:19, 20) Ndị Kraịst na-ejikwa iwu ahụ e nyere ha ka ha na-ezukọta ọnụ maka ife Chineke na inwe mkpakọrịta na-ewuli elu akpọrọ ihe. (Ndị Hibru 10:24, 25) Otu n’ime iwu Chineke bụ ndụmọdụ ahụ bụ́ ka anyị si n’obi anyị na-ekpeku Jehova ekpere mgbe niile. (Matiu 6:5-8; 1 Tesalonaịka 5:17) Ka anyị na-erube isi n’iwu ndị ahụ n’ihe niile anyị na-eme, anyị ga-aghọta nke ọma na ha bụ nduzi Chineke ji ịhụnanya nye anyị. Irube isi na ha na-ewetara anyị obi ụtọ na ọṅụ nke anyị na-agaghị enweta n’ebe ọ bụla ọzọ n’ụwa a jupụtara ná nsogbu. Ka ị na-atụgharị uche n’uru i riterela n’irube isi n’iwu Chineke, ọ́ naghị eme ka okwukwe i nwere na ha sikwuo ike?

7, 8. Olee otú Okwu Chineke si eme ka obi sie ndị na-atụ ụjọ na ha agaghị edebe iwu Chineke ruo ọtụtụ afọ ike?

7 Ụfọdụ ndị na-atụ ụjọ mgbe ụfọdụ na ọ ga-esi ike idebe iwu Jehova ruo ọtụtụ afọ. Ha na-atụ ụjọ na ha nwere ike ịda iwu Chineke. Ọ bụrụ na ị na-eche otú ahụ, cheta na Jehova kwuru, sị: “Mụ onwe m, Jehova, bụ Chineke gị, Onye na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru, Onye na-eme ka i jee ije n’ụzọ i kwesịrị iso. A sị nnọọ na ị ga-aṅa ntị n’ihe m nyere n’iwu! Mgbe ahụ, udo gị ga-adị nnọọ ka osimiri, ezi omume gị ga-adịkwa ka ebili mmiri nke oké osimiri.” (Aịzaya 48:17, 18) Ọ̀ dịtụla mgbe ị kwụsịrị chee echiche banyere otú okwu ndị ahụ si agba anyị ume?

8 Ihe Jehova na-echetara anyị ebe ahụ bụ na anyị ga-erite uru ma anyị na-erubere ya isi. O kwere nkwa inye anyị ngọzi abụọ ma anyị na-eme otú ahụ. Nke mbụ bụ na udo anyị ga-adị ka osimiri, ya bụ, ọ ga-adị jụụ, ju eju, ọ gaghịkwa agwụ agwụ. Nke abụọ bụ na ezi omume anyị ga-adị ka ebili mmiri. Ọ bụrụ na ị nọ n’akụkụ osimiri, na-ele ebe ebili mmiri na-amali ma na-amada, o doro anya na ị ga-aghọta na ọ gaghị akwụsị akwụsị. Ị ma na ebili mmiri ahụ ga na-eme mgbe niile ma na-erute n’akụkụ osimiri ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Jehova kwuru na ezi omume gị ga-adị otú ahụ. Ọ bụrụ na ị na-agbalịsi ike ikwesị ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ, ọ gaghị ekwe ka ị daa! (Abụ Ọma 55:22) Ọ̀ bụ na nkwa ndị dị otú ahụ na-enye obi ụtọ anaghị eme ka okwukwe i nwere n’ebe Jehova nọ sie ike, meekwa ka ị tụkwasị iwu ezi omume ya obi?

“JISIE IKE RUO NTOZU OKÈ”

9, 10. (a) Gịnị mere ntozu okè ji bụrụ ihe mgbaru ọsọ magburu onwe ya Ndị Kraịst kwesịrị iru? (b) Olee otú ime ihe mmụọ nsọ chọrọ si eme ka anyị nweta ọṅụ?

9 A kọwara ihe nke abụọ ga-enyere gị aka iwuli okwukwe gị elu n’okwu ndị a e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́: “Ka anyị jisie ike ruo ntozu okè.” (Ndị Hibru 6:1) Ntozu okè bụ ihe mgbaru ọsọ magburu onwe ya Onye Kraịst kwesịrị iru. Ntozu okè adịghị ka izu okè nke ndị mmadụ na-enweghị ike iru ugbu a, kama ọ bụ ihe mgbaru ọsọ anyị nwere ike iru ugbu a. Ihe ọzọ bụ na Ndị Kraịst na-enwekwu ọṅụ n’ijere Jehova ozi ka ha na-eru ntozu okè. N’ihi gịnị?

10 Onye Kraịst tozuru okè bụ onye ji mmekọrịta ya na Chineke kpọrọ ihe. Ọ na-ele ihe anya otú Jehova si ele ya anya. (Jọn 4:23) Pọl dere, sị: “Ndị na-eme ihe anụ ahụ́ chọrọ na-atụkwasị uche ha n’ihe anụ ahụ́, ma ndị na-eme ihe mmụọ nsọ chọrọ na-atụkwasị uche ha n’ihe mmụọ nsọ.” (Ndị Rom 8:5) Ime ihe anụ ahụ́ chọrọ anaghị eweta ọṅụ, n’ihi na ọ na-achọ naanị ọdịmma onwe ya, ọ naghị elepụ anya n’ihu, ọ na-elekwasị anya n’akụnụba. Ime ihe mmụọ nsọ chọrọ na-eweta ọṅụ, n’ihi na o lekwasịrị anya n’ebe Jehova nọ, bụ́ ‘Chineke onye obi ụtọ.’ (1 Timoti 1:11) Onye ji mmekọrịta ya na Chineke kpọrọ ihe na-adị njikere ime ihe dị Jehova mma, na-aṅụrịkwa ọṅụ mgbe ọnwụnwa bịara. N’ihi gịnị? Ọnwụnwa na-enye anyị ohere igosi na Setan bụ onye ụgha. Ọ na-eme ka anyị mụta ikwesị ntụkwasị obi, na-emekwa ka obi tọọ Nna anyị nke eluigwe ụtọ.—Ilu 27:11; Jems 1:2, 3.

11, 12. (a) Gịnị ka Pọl kwuru banyere “ikike nghọta” nke Onye Kraịst, gịnịkwa ka okwu e si sụgharịta ‘ọzụzụ’ pụtara? (b) Olee otú a ga-esi azụ ahụ́ mmadụ ka o nwee ike ime egwuregwu mmega ahụ́?

11 Onye chọrọ iji ofufe Chineke kpọrọ ihe ma bụrụ onye tozuru okè ga-azụ onwe ya azụ. Chee echiche ihe amaokwu Baịbụl a kwuru: “Nri siri ike dịịrị ndị tozuru okè, ndị zụworo ikike nghọta ha azụ, site n’iji ya eme ihe, ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.” (Ndị Hibru 5:14) Mgbe Pọl kwuru na anyị ‘ga-azụ ikike nghọta anyị azụ,’ o yiri ka okwu Grik o ji dee ya ọ̀ bụ okwu ndị Grik na-ekwukarị na narị afọ mbụ mgbe ha na-eme egwuregwu mmega ahụ́, n’ihi na e nwere ike ikwu na okwu ahụ pụtara ‘inweta ọzụzụ dị ka onye na-eme egwuregwu mmega ahụ́.’ Ugbu a, chee echiche banyere ihe ọzụzụ dị otú ahụ pụtara.

Onye na-eme egwuregwu mmega ahụ́ na-amụ ya amụ

12 Mgbe a mụrụ anyị, a zụghị ahụ́ anyị azụ. Dị ka ihe atụ, nwa ọhụrụ enweghị ike idebe aka ya na ụkwụ ya otu ebe. N’ihi ya, ọ na-agba ụkwụ ya na aka ya lịka lịka, ọbụna kụọ onwe ya aka n’ihu, ya ewute ya ma ju ya anya. Ka ọ na-agba lịka lịka, ọ na-azụ ahụ́ ya nwayọọ nwayọọ. Nwatakịrị ahụ na-amụta igbe igbe, ịga ije, na ịgba ọsọ. * Gịnịkwanụ banyere onye na-eme egwuregwu mmega ahụ́? Mgbe ị hụrụ ya ka o ji obi ụtọ na-efeli elu ma na-atụgharị n’elu n’adaghị ada, ọ ga-edo gị anya na ọ zụrụ ahụ́ ya azụ ruo ọtụtụ afọ ka o nwee ike ime ya. Onye ahụ anọkataghị malite ime egwuregwu mmega ahụ́. Ịmụta ya were ya ọtụtụ awa. Baịbụl kwuru na ọzụzụ nke ahụ́ dị otú ahụ “bara ntakịrị uru.” Ịzụ ikike nghọta anyị azụ n’ofufe anyị na-efe Chineke bara uru karịa—1 Timoti 4:8.

13. Olee otú anyị ga-esi azụ ikike nghọta anyị azụ?

13 N’akwụkwọ a, anyị atụleela ọtụtụ ihe ga-enyere gị aka ịzụ ikike nghọta gị azụ, nke ga-eme ka ị na-ekwesị ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ dị ka onye ji mmekọrịta gị na ya kpọrọ ihe. Chebara ụkpụrụ Chineke na iwu ya echiche ma kpee ekpere banyere ya mgbe ị na-eme mkpebi n’ihe ndị ị na-eme n’ụbọchị. Ná mkpebi niile ị chọrọ ime, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee iwu na ụkpụrụ Baịbụl ndị metụtara okwu a? Olee otú m ga-esi eme ha eme? Olee ihe m ga-eme ka obi tọọ Nna m nke eluigwe ụtọ?’ (Ilu 3:5, 6; Jems 1:5) Mkpebi ọ bụla i si otú ahụ mee ga-eme ka ị zụkwuo ikike nghọta gị azụ. Ọzụzụ dị otú ahụ ga-enyere gị aka ịghọ onye ji mmekọrịta ya na Chineke kpọrọ ihe mgbe niile.

14. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ito eto n’ụzọ ime mmụọ, gịnị kwesịrị ịna-agụ anyị agụụ, ma olee ịdọ aka ná ntị anyị kwesịrị iburu n’obi?

14 Ọ bụ ezie na mmadụ nwere ike iru ntozu okè, ito eto n’ụzọ ime mmụọ anaghị akwụsị akwụsị. Ọ bụ nri na-eme ka mmadụ na-eto eto. Ọ bụ ya mere Pọl ji kwuo, sị: “Nri siri ike dịịrị ndị tozuru okè.” Ihe dị mkpa ga-enyere gị aka iwuli okwukwe gị elu bụ iri nri ime mmụọ siri ike mgbe niile. Ka ị na-eme ihe ị na-amụta eme n’ụzọ ziri ezi, nke ahụ bụ amamihe, Baịbụl kwukwara, sị: “Amamihe bụ isi.” N’ihi ya, eziokwu magburu onwe ya nke Nna anyị na-enye anyị kwesịrị ịna-agụ anyị ezigbo agụụ. (Ilu 4:5-7; 1 Pita 2:2) N’ezie, inweta ihe ọmụma Chineke na amamihe ya ekwesịghị ime ka anyị dịrị mpako ma ọ bụ na-afụli onwe anyị elu. Anyị kwesịrị ịna-enyocha onwe anyị mgbe niile ka mpako ma ọ bụ àgwà ọjọọ ọzọ ghara ịbata n’obi anyị ma gbanye mgbọrọgwụ. Pọl dere, sị: “Na-anwalenụ ma ùnu nọ n’okwukwe ahụ, na-anwapụtanụ ihe unu onwe unu bụ.”—2 Ndị Kọrịnt 13:5.

15. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ito eto n’ụzọ ime mmụọ, gịnị mere ịhụnanya ji dị mkpa?

15 E nwere ike iwucha ụlọ ma na-arụ ọrụ ndị ọzọ n’ime ya. Ilekọta ya na ịrụzi ya dị mkpa. E nwekwara ike ịgbakwụnye ọnụ ụlọ ndị ọzọ na ya ma ọ́ dị mkpa. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ itozu okè ma bụrụ ndị ji mmekọrịta ha na Chineke kpọrọ ihe mgbe niile? Ihe mbụ bụ ịhụnanya. Anyị kwesịrị ịna-ahụkwu Jehova na Ndị Kraịst ibe anyị n’anya. Ọ bụrụ na anyị enweghị ịhụnanya, amamihe anyị niile na ihe niile anyị na-eme ga-abụ ihe efu—dị ka ihe na-eme ụzụ na-enweghị isi na ọdụ. (1 Ndị Kọrịnt 13:1-3) Ọ bụrụ na anyị nwere ịhụnanya, anyị ga-aghọ Ndị Kraịst tozuru okè ma na-eto eto n’ụzọ ime mmụọ.

TỤKWASỊ UCHE N’OLILEANYA JEHOVA NYERE ANYỊ

16. Olee ụdị echiche Setan na-eme ka ndị mmadụ nwee, oleekwa ihe Jehova nyere anyị nke ga-echebe anyị?

16 Ka anyị leba anya n’otu ihe ọzọ dị mkpa n’ọrụ iwu ụlọ ihe atụ ahụ ị na-arụ. Ọ bụrụ na ị chọrọ iwuli onwe gị elu dị ka ezi onye na-eso ụzọ Kraịst, i kwesịrị ịkpachara anya n’otú i si eche echiche. Ọ bụ Setan na-achị ụwa a. Ọ bụ aka ochie n’ime ka ndị mmadụ na-eche echiche ọjọọ, ghara inwe olileanya, na-enyo ndị ọzọ enyo ma bụrụ ndị ike ụwa gwụrụ. (Ndị Efesọs 2:2) Echiche dị otú ahụ na-emebi okwukwe Onye Kraịst otú ahụ ụtụ si emebi ụlọ e ji osisi wuo. Obi dị anyị ụtọ na Jehova nyere anyị ihe dị mkpa ga-echebe anyị, ya bụ, olileanya.

17. Olee otú Okwu Chineke si gosi na olileanya dị mkpa?

17 Baịbụl kwuru ihe dị iche iche so n’ihe agha ime mmụọ ndị anyị kwesịrị iji na-alụso Setan na ụwa a ọgụ. Otu n’ime ihe agha ahụ dị mkpa bụ okpu agha, ya bụ, “olileanya nke nzọpụta.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:8) N’oge Baịbụl, onye agha ma na ya nwere ike ịnwụ n’agha ma ọ bụrụ na o kpughị okpu agha. Ihe a na-ejikarị arụ okpu agha bụ ígwè a rụnyere n’ákwà siri ike ma ọ bụ n’akpụkpọ anụ. Ọ na-eme ka ihe ọ bụla a kụrụ onye kpu ya n’isi dapụ n’emerụghị ya ezigbo ahụ́. Olileanya ga-echebe echiche gị, otú ahụ okpu agha na-esi echebe isi mmadụ.

18, 19. Olee ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ n’inwe olileanya, oleekwa otú anyị ga-esi eṅomi ya?

18 Jizọs setịpụrụ ihe nlereanya bụ́ isi n’inwe olileanya. Cheta ihe o diri n’abalị ikpeazụ ọ dịrị ndụ n’ụwa. Ezigbo enyi ya raara ya nye n’ihi akpịrị ego. Enyi ya nke ọzọ gọnahụrụ ya. Ndị ọzọ hapụrụ ya gbaa ọsọ. Ndị obodo ya jụrụ ya, na-eti mkpu ka ndị agha Rom taa ya ahụhụ ma gbuo ya. O doro anya na a nwara Jizọs ọnwụnwa karịrị ọnwụnwa ọ bụla a ga-anwa anyị. Gịnị nyeere ya aka? Ndị Hibru 12:2 zara, sị: “N’ihi ọṅụ e debere n’ihu ya, o diri osisi ịta ahụhụ, leghara ihere anya, ọ nọdụwokwa ala n’aka nri nke ocheeze Chineke.” Ọ dịghị mgbe Jizọs chefuru “ọṅụ e debere n’ihu ya.”

19 Olee ọṅụ e debere n’ihu Jizọs? Ọ ma na ọ bụrụ na ya atachie obi, na ya ga-eso mee ka e doo aha nsọ Jehova nsọ. Ọ ga-eme ka e nwee ihe ga-akacha egosi na Setan bụ onye ụgha. Ọ dịghị olileanya ọzọ nwere ike inye Jizọs ọṅụ ka nke ahụ! Ọ makwa na Jehova ga-agọzi ya nke ukwuu n’ihi ikwesị ntụkwasị obi, ya bụ, na obi ga-atọ ya ụtọ n’oge na-adịghị anya mgbe ọ ga-alakwuru Nna ya. Jizọs bu olileanya ahụ na-enye ọṅụ n’obi n’oge niile ahụ ọ hụsiri anya. Anyị kwesịkwara ime otú ahụ. Anyị nwekwara ọṅụ e debere n’ihu anyị. Jehova kwanyeere onye ọ bụla n’ime anyị ùgwù n’ihi na o mere ka anyị nwee ihe ùgwù iso mee ka e doo aha ukwu ya nsọ. Anyị nwere ike igosi na Setan bụ onye ụgha ma ọ bụrụ na anyị ahọrọ Jehova dị ka Ọkaakaa ma nọrọ n’ịhụnanya Nna anyị n’agbanyeghị ule na ọnwụnwa ndị nwere ike ịbịara anyị.

20. Gịnị ga-enyere gị aka ịna-eche echiche ziri ezi ma na-enwe olileanya?

20 Ọ bụghị naanị na Jehova chọrọ ịkwụ ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi ụgwọ, kama, ime otú ahụ na-agụsi ya agụụ ike. (Aịzaya 30:18; Malakaị 3:10) Ọ na-atọ ya ụtọ inye ndị ohu ya ihe ziri ezi nke na-agụ obi ha agụụ. (Abụ Ọma 37:4) N’ihi ya, ka obi gị dịsie ike n’olileanya ahụ e debere n’ihu gị. Jụ echiche ọjọọ nke ụwa ochie Setan, nke bụ́ echiche rụrụ arụ ma gbagọọ agbagọ. Ọ bụrụ na ị chọpụta na mmụọ nke ụwa a abatawala n’uche gị ma ọ bụ n’obi gị, kpekusie Jehova ekpere ike ka o nye gị “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile.” Udo ahụ Chineke na-enye ga-eche obi gị na ike iche echiche gị nche.—Ndị Filipaị 4:6, 7.

21, 22. (a) Olee olileanya magburu onwe ya na-atọ “oké ìgwè mmadụ” ahụ ụtọ? (b) Olee ihe kacha atọ gị ụtọ n’olileanya Ndị Kraịst, gịnịkwa ka i kpebisiri ike ime?

21 Nke ahụ bụ olileanya magburu onwe ya i kwesịrị ịna-atụgharị n’uche! Ọ bụrụ na i so ‘n’oké ìgwè mmadụ’ ndị ‘ga-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta,’ chee echiche banyere ụdị ndụ ị ga-enweta n’oge na-adịghị anya. (Mkpughe 7:9, 14) O nwere ike isiri gị ike ugbu a ịghọta ụdị obi iru ala ị ga-enwe mgbe Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-anọkwaghị. A sị ka e kwuwe, ọ̀ dị onye n’ime anyị ụwa Setan a rụrụ arụ na-enyebeghị nsogbu? Mgbe nsogbu ahụ lara, ọ ga-abụ ihe ọṅụ ịrụ ọrụ ka ụwa ghọọ paradaịs mgbe Jizọs na otu narị puku na iri puku anọ na puku anọ, bụ́ ndị ga-eso ya chịa n’eluigwe, ga na-eduzi ụmụ mmadụ! Obi na-atọ anyị ezigbo ụtọ ugbu a ma anyị cheta na a ga-ewepụ ọrịa na nkwarụ niile, na anyị ga-anabata ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ, na anyị ga-ebi ndụ otú Chineke chọrọ ka anyị na-ebi ndụ! Ka anyị na-eru izu okè, anyị ga-enweta ọbụna ngọzi ka nke ahụ, ya bụ, nkwa ahụ e kwere ná Ndị Rom 8:21, nke bụ́ “nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.”

22 Jehova chọrọ ka i nwere onwe gị karịa otú ọ bụla i nwere ike ichetụdị n’echiche. Ihe ga-eme ka i nweta nnwere onwe ahụ bụ irube isi. Ọ̀ bụ na nke ahụ ekwesịghị ime ka ị gbalịsie ike ugbu a irubere Jehova isi kwa ụbọchị? N’ihi ya, na-ewuli onwe gị elu n’okwukwe gị nke kasị nsọ, ka ị nọrọ n’ịhụnanya Chineke ruo mgbe niile ebighị ebi!

^ par. 12 Ndị ọkà mmụta sayensị kwuru na anyị nwere ike inye ahụ́ anyị ọzụzụ, mụtakwa otú anyị ga-esi na-atụkwasị aka anyị na ụkwụ anyị n’ihe. Dị ka ihe atụ, ọ na-eme ka anyị nwee ike ịkụ aka ọbụna mgbe anyị mechiri anya. Otu nwaanyị ọrịa kụrụ gwoo gwoo enweghịzi ike iguzo ọtọ, ịga ije ma ọ bụ ịnọrọ ọdụ.