Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 77

Na-agbaghara Ndị Mmadụ

Na-agbaghara Ndị Mmadụ

(Abụ Ọma 86:⁠5)

1. N’ịhụnanya, Jaa si

N’aka Kraịst mee ndokwa

Ka a gbaghar’anyị mmehie

Ma wepụr’anyị ọnwụ.

Ọ bụrụ n’anyị chegharịa,

Ọ g’agbaghara anyị

N’ihi àjà nke Jizọs chụrụ,

Ma anyị rịọ n’aha ya.

2. A’yị ṅomie Chineke,

Ọ g’emer’anyị ebere,

M’anyị n’agbaghar’ibe anyị,

Nwe’ọmị’ko, n’ịhụnanya.

N’edir’ibe anyị ihe,

Ghar’iwe iwe ọkụ,

N’asọpụrụ ụmụnn’anyị,

N’egosi h’ịhụnanya.

3. Ebere bụ àgwà

Anyị kwesịr’ịmụta.

Hapụ ibu iwe n’obi,

Na ịkpọ ’madụ asị.

Anyị ṅomiekwa Jehova

N’ịhụnanya ukwu ya,

Anyị ga n’agbaghara ha;

Si otú a yie Chineke.