Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 8

Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị

Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị

(Matiu 26:​26-​30)

1. Jehova, Nn’anyị bi n’elu,

Nke a bụ abalị dị nsọ!

N’abal’iri n’anọ na Naịsan k’a hụrụ

Ebube na àgwà gị dum,

E rie atụrụ Ngabiga,

Izrel niile apụọ n’ohu.

Onyenw’anyị mechara jir’ọbara ya

Mezuo amụma nke a dị nsọ.

2. Anyị abịal’ugbu a n’ihu gị

Dị ka atụrụ ị n’azụ,

Ito gị n’ihi na i ziteer’anyị Kraịst,

Na ịsọpụr’aha nsọ gị.

Nchet’ọnwụ Jizọs agaghị

Apụ apụ n’obi anyị.

Anyị ga n’eje ije n’ụzọ Kraịst zir’anyị,

K’anyị nwee ndụ ebigh’ebi.