Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 7

Nraranye Ndị Kraịst

Nraranye Ndị Kraịst

(Ndị Hibru 10:​7, 9)

1. N’ihi na Jehova kere

El’igwe na ala,

Ọ bụ ya nwe ụwa na ígwé.

Ha bụ ọrụ aka ya.

O nyere anyị ume ndụ,

Gosi na ọ bụ ya

Ka ihe niile o ker’eke

Kwesịrị ito ma fee.

2. E mere Jizọs baptizim,

Mezuo ezi omume.

Ọ sị Chineke n’ekpere:

‘M bịar’ime uche gị.’

O sikwa na Jọdan pụta,

E tere ya ’manụ,

Ọ g’erub’isi ma jee ozi.

Ọ raar’onwe ya nye Jaa.

3. A’yị nọ n’ihu gị, Jehova,

Ito aha ukwu gị.

Anyị ajụla onw’anyị,

Ma nyefee gị ndụ anyị.

I nyer’anyị Ọkpara gị,

Ọ kwụr’oké ụgwọ.

Ọ bụkwa naanị gị nwe anyị

Ma n’ọnwụ ma ná ndụ.