Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị M Ga-eṅomi—Ndị Hibru Atọ

Ndị M Ga-eṅomi—Ndị Hibru Atọ

Ndị M Ga-eṅomi—Ndị Hibru Atọ

Hananaya, Mishel, na Azaraya guzo na mbara ala Dura, dị nso na Babịlọn. Ndị niile nọ ha gburugburu kpọọrọ otu nnukwu ihe a kpụrụ akpụ isiala. N’agbanyeghị nsogbu ndị nọ ebe ahụ na-enye ha, nakwa egwu eze na-eyi ha, ụmụ okorobịa ahụ ekweghị akpọ isiala. Ha kwanyeere Nebukadneza ùgwù ma gwa ya hoo haa na ha agaghị agbanweli mkpebi ha mere ife Jehova.—Daniel 1:6; 3:17, 18.

Mgbe a dọọrọ ụmụ okorobịa ahụ n’agha laa Babịlọn, ha ka na-eto eto. Ha kwesịrị ntụkwasị obi mgbe ahụ. Ha ekweghị eri nri o nwere ike ịbụ na Iwu Chineke sịrị ha erila. Nke ahụ mere ka ha jikere ejikere maka ọnwụnwa ndị e mechara nwaa ha. (Daniel 1:6-20) Ihe ihe ahụ merenụ kụziiri ha bụ na irubere Jehova isi bụ ihe mmadụ kwesịrị ime. Ì kpebiela otú ahụ na ị ga-akwụsi ike n’ụkpụrụ Chineke n’agbanyeghị nsogbu ndị ọgbọ gị ga-enye gị? Ugbu a ị ka na-eto eto, ọ bụrụ na ị mụta irubere Jehova isi n’ihe yiri obere ihe, ọ ga-eme ka i jikere ejikere ikwesị ntụkwasị obi mgbe ọnwụnwa ndị siri ike ga-emecha bịara gị.—Ilu 3:5, 6; Luk 16:10.