Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 9

Toonụ Jehova, Bụ́ Chineke Anyị!

Toonụ Jehova, Bụ́ Chineke Anyị!

(Abụ Ọma 145:⁠12)

1. Toonụ Jaa! Toonụ Jehova!

K’a mar’aha ya dị ebube!

Maa ọkwa! Oge ya dị nso,

K’a dọọ ’madụ niil’aka ná ntị.

Chineke ekwuwo na ugbu a ka

Ọkpara ya g’abụ Eze.

Gaanụ zie ’madụ niile ozi ọma,

Gwa ha ih’ọma Jaa g’eme!

(KORỌS)

Toonụ Jaa! Toonụ Jehova!

Meenụ k’ụwa mara n’ọ dị ukwuu!

2. Toonụ Jaa! K’abụ ya da’ụda!

Jiri abụ too aha ya!

Anyị ji Obi ụtọ n’ọṅụ

N’ekwusa ebube ya niile.

Chineke na ọrụ ya dị ebube,

M’ọ dị nwayọọ, n’em’ih’ọma.

Ọ dị ebere, nwee ịhụnanya.

Ọ g’anụ m’anyị kpọkuo ya.

(KORỌS)

Toonụ Jaa! Toonụ Jehova!

Meenụ k’ụwa mara n’ọ dị ukwuu!