Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE IRI NA ANỌ

“Anyị Ji Otu Olu Kwekọrịta”

“Anyị Ji Otu Olu Kwekọrịta”

Otú òtù na-achị isi si mee mkpebi na otú mkpebi ahụ si mee ka ọgbakọ niile dịrị n’otu

O si n’Ọrụ Ndịozi 15:13-35

1, 2. (a) Olee ajụjụ ndị dị mkpa òtù na-achị isi nke ọgbakọ Ndị Kraịst na narị afọ mbụ kwesịrị ilebara anya? (b) Olee ihe nyeere ụmụnna ndị ahụ aka ikpebi ihe ziri ezi?

MMADỤ niile nọ na-atụ anya ihe a ga-ekpebi. Ndịozi na ndị okenye nọ n’ime otu ụlọ dị na Jeruselem. Ha lere ibe ha anya, mata na oge eruola ka ha kpebie ihe ha ga-eme. Esemokwu banyere ibi úgwù emeela ka e nwee ajụjụ ndị gbara ọkpụrụkpụ. Ndị Kraịst hà kwesịrị idebe Iwu Mozis? È kwesịrị ịkpa ókè n’etiti ụmụnna ndị Juu na ụmụnna ndị Jentaịl?

2 Ndị ikom ahụ na-edu ndú lebara anya n’ọtụtụ ihe àmà e nwere. Ha chetara amụma Chineke buru n’Okwu ya nakwa akaebe doro anya ndị mmadụ gbara, ndị gosiri na Jehova gọziri ha. Ha niile ekwuola otú ọ dị ha n’obi. N’okwu ahụ ha kpụ n’ọnụ, ọtụtụ ihe àmà emeela ka o doo ha anya na mmụọ Jehova na-eduzi ha. Hà ga-ekwe soro nduzi ahụ?

3. Olee uru anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị eleba anya n’akụkọ ahụ a kọrọ n’Ọrụ Ndịozi isi iri na ise?

3 Ọ bụ ezigbo okwukwe na obi ike ga-eme ka ha kwere ime ihe Jehova ji mmụọ ya duzie ha ka ha mee n’okwu ahụ. O nwere ike ime ka asị ndị ndú okpukpe ndị Juu kpọrọ ha ka njọ. E nwere ụfọdụ ndị ikom nọ n’ọgbakọ kpebisiri ike ime ka ndị Chineke laghachi n’Iwu Mozis. Ndị ahụ nwere ike isiri ha ọnwụ. Gịnị ka òtù na-achị isi ga-eme? Ka anyị chọpụta. Anyị ga-esi otú ahụ mata otú ndị ikom ahụ si mee ihe Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-eme taa. Ọ bụ otú ahụ ka anyị bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ime ná mkpebi ndị anyị na-eme nakwa ná nsogbu ndị anyị na-enwe.

“Nke a na Okwu Ndị Amụma Kwekọrọ” (Ọrụ 15:13-21)

4, 5. Olee ihe e buru n’amụma n’Okwu Chineke Jems mere ka a ghọta ná mkparịta ụka ahụ?

4 Jems bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs, onye nne ji ya na ya, kwuru okwu. * Ọ dị ka ọ̀ bụ ya bụ onyeisi oche ná nzukọ ahụ. O yiri ka okwu ya ọ̀ chịkọtara nkwekọrịta òtù na-achị isi nwere n’okwu ahụ. Jems gwara ndị ahụ zukọrọ n’ebe ahụ, sị: “Simiọn kọrọ nke ọma otú Chineke si chee ihu ya n’ebe ndị mba ọzọ nọ na nke mbụ ya, isi n’etiti ha wepụtara aha ya otu ndị. Nke a na okwu Ndị Amụma kwekọrọ.”—Ọrụ 15:14, 15.

5 Ma eleghị anya, okwu ahụ Simiọn, ma ọ bụ Saịmọn Pita, kwuru, na ihe àmà ahụ Banabas na Pọl wetara mere ka Jems cheta amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị mere ka okwu ahụ ha na-atụle doo anya. (Jọn 14:26) Mgbe Jems kwuchara na okwu ahụ na “okwu Ndị Amụma kwekọrọ,” o kwuru ihe e dere n’Emọs 9:11, 12. Akwụkwọ Emọs so n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ndị a na-akpọkarị “akwụkwọ Ndị Amụma.” (Mat. 22:40; Ọrụ 15:16-18) Ị ga-achọpụta na okwu ahụ Jems kwuru dịtụ iche n’otú e si kwuo ya n’akwụkwọ Emọs dị na Baịbụl anyị ugbu a. O nwere ike ịbụ na ebe Jems gụtara ihe ahụ o kwuru bụ na Septuagint, nke bụ́ Akwụkwọ Nsọ Hibru a sụgharịrị n’asụsụ Grik.

6. Olee otú Akwụkwọ Nsọ si mee ka a ghọta ihe e kwesịrị ikpebi n’okwu ahụ?

6 Jehova si n’ọnụ onye amụma bụ́ Emọs buo amụma na mgbe oge ruru, na ya ga-ebuli “ụlọ ndò Devid,” ya bụ, agbụrụ ndị eze, bụ́ ebe Alaeze Mesaya ga-esi bịa. (Ezik. 21:26, 27) Jehova ọ̀ ga-eme ka ya na naanị mba Izrel mekọọ ihe ọzọ? Mbanụ. Amụma ahụ kwukwara na a ga-achịkọta “ndị mba ọzọ niile” ka ha bụrụ ‘ndị a kpọkwasịrị aha Chineke.’ Cheta na Pita ebula ụzọ gbaa akaebe na Chineke ‘akpaghị ókè ọ bụla n’etiti ha na ha [ya bụ, ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst na ndị Jentaịl kwere ekwe], kama o mere ka obi ha dị ọcha site n’okwukwe.’ (Ọrụ 15:9) Ihe ọ pụtara bụ na ọ bụ uche Chineke ka a kpọbata ndị Juu na ndị Jentaịl ka ha bụrụ ndị ga-eketa Alaeze ya. (Rom 8:17; Efe. 2:17-19) Ọ dịghị ebe ọ bụla amụma ndị ahụ gosiri na a ga-ebu ụzọ bie ndị Jentaịl kwere ekwe úgwù ma ọ bụkwanụ na ha ga-ebu ụzọ ghọọ ndị a tọghatara n’okpukpe ndị Juu tupu ha eketa Alaeze Chineke.

7, 8. (a) Gịnị ka Jems tụrụ aro ka e mee? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi ghọta ihe Jems kwuru?

7 Ihe àmà ahụ si n’Akwụkwọ Nsọ na ihe akaebe gbara ọkpụrụkpụ Jems nụrụ metụrụ ya n’obi, ya atụọ aro, sị: “N’ihi ya, mkpebi m abụghị ka e nye ndị si ná ndị mba ọzọ na-echigharịkwute Chineke nsogbu, kama ka e degara ha akwụkwọ ka ha na-ezere ihe ndị e ji arụsị merụọ, na-ezerekwa ịkwa iko na anụ a nyagburu anyagbu na ọbara. N’ihi na site n’oge ochie, e nwere ndị na-ekwusa ihe e dere n’akwụkwọ Mozis n’obodo dị iche iche, n’ihi na a na-agụpụta ihe ndị ahụ n’ụlọ nzukọ dị iche iche kwa ụbọchị izu ike.”—Ọrụ 15:19-21.

8 Mgbe Jems kwuru, sị, ‘N’ihi ya, mkpebi m bụ,’ ọ̀ na-amanye ụmụnna ya ndị ọzọ ime ihe o chere, ma eleghị anya n’ihi na ọ bụ onyeisi oche ná nzukọ ahụ, ya emezie ka o kpebiere ha ihe a ga-eme n’ebughị ụzọ jụọ ha ajụọ? Mbanụ! Okwu Grik e si sụgharịta ‘mkpebi m bụ’ nwekwara ike ịpụta ‘uche m bụ.’ Ihe Jems mere abụghị ikpebiri ha ihe a ga-eme, kama ọ tụụrụ ha aro ihe ha ga-elebara anya, ya bụ, aro si n’ihe akaebe ha nụrụ nakwa n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere okwu ahụ.

9. Olee uru aro ahụ Jems tụrụ bara?

9 Aro ahụ Jems tụrụ ọ̀ dị mma? O doro anya na ọ dị, n’ihi na ndịozi na ndị okenye mechara nabata ya. Olee uru aro ahụ bara? Otu uru ọ bara bụ na ọ gaghị ‘enye ndị Jentaịl nsogbu’ ma ọ bụ mee ka ihe siere ha ike, ebe ọ bụ na ọ gaghị amanye ha idebe Iwu Mozis. (Ọrụ 15:19) Ihe ọzọ bụ na mkpebi ahụ ga-egosi na ha achọghị imebi akọnuche ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst, bụ́ ndị ‘nụrụla ka a na-agụpụta ihe e dere n’akwụkwọ Mozis n’ụlọ nzukọ dị iche iche kwa ụbọchị izu ike’ ruo ọtụtụ afọ. * (Ọrụ 15:21) N’eziokwu, aro ahụ ọ tụrụ ga-eme ka ụmụnna ndị Juu na ụmụnna ndị Jentaịl dị n’ezigbo mma. Nke ka nke bụ na ọ ga-adị Jehova Chineke mma, ebe ọ bụ na aro ahụ dabara adaba ná nzube ya. Ọ bụ ụzọ magburu onwe ya e si dozie nsogbu chọrọ itisa udo na ọganihu nke ọgbakọ ndị Chineke! Ọ bụkwa ihe nlereanya na-enweghị atụ ọgbakọ Ndị Kraịst taa kwesịrị iṅomi!

Ebe Albert Schroeder na-ekwu okwu ná mgbakọ mba niile e nwere na 1998

10. Olee otú Òtù Na-achị Isi taa si eso ihe nlereanya òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ?

10 Dị ka e kwuru n’Isi nke Iri na Atọ, Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova taa na-eso nduzi Jehova, bụ́ Ọkaakaa Eluigwe na Ụwa, nakwa nduzi Jizọs Kraịst, bụ́ Onyeisi ọgbakọ, n’ihe niile ha na-eme, dị ka òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ mere. * (1 Kọr. 11:3) Olee otú ha si eme ya? Albert D. Schroeder, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi malite na 1974 ruo mgbe o jechara ozi ya n’ụwa na March 2006, kọwara, sị: “Òtù Na-achị Isi na-enwe nzukọ na Wednesday ọ bụla. Ha na-eji ekpere amalite nzukọ ha ma rịọ Jehova ka o jiri mmụọ ya duzie ha. Ha na-agbalịsikwa ike ịhụ na Okwu Chineke bụ́ Baịbụl kwadoro okwu ọ bụla e lebaara anya na mkpebi ọ bụla e mere.” Milton G. Henschel, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi ruo ogologo oge ma jechaa ozi ya n’ụwa na March 2003, jụrụ ụmụ akwụkwọ nke klas nke otu narị na otu nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied otu ajụjụ dị mkpa. Ọ jụrụ ha, sị: “È nwere nzukọ ọzọ n’ụwa nke ndị na-elekọta ya na-eleba anya n’Okwu Chineke bụ́ Baịbụl tupu ha emee mkpebi ndị dị mkpa?” Azịza ya doro anya.

“Iziga Ndị Ikom A Họọrọ” (Ọrụ 15:22-29)

11. Olee otú òtù na-achị isi si gwa ọgbakọ niile ihe ha kpebiri?

11 Òtù na-achị isi nọ na Jeruselem ji otu obi kpebie ihe a ga-eme banyere ibi úgwù. Otú ọ dị, ihe ga-eme ka ụmụnna nọ n’ọgbakọ niile na-eme otu ihe bụ ịgwa ha ihe ahụ e kpebiri, ka o doo ha anya ma gbaa ha ume. Olee otú kacha mma a ga-esi eme ya? Baịbụl kwuru, sị: “Ndịozi na ndị okenye nakwa ọgbakọ ahụ dum kwadoro iziga ndị ikom a họọrọ n’etiti ha Antiọk, ha na Pọl na Banabas, ya bụ, Judas onye a na-akpọ Basabas nakwa Saịlas, bụ́ ndị ikom na-edu ndú n’etiti ụmụnna.” E dekwara akwụkwọ ozi ma nye ya ndị ikom ndị a ka a gụọ ya n’ọgbakọ niile dị n’Antiọk, Siria, na Silishia.—Ọrụ 15:22-26.

12, 13. (a) Olee uru nzipụ e zipụrụ Judas na Saịlas bara? (b) Oleekwa uru akwụkwọ ozi ahụ òtù na-achị isi dere bara?

12 Judas na Saịlas, bụ́ “ndị ikom na-edu ndú n’etiti ụmụnna,” ruru eru ịnọchite anya òtù na-achị isi. Ndị ikom anọ ahụ e zipụrụ ga-eme ka o doo anya na ozi ha ji bịa abụghị naanị ihe òtù na-achị isi zara n’ajụjụ ha jụrụ, kama na ọ bụ ntụziaka ọhụrụ òtù na-achị isi nyere. Ọnụnọ ‘ndị ikom ndị ahụ a họọrọ’ ga-anọ n’ebe ahụ ga-eme ka ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst bi na Jeruselem na ndị Jentaịl bụ́ Ndị Kraịst bi n’ebe ndị ọzọ dị n’ezigbo mma. Nzipụ e zipụrụ ha bara ezigbo uru! O doro anya na o mere ka e nwee udo na ịdị n’otu n’etiti ndị Chineke.

13 Akwụkwọ ozi ahụ kwuru ihe doro anya ndị Jentaịl bụ́ Ndị Kraịst ga-eme, ọ bụghị naanị n’okwu banyere ibi úgwù, kama n’ihe ha kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ha chọrọ ime ihe dị Jehova mma, ya agọziekwa ha. Isi ihe akwụkwọ ozi ahụ kwuru bụ: “Ọ dị mmụọ nsọ mma, dịkwa anyị onwe anyị mma ka anyị ghara ịtụkwasịkwuru unu ibu arọ, ma e wezụga ihe ndị a dị mkpa, ya bụ, ịdị na-ezere ihe e ji chụọrọ arụsị àjà, na ọbara na anụ a nyagburu anyagbu na ịkwa iko. Ọ bụrụ na unu elezie anya zere ihe ndị a, ọ ga-adịrị unu mma. Nọrọnụ nke ọma!”—Ọrụ 15:28, 29.

14. Gịnị mere ndị Jehova ji jiri otu obi na-arụ ọrụ taa n’ụwa a na-adịghị n’otu?

14 Taa, Ndịàmà Jehova dị ihe dị ka nde asaa, n’ihe karịrị otu narị puku ọgbakọ n’ụwa niile. Ha niile kweere n’otu ihe, na-emekwa otu ihe. Gịnị mere ha ji dị n’otu otú ahụ, nke ka nke, ebe ọ bụ na ihe juru n’ụwa taa bụ ọgba aghara na obi abụghị otu? Ihe bụ́ isi mere ha ji dị n’otu bụ na Jizọs Kraịst, bụ́ Onyeisi ọgbakọ, si n’aka “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na-eme ka ha ghọta ihe doro anya ha ga-eme. (Mat. 24:45-47) Ihe ọzọ mere ha ji dị n’otu bụ na ụmụnna n’ụwa niile na-eji obi ha dum eme ihe Òtù Na-achị Isi kwuru.

“Ha Ṅụrịrị Ọṅụ n’Ihi Agbamume Ahụ” (Ọrụ 15:30-35)

15, 16. Gịnị si n’okwu banyere ibi úgwù ahụ pụta, gịnịkwa kpatara ya?

15 Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi gara n’ihu ịgwa anyị na mgbe ụmụnna ndị ahụ e si na Jeruselem zipụ garuru Antiọk, ha ‘kpọkọtara ìgwè mmadụ ahụ ma nye ha akwụkwọ ozi ahụ.’ Gịnị ka ụmụnna ndị ahụ mere mgbe ha nụrụ ihe òtù na-achị isi kwuru ka e mee? ‘Mgbe ha gụsịrị akwụkwọ ozi ahụ, ha ṅụrịrị ọṅụ n’ihi agbamume ahụ.’ (Ọrụ 15:30, 31) Ihe ọzọ bụ na Judas na Saịlas “gbara ụmụnna ahụ ume, meekwa ka ha sie ike, site n’ịgwa ha ọtụtụ okwu.” N’ihi ihe ahụ ndị ikom abụọ ahụ mere, e nwere ike ịkpọ ha “ndị amụma,” otú ahụ e sikwa kpọọ Banabas, Pọl, na ndị ọzọ ndị amụma—nke bụ́ ihe a na-akpọ ndị na-ekwu ihe bụ́ uche Chineke.—Ọrụ 13:1; 15:32; Ọpụ. 7:1, 2.

16 O doro anya na Jehova gọziri ihe niile e mere, nke mere ka e dozie esemokwu ahụ nke ọma. Gịnị mere e ji nwee ike idozi okwu ahụ? Ọ bụ n’ihi na òtù na-achị isi kwuru ihe doro anya e kwesịrị ime. Ha kwukwara ya n’oge kwesịrị ekwesị. Ihe ha kwuru si n’Okwu Chineke. Ọ bụkwa mmụọ nsọ duziri ha. Ihe ọzọ kpatara ya bụ ụzọ magburu onwe ya e si gwa ọgbakọ niile ihe ndị ahụ òtù na-achị isi kpebiri.

17. Olee otú e si gosi ihe nlereanya a na-eso taa mgbe ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị gara ileta ọgbakọ?

17 Otú ahụ ka Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-eme taa. Ha na-enye ụmụnna nọ n’ụwa dum ntụziaka n’oge kwesịrị ekwesị. Ha kpebie ihe a ga-eme, ha na-agwa ya ọgbakọ niile ka o doo ha anya. Otu ụzọ ha si agwa ya ọgbakọ bụ mgbe ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị gara ileta ọgbakọ. Ndị nlekọta ndị ahụ na-anaghị achọ ọdịmma onwe ha na-esi n’otu ọgbakọ gaa n’ọgbakọ ọzọ, na-enye ụmụnna ntụziaka doro anya ma na-agba ha ezigbo ume. Dị ka Pọl na Banabas, ha na-eji oge dị ukwuu eje ozi, “na-ezi ihe ma na-ezisa ozi ọma banyere okwu Jehova.” (Ọrụ 15:35) Dị ka Judas na Saịlas, ha ‘na-agba ụmụnna ume, meekwa ka ha sie ike, site n’ịgwa ha ọtụtụ okwu.’

18. Olee ihe ga-eme ka ndị Chineke na-enweta ngọzi Jehova?

18 Oleekwanụ maka ọgbakọ dị iche iche? Gịnị ga-eme ka ọgbakọ dị n’ụwa dum na-enwe udo na ịdị n’otu n’ụwa taa nke na-adịghị n’otu? Cheta na ọ bụ Jems, bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs, mechara dee, sị: “Amamihe nke si n’elu bu ụzọ dị ọcha, na-emekwa udo, nwee ezi uche, dị njikere irube isi . . . A na-aghakwa mkpụrụ nke ezi omume n’ebe udo dị maka ndị na-eme udo.” (Jems 3:17, 18) O nweghị otú anyị ga-esi amata ma Jems ò bu nzukọ ahụ ha nwere na Jeruselem n’obi kwuo okwu ahụ. Ma, n’ihe anyị tụlerela banyere akụkọ ahụ e dere n’Ọrụ Ndịozi isi iri na ise, o doro anya na Jehova na-agọzi ndị mmadụ naanị n’ebe e nwere ịdị n’otu na otu obi.

19, 20. (a) Olee otú o si doo anya na e nwere udo na ịdị n’otu n’ọgbakọ Antiọk? (b) Gịnịzi ka Pọl na Banabas mere?

19 O doro anya na e nweziri udo na ịdị n’otu n’ọgbakọ Antiọk. Kama ịrụ ụmụnna ndị ahụ si na Jeruselem ụka, ụmụnna nọ n’Antiọk ejighị nleta Judas na Saịlas letara ha gwurie egwu, n’ihi na ọ bụ ‘mgbe ha nọtụchara ebe ahụ ka ụmụnna ahụ hapụrụ ha ka ha lawa n’udo, lakwuru ndị zitere ha,’ ya bụ, laghachi Jeruselem. * (Ọrụ 15:33) Obi siri anyị ike na ụmụnna nọ na Jeruselem ṅụrịkwara ọṅụ mgbe ha nụrụ ihe ndị ikom abụọ ahụ kwuru banyere njem ha. Obiọma Jehova nke na-erughịrị mmadụ mere ka njem ha gaa siriri werere!

20 Pọl na Banabas nọgidere n’Antiọk, jirizie ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma, dị ka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị taa na-eme mgbe ha letara ọgbakọ ndị ha na-elekọta. (Ọrụ 13:2, 3) Ọ bụ ezigbo ngọzi Jehova gọziri ndị ya! Ma olee otú ọzọ Jehova si jiri ndị nkwusa abụọ ahụ na-anụ ọkụ n’obi rụọ ọrụ, oleekwa otú o si gọzie ha? Ọ bụ ihe anyị ga-achọpụta n’isiokwu ọzọ.

Ihe Chineke si n’aka Òtù Na-achị Isi na ndị na-anọchite anya ha na-enye anyị na-abara Ndị Kraịst oge a uru

^ par. 4 Gụọ igbe dị na peeji nke 112, bụ́ “ Jems—‘Nwanne Onyenwe Anyị.’

^ par. 9 Jems ji amamihe kwuo banyere ihe Mozis dere, nke na-abụghị naanị Iwu Mozis, kamakwa ihe o dere banyere ihe Chineke meere ndị mmadụ nakwa otú o si mee ka a mata uche ya mgbe a na-enwebeghị Iwu Mozis. Dị ka ihe atụ, Jenesis mere ka a ghọta otú Chineke si ele ọbara, ịkwa iko, na ikpere arụsị anya. (Jen. 9:3, 4; 20:2-9; 35:2, 4) Jehova si otú ahụ mee ka a mata ụkpụrụ kwesịrị ịchị mmadụ niile, ma hà bụ ndị Juu ma hà bụ ndị Jentaịl.

^ par. 10 Gụọ igbe dị na peeji nke 110, bụ́ “ Otú E Si Hazie Òtù Na-achị Isi Taa.”

^ par. 19 N’amaokwu iri atọ na anọ, ụfọdụ nsụgharị Baịbụl kwuru na Saịlas kpebiri ịnọgide n’Antiọk. (Bible Nsọ nke Union Version) Otú ọ dị, ihe ahụ bụ okwu e mechara gbakwụnye.