Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 101

Ime Ka A Mara Eziokwu Alaeze

Ime Ka A Mara Eziokwu Alaeze

(Ọrụ 20:​20, 21)

1. E nwere mgbe a’yị n’amaghị

Ụz’Onye Kraịst kwesịr’iso.

Jehova ziter’ìhè,

Mee k’eziokwu ya doo anya.

A’yị ghọtara uche Nn’anyị,

Ijer’Ọchịchị ya ozi,

Mee k’a mara Jehova,

K’anyị meekwa k’e too aha nsọ ya.

Anyị n’ezi ’madụ niile

Ozi Al’eze n’ebe niile.

A’yị n’akụziri h’eziokwu

G’eme ka ha nwer’onwe ha.

K’anyị n’agbalị ná mba dum

Izisa ozi Jehova,

K’anyị jiri otu obi

Fee ya ruo mgbe ọ g’asị n’o zuwo.