Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 10

“Lee M! Ziga M”

“Lee M! Ziga M”

(Aịzaya 6:⁠8)

1. Taa, ndị ’madụ n’akọcha,

N’ekwulu aha Chineke.

Ha sị Chinek’adịgh’ike;

Ha sị n’ọ dị obi ọjọọ.

Ònye g’agọpụ aha ya?

Ònye g’eto ya ka ha nụ?

“Lee m, Onyenwe m! Ziga m, ziga m.

M g’abụ abụ otuto gị.

(KORỌS)

Ọ dịghị ih’ùgwù ka nke a.

Onyenwe m, Ziga m, ziga m.”

2. Ha n’asị n’ọ n’egbu oge;

H’anaghị atụ egwu ya.

Ụfọdụ n’efe arụsị;

Ndị ọzọ n’efe Siza.

Ònye g’agwa ha ihe g’eme,

Kwuo maka agha Chineke?

“Lee m, Onyenwe m! Ziga m, ziga m.

M g’ekwu ya n’atụgh’egwu.

(KORỌS)

Ọ dịghị ih’ùgwù ka nke a.

Onyenwe m, Ziga m, ziga m.”

3. Ndị umeala n’asụ ude

N’ihi n’ih’ọjọọ n’amụba.

Ha ji obi ha dum n’achọ

Eziokwu nke n’enye ọṅụ.

Ònye g’akasi ha obi,

Mee ka ha chọọ ezi omume?

“Lee m, Onyenwe m! Ziga m, ziga m.

M g’eji nwayọọ zie ha ihe.

(KORỌS)

Ọ dịghị ih’ùgwù ka nke a.

Onyenwe m, Ziga m, ziga m.”

(Gụọkwa Ọma 10:4; Ezik. 9:⁠4.)