Abụ nke 14
Mgbe Ihe Niile Ga-adị Ọhụrụ
1. Ọchịchị Chinek’amalitel’ịchị.
Nwa Jehova nọ n’och’ez’ebube.
O bur’agha n’el’igwe ma merie,
Uche Chineke g’eme n’isi nso.
(KORỌS)
Ṅụrịa! Jaa nọnyeere ’madụ,
Ọ ga-ebinyekwara ha.
Ọrịa n’ịkw’ákw’agagh’adị ọzọ,
Ma ir’uju ma ịnwụ anwụ;
Jaa g’eme k’ihe niile dị ọhụrụ.
Okwu ndị a g’emezu.
2. Ka ’madụ dum lee Jeruselem Ọhụ’ụ,
Nwunye Nw’Atụrụ n’egbuk’egbuke.
E ji nkume ọma chọọ ya mma,
Naanị Jehova g’abụ ìhè ya.
(KORỌS)
Ṅụrịa! Jaa nọnyeere ’madụ,
Ọ ga-ebinyekwara ha.
Ọrịa n’ịkw’ákw’agagh’adị ọzọ,
Ma ir’uju ma ịnwụ anwụ;
Jaa g’eme k’ihe niile dị ọhụrụ.
Okwu ndị a g’emezu.
3. Obod’ọm’ahụ g’enye anyị niil’ọṅụ.
Ọn’ụzọ ya g’eghe oghe mgbe dum.
Mba niile g’ej’ije n’ìhè ya;
Ndị ohu Jaa, nwuonụ ìhè ahụ.
(KORỌS)
Ṅụrịa! Jaa nọnyeere ’madụ,
Ọ ga-ebinyekwara ha.
Ọrịa n’ịkw’ákw’agagh’adị ọzọ,
Ma ir’uju ma ịnwụ anwụ;
Jaa g’eme k’ihe niile dị ọhụrụ.
Okwu ndị a g’emezu.
(Gụọkwa Mat. 16:3; Mkpu. 12:7-9; 21:23-25.)