Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE IRI NA ABỤỌ

Ha “Na-ekwu Okwu n’Atụghị Egwu Site n’Ikike Jehova”

Ha “Na-ekwu Okwu n’Atụghị Egwu Site n’Ikike Jehova”

Pọl na Banabas dị obi umeala, tachie obi, ha atụghịkwa egwu

O si n’Ọrụ Ndịozi 14:1-28

1, 2. Olee ihe ndị mere mgbe Pọl na Banabas nọ na Listra?

ỌGBA aghara nọ na-arị ibe ya elu na Listra. Otu nwoke bụ́ onye ngwọrọ site n’afọ nne ya nọ na-awụli elu mgbe mmadụ abụọ ọ na-amaghị ndị ha bụ gwọchara ya. O juru ìgwè mmadụ gbakọtara ebe ahụ anya, ha echee na ndị ikom abụọ ahụ bụ chi. N’ihi ya, onye nchụàjà wetaara ha ihe ịchọ mma a na-eke n’isi. Ụfọdụ oké ehi nọ na-ebe ubé ka onye nchụàjà Zus na-ejikere igbu ha. Pọl na Banabas tisiri mkpu ike na ha achọghị ụdị ihe ahụ. Ha dọwara uwe ha, maba n’etiti ìgwè mmadụ ahụ, na-arịọ ha ka ha ghara ife ha ofufe. O siri ike tupu ha emee ka ìgwè mmadụ ahụ gbanwee obi ha.

2 Mgbe e mechara, ndị Juu bụ́ ndị mmegide si n’Antiọk nke Pisidia nakwa n’Aịkoniọm bịa. Ha ji obi ọjọọ kwutọọ Pọl na Banabas ma mebie obi ndị Listra. Ìgwè mmadụ ndị chọburu ife Pọl gbaziri ya gburugburu, tụgide ya nkume ruo mgbe ọ tụbọrọ. Mgbe ha nyụchara Pọl ịkpakwụ, ha dọkpụụrụ ya gaa n’azụ obodo ma hapụ ya ebe ahụ, chee na ọ nwụọla.

3. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

3 Gịnị mere ụdị ihe ahụ ji mee? Olee ihe ndị na-ekwusa ozi ọma n’oge anyị a kwesịrị ịmụta n’ihe ahụ a kọrọ banyere Banabas, Pọl, na ndị bi na Listra, bụ́ ndị gbanwere obi ha n’egbughị oge? Oleekwa otú ndị okenye ọgbakọ ga-esi eṅomi ihe nlereanya Banabas na Pọl, bụ́ ndị nọsiri ike n’ozi ha, “na-ekwu okwu n’atụghị egwu site n’ikike Jehova”?—Ọrụ 14:3.

‘Ìgwè Mmadụ Dị Ukwuu Ghọrọ Ndị Kwere Ekwe’ (Ọrụ 14:1-7)

4, 5. Gịnị mere Pọl na Banabas ji gaa Aịkoniọm, gịnịkwa mere n’ebe ahụ?

4 N’ụbọchị ole na ole gara aga, a chụpụrụ Pọl na Banabas n’obodo ndị Rom bụ́ Antiọk nke Pisidia mgbe ndị Juu bụ́ ndị mmegide kpataara ha nsogbu. Otú ọ dị, kama ịda mbà, ha abụọ ‘tichapụụrụ ndị obodo ahụ kpọchiri ntị ájá dị ha n’ụkwụ.’ (Ọrụ 13:50-52; Mat. 10:14) Pọl na Banabas si ebe ahụ pụọrọ onwe ha ma hapụ ndị ahụ bụ́ ekwe ekwe ka ha chee aka ghọrọ ihe Chineke ga-eme ha. (Ọrụ 18:5, 6; 20:26) Ndị ozi ala ọzọ abụọ ahụ ekweghị ka ihe ahụ merenụ mebie ha obi; ha kwusaara ozi ọma na-aga, jiri ụkwụ gaa ihe dị ka otu narị kilomita na iri ise n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ. Ha rutere n’otu ala dị larịị nke dị n’agbata ugwu Taurus na ugwu Sultan.

5 Pọl na Banabas bu ụzọ kwụsịtụ n’Aịkoniọm, bụ́ ebe a ka na-eme omenala ndị Grik n’oge ahụ, nke bụkwa otu n’ime obodo ndị dị mkpa na Galeshia, bụ́ ebe ndị Rom chịrị. * Ndị Juu a ma ama na ọtụtụ ndị ha tọghatara atọghata na-abụghị ndị Juu bi n’obodo ahụ. Dị ka Pọl na Banabas na-emekarị, ha banyere n’ụlọ nzukọ ma malite ikwusa ozi ọma. (Ọrụ 13:5, 14) Otú ha si kwuo okwu “mere ka ìgwè mmadụ dị ukwuu nke gụnyere ndị Juu na ndị Grik ghọọ ndị kwere ekwe.”—Ọrụ 14:1.

6. Gịnị mere Pọl na Banabas ji kụzie ihe ruru ndị mmadụ n’obi, oleekwa otú anyị ga-esi eṅomi ha?

6 Gịnị mere ihe Pọl na Banabas kwuru ji ruo ndị mmadụ n’obi? Pọl ma Akwụkwọ Nsọ nke ọma. O ji nkà were ihe e kwuru n’akụkọ ihe mere eme, n’Iwu Mozis nakwa ihe e buru n’amụma mee ka o doo anya na Jizọs bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa. (Ọrụ 13:15-31; 26:22, 23) Otú Banabas si kwuo okwu gosiri na ihe banyere ndị mmadụ na-emetụ ya n’obi. (Ọrụ 4:36, 37; 9:27; 11:23, 24) Ọ dịghị onye n’ime ha kwuru okwu n’amamihe nke ya, kama ha kwuru okwu “site n’ikike Jehova.” Olee otú ị ga-esi eṅomi ndị ozi ala ọzọ ahụ mgbe ị na-ekwusa ozi ọma? Otú ị ga-esi eṅomi ha bụ: Mata Okwu Chineke nke ọma. Họrọ amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị ọ dị gị ka hà ga-akacha amasị ndị ị na-agwa okwu. Chọọ ụzọ ndị bara uru ị ga-esi akasi ndị ị na-ezi ozi ọma obi. Na-akụzi ihe si n’Okwu Jehova, ọ bụghị ihe i chepụtara n’onwe gị.

7. (a) Olee ihe ndị mmadụ na-eme mgbe ha nụrụ ozi ọma? (b) Ọ bụrụ na ezinụlọ unu kewara ekewa n’ihi na ị na-eme ihe e ziri gị n’ozi ọma, gịnị ka i kwesịrị icheta?

7 Otú ọ dị, ọ bụghị ndị niile nọ n’Aịkoniọm nwere obi ụtọ mgbe ha nụrụ ihe Pọl na Banabas kwuru. Luk gara n’ihu ịkọ, sị: “Ndị Juu na-ekweghị ekwe kpasuru ndị mba ọzọ ma mee ka ha nwee obi ọjọọ n’ebe ụmụnna nọ.” Pọl na Banabas matara na ha kwesịrị ịnọtụ ebe ahụ ma na-ekwusa ozi ọma. Ha “nọtụrụ ogologo oge na-ekwu okwu n’atụghị egwu.” N’ihi ya, “ìgwè mmadụ nọ n’obodo ahụ kewara abụọ, ụfọdụ dịnyeere ndị Juu ma ndị ọzọ dịnyeere ndịozi ahụ.” (Ọrụ 14:2-4) Taa, ndị mmadụ na-eme ụdị ihe ahụ mgbe e ziri ha ozi ọma. Ọ na-eme ka ụfọdụ ndị dị n’otu, ma kpatara ndị ọzọ nkewa. (Mat. 10:34-36) Ọ bụrụ na ezinụlọ unu kewara ekewa n’ihi na ị na-eme ihe e ziri gị n’ozi ọma, cheta na ihe na-akpatakarị mmegide bụ asịrị na-enweghị isi na ọdụ ma ọ bụ nkwutọ doro anya. Omume ọma gị nwere ike ime ka a mata na asịrị ahụ niile abụghị eziokwu. O nwekwara ike ime ka obi jụrụ ndị ahụ na-emegide gị.—1 Pita 2:12; 3:1, 2.

8. Gịnị mere Pọl na Banabas ji hapụ Aịkoniọm, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ịmụta n’ihe nlereanya ha?

8 Mgbe ndị mmegide nọ n’Aịkoniọm nọtụrụ ntakịrị, ha gbara izu ịtụ Pọl na Banabas nkume. Mgbe ndị ozi ala ọzọ abụọ ahụ matara, ha gawara ikwusa ozi ọma n’ebe ọzọ. (Ọrụ 14:5-7) Ndị nkwusa Alaeze na-eji ụdị akọ ahụ eje ozi ha taa. Mgbe ndị mmadụ gwara anyị okwu ọjọọ, anyị na-ekwu okwu n’atụghị egwu. (Fil. 1:7; 1 Pita 3:13-15) Ma mgbe a gwara anyị na a ga-emesi anyị ike, anyị ekwesịghị ime ka ànyị bụ anwụ anwụ, nke nwere ike itinye ndụ anyị ma ọ bụ ndụ ụmụnna anyị n’ihe ize ndụ.—Ilu 22:3.

“Bịakwute Chineke ahụ Dị Ndụ” (Ọrụ 14:8-19)

9, 10. Olee ebe obodo Listra dị, oleekwa ihe anyị ma banyere ndị bi na ya?

9 Pọl na Banabas gara Listra, nke bụ́ obodo ndị Rom chịrị. Ọ dị ihe dị ka iri kilomita atọ n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ Aịkoniọm. Listra na Antiọk nke Pisidia dị n’ezigbo mma, ma ndị Juu a ma ama ebighị na Listra otú ha bi n’Antiọk. N’agbanyeghị na o yiri ka ndị bi n’obodo ahụ hà na-asụ Grik, ihe bụ́ ezigbo asụsụ ha bụ Likeonia. Pọl na Banabas malitere ikwusa ozi ọma n’ebe ọhaneze na-anọ, ma eleghị anya, n’ihi na e nweghị ụlọ nzukọ ndị Juu n’obodo ahụ. Mgbe Pita nọ na Jeruselem, ọ gwọrọ otu nwoke nwere nkwarụ site n’afọ nne ya. Na Listra, Pọl gwọrọ otu nwoke dara ngwọrọ site n’afọ nne ya. (Ọrụ 14:8-10) Ọrụ ebube ahụ Pita rụrụ mere ka oké ìgwè mmadụ ghọọ ndị kwere ekwe. (Ọrụ 3:1-10) Nke Pọl rụrụ emetụdịghị ka ndị mmadụ mee otú ahụ.

10 Dị ka e kwuru ná mmalite isiokwu a, mgbe onye ngwọrọ ahụ maliri elu ma gawa ije, ìgwè mmadụ ahụ na-ekpere arụsị na Listra malitere iche ihe na-adịghị mma ozugbo. Ha kpọrọ Banabas Zus, nke bụ́ chi ha kacha elu, kpọọkwa Pọl Hemis, ya bụ, chi ha nke bụ́ nwa Zus na ọnụ na-ekwuchitere chi ha ndị ọzọ. (Gụọ igbe dị na peeji nke 97, bụ́ “ Listra na Ife Zus na Hemis Ofufe.”) Otú ọ dị, Banabas na Pọl kpebisiri ike ime ka ìgwè mmadụ ahụ ghọta na ọ bụghị arụsị nyere ha ike ha ji kwuo okwu ma rụọ ọrụ, kama ọ bụ Jehova, onye naanị ya bụ ezi Chineke.—Ọrụ 14:11-14.

‘Hapụnụ ihe efu ndị a ma bịakwute Chineke ahụ dị ndụ, onye kere eluigwe na ụwa.’—Ọrụ 14:15

11-13. (a) Gịnị ka Pọl na Banabas gwara ndị bi na Listra? (b) Olee otu ihe anyị kwesịrị ịmụta n’ihe ahụ Pọl na Banabas kwuru?

11 N’agbanyeghị ihe ijuanya ndị ahụ merenụ, Pọl na Banabas gbalịsiri ike ịchọta ụzọ kacha mma ha ga-esi kwuo okwu ga-eru ndị ha na-agwa okwu n’obi. Luk dere ụzọ kwesịrị ekwesị e si zie ndị na-ekpere arụsị ozi ọma. Buru n’obi otú Pọl na Banabas si gbalịa ikwu okwu ga-eru ndị ha na-agwa okwu n’obi. Ha sịrị: “Gịnị mere unu ji eme ihe ndị a? Anyị onwe anyị kwa bụ mmadụ ndị nwere otu ụdị adịghị ike ndị unu nwere, anyị na-ezisara unu ozi ọma, ka unu wee hapụ ihe efu ndị a ma bịakwute Chineke ahụ dị ndụ, onye kere eluigwe na ụwa na oké osimiri na ihe niile dị n’ime ha. N’ọgbọ ndị gara aga, o kwere ka ndị mba ọzọ niile nọgide na-eje ije n’ụzọ ha, ọ bụ ezie na ọ hapụghị onwe ya n’enweghị ihe àmà, ebe o mere ihe ọma, na-enye unu mmiri ozuzo site n’eluigwe, na oge mkpụrụ ji amị, na-enyekwa unu nri n’ụba, na-emekwa ka unu nwee obi ụtọ.”—Ọrụ 14:15-17.

12 Olee ihe anyị kwesịrị ịmụta n’okwu ndị ahụ na-eme ka mmadụ chee echiche? Ihe mbụ bụ na Pọl na Banabas ewereghị onwe ha na ha ka ndị ha na-agwa okwu. Ha emeghị ka hà bụ ihe ha na-abụghị. Kama nke ahụ, ha ji obi umeala kwuo na ha nwekwara adịghị ike ndị ndị ahụ na-ekpere arụsị ha na-agwa okwu nwere. N’ezie, e nyere Pọl na Banabas mmụọ nsọ, napụtakwa ha n’ozizi ụgha. E mere ka ha nwee olileanya iso Kraịst chịa n’eluigwe. Ma ha ghọtara na ọ bụrụ na ndị bi na Listra erubere Kraịst isi, e nwere ike inye ha onyinye ndị ahụ.

13 Olee otú anyị si ele ndị anyị na-ezi ozi ọma anya? Ànyị na-ele ha anya na anyị na ha hà? Mgbe anyị na-enyere ndị ọzọ aka ịmụta eziokwu ndị dị n’Okwu Chineke, ànyị na-eme ihe Pọl na Banabas mere, ya bụ, achọghị ka ndị mmadụ towe anyị? Nwanna Charles Taze Russell bụ onye e ji ama atụ n’okwu a. Ọ bụ onye nkụzi pụrụ iche nke butere ụzọ n’ikwusa ozi ọma ná ngwụcha narị afọ nke iri na itoolu na mmalite narị afọ nke iri abụọ. O dere, sị: “Anyị achọghị otuto ma ọ bụ nsọpụrụ n’ihi ihe anyị na-ede; anyị achọghịkwa ka a na-akpọ anyị Revren ma ọ bụ Rabaị.” Obi umeala Nwanna Russell nwere yiri nke Pọl na Banabas. N’otu aka ahụ, ihe mere anyị ji ekwusa ozi ọma abụghị ka ndị mmadụ na-eto anyị, kama ọ bụ ka anyị nyere ha aka ịbịakwute ‘Chineke dị ndụ.’

14-16. Olee ihe nke abụọ na nke atọ anyị kwesịrị ịmụta n’ihe Pọl na Banabas gwara ndị Listra?

14 Chee echiche banyere ihe nke abụọ anyị kwesịrị ịmụta n’okwu ahụ. Pọl na Banabas na-eme mgbanwe. Ndị bi na Listra adịghị ka ndị Juu ahụ nọ n’Aịkoniọm na ndị ha tọghatara atọghata. O nweghị ezigbo ihe ha ma banyere Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ banyere mmekọrịta mba Izrel na Chineke nwere. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị ahụ Pọl na Banabas gwara okwu na-arụ ọrụ ubi. Chineke gọziri ndị Listra n’ihi na obodo ha anaghị ekpo oké ọkụ, ala ha na-emekwa nri. Ha hụrụ ọtụtụ ihe gosiri na Onye kere ihe niile nwere àgwà ọma ndị a na-ahụ n’ihe ndị dị ka oge mkpụrụ ji amị. Ndị ozi ala ọzọ ahụ ji ihe ahụ ndị ahụ ma ama mee ka ha tụgharịa uche.—Rom 1:19, 20.

15 Ànyị nwere ike ime mgbanwe otú ahụ? N’agbanyeghị na onye ọrụ ubi nwere ike ịkụ otu ụdị mkpụrụ n’ihe karịrị otu ala, ọ bụghị otu ụzọ ka ọ na-esi edozi ala ya. Ma eleghị anya, ụfọdụ ala esighị ike, naanị ihe a ga-emezi bụ ịkụ ha ihe. O nwere ike ịdị mkpa ka a kpatụkwuo ala ndị ọzọ aka. Otú ahụ ka mkpụrụ Alaeze anyị na-akụ dị. Ọ bụ otu mkpụrụ ahụ ka anyị na-akụ, ya bụ, ozi Alaeze nke dị n’Okwu Chineke. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị na-eme ka Pọl na Banabas, anyị ga na-agbalị ịghọta ihe bụ́ ọnọdụ ndị anyị na-ezi ozi ọma nakwa okpukpe ha na-ekpe. Anyị ejirizie ihe ahụ anyị ghọtara mata otú anyị ga-esi ezi ha ozi Alaeze Chineke.—Luk 8:11, 15.

16 E nwere ihe nke atọ anyị kwesịrị ịmụta n’ihe ahụ a kọrọ banyere Pọl, Banabas, na ndị Listra. N’agbanyeghị otú anyị si gbalịsie ike, mgbe ụfọdụ, ajọ onye ahụ na-apụnara ndị mmadụ mkpụrụ anyị kụrụ n’obi ha ma ọ bụkwanụ mkpụrụ ahụ adaa n’ala nkume. (Mat. 13:18-21) Ọ bụrụ na ụdị ihe ahụ emee gị, adala mbà. Dị ka Pọl mechara chetara ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na Rom, “onye ọ bụla n’ime anyị [ma ndị ahụ anyị na-agwa Okwu Chineke] ga-aza Chineke ajụjụ maka onwe ya.”—Rom 14:12.

“Ha Nyefere Ha n’Aka Jehova” (Ọrụ 14:20-28)

17. Mgbe Pọl na Banabas hapụrụ Dabe, olee ebe ha gara, oleekwa ihe ha gara ime?

17 Mgbe ndị Likeonia dọkpụụrụ Pọl gaa n’azụ obodo Listra ma hapụ ya, chee na ọ nwụọla, ndị na-eso ụzọ Jizọs gbara ya gburugburu, ya ebilie, gaa rahụ n’ụlọ otu n’ime ha n’abalị ahụ. N’echi ya, Pọl na Banabas gawara Dabe, nke bụ́ njem otu narị kilomita. Chegodị echiche otú ahụ́ si na-egbu Pọl mgbu mgbe ọ na-eme njem a, ebe ọ bụ na a ka tụchara ya nkume awa ole na ole gara aga. N’agbanyeghị nke ahụ, ya na Banabas jisiri ike na-aga. Mgbe ha rutere na Dabe, ha mere ka “ọtụtụ ndị bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.” Mgbe ha mechara, kama isi n’ụzọ ka nso laghachi n’Antiọk nke Siria bụ́ ebe ha bi, “ha laghachiri na Listra, na Aịkoniọm, na Antiọk [nke Pisidia].” Hà gara ime gịnị? Ọ bụ iwusi “mkpụrụ obi nke ndị na-eso ụzọ Jizọs ike, na-agba ha ume ka ha nọgide n’okwukwe Ndị Kraịst.” (Ọrụ 14:20-22) Ndị ikom abụọ ahụ mere ihe anyị kwesịrị ime! Ihe ka ha mkpa bụ ihe banyere ọgbakọ, ọ bụghị ọdịmma onwe ha. Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị ozi ala ọzọ n’oge anyị a na-eme ihe ahụ ha mere.

18. Olee otú e si ahọpụta ndị okenye?

18 E wezụga iji okwu ọnụ na omume gbaa ndị na-eso ụzọ Jizọs ume, Pọl na Banabas ‘họpụtaara ha ndị okenye n’ọgbakọ nke ọ bụla.’ N’agbanyeghị na ọ bụ “mmụọ nsọ zipụrụ” Pọl na Banabas na njem ozi ala ọzọ a, ha kpere ekpere ma buo ọnụ mgbe ‘ha nyefere ndị okenye ahụ n’aka Jehova.’ (Ọrụ 13:1-4; 14:23) Otú ahụ ka a na-eme n’ọgbakọ taa. Tupu ndị okenye ọgbakọ atụọ aro onye ha chọrọ ka a họpụta, ha na-ekpe ekpere ma tụlee ma onye ahụ ò nwere àgwà ndị Akwụkwọ Nsọ kwuru mmadụ ga-enwe tupu a họpụta ya. (1 Tim. 3:1-10, 12, 13; Taị. 1:5-9) Ihe dị mkpa abụghị mgbe ọ ghọrọ Onye Kraịst. Kama, okwu nwanna ahụ, omume ya, na otú e si ele ya anya ga-egosi ma ọ̀ bụ mmụọ nsọ na-eduzi ihe niile ọ na-eme. Ọ bụ inwe àgwà ndị ahụ Akwụkwọ Nsọ kwuru ndị nlekọta kwesịrị inwe ga-ekpebi ma ò ruru eru ịbụ onye ọzụzụ atụrụ n’ọgbakọ.—Gal. 5:22, 23.

19. Ònye ka ndị okenye ma na ha ga-aza ajụjụ, oleekwa otú ha si eṅomi Pọl na Banabas?

19 Ndị okenye a họpụtara ahọpụta ma na ha ga-aza Chineke ajụjụ maka otú ha si emeso ọgbakọ omume. (Hib. 13:17; 1 Pita 5:1-3) Dị ka Pọl na Banabas, ndị okenye na-ebute ụzọ n’ikwusa ozi ọma. Ha na-ekwu okwu na-agba Ndị Kraịst ibe ha ume. Ihe ka ha mkpa bụ ihe banyere ọgbakọ, ọ bụghị ọdịmma onwe ha.—Fil. 2:3, 4.

20. Olee uru anyị ga-erite n’ịgụ akụkọ banyere ọrụ ụmụnna anyị ji ikwesị ntụkwasị obi rụọ?

20 Mgbe Pọl na Banabas mechara laghachi n’Antiọk nke Siria, bụ́ ebe ha si gawa njem ozi ala ọzọ ha, ha kọrọ “ọtụtụ ihe Chineke mere site n’aka ha, kọọkwa na o megheworo ndị mba ọzọ ọnụ ụzọ nke okwukwe.” (Ọrụ 14:27) Ka anyị na-agụ banyere ọrụ ụmụnna anyị ji ikwesị ntụkwasị obi rụọ ma hụ otú Jehova si gọzie mgbalị ha, ọ ga-agba anyị ume ịnọgide “na-ekwu okwu n’atụghị egwu site n’ikike Jehova.”

^ par. 5 Gụọ igbe dị na peeji nke 96, bụ́ “ Aịkoniọm Bụ Obodo Ndị Frijia.”