Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye M Ga-eṅomi—Nwaanyị Di Ya Nwụrụ nke Dara Ogbenye

Onye M Ga-eṅomi—Nwaanyị Di Ya Nwụrụ nke Dara Ogbenye

Onye M Ga-eṅomi—Nwaanyị Di Ya Nwụrụ nke Dara Ogbenye

Jizọs nọ na-ele ndị ọgaranya ka ha na-atụnye onyinye ha n’igbe onyinye dị n’ụlọ nsọ. N’ime ndị nọ ebe ahụ, ọ hụrụ otu nwaanyị di ya nwụrụ nke dara ogbenye ka ọ na-atụnye “obere mkpụrụ ego abụọ nke ga-azụtali ihe dị nnọọ nta.” (Luk 21:2) Jizọs jara ya mma maka imesapụ aka. N’ihi gịnị? N’ihi na ndị ọzọ nyere onyinye ha “site n’ọtụtụ ihe ha nwere, ma nwaanyị a tụnyere ihe niile o nwere, ihe dum o ji biri, n’agbanyeghị na ọ nọ n’ụkọ.”—Mak 12:44.

Ọ̀ bụ ihe dị nwaanyị ahụ mkpa dị gị mkpa? Ì nwere ike iji oge gị na ego gị jeere Chineke ozi? Dị ka nwaanyị ahụ dara ogbenye, i nwere ike inye onyinye a ga-eji na-arụzi ebe a na-anọ efe Chineke. I nwekwara ike iji oge gị na ego gị nyere ndị ọzọ aka ịmụta onye Jehova Chineke bụ. Jehova hụrụ obere ego ahụ nwaanyị ahụ di ya nwụrụ nyere ka e jiri jeere ya ozi, ọ tọkwara ya ụtọ. Obi ga-atọkwa Chineke ụtọ ma ọ bụrụ na ihe ka gị mkpa bụ ime ihe ọ na-achọ, ọ ga-enyekwara gị aka.—Matiu 6:33.