Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 16

Gbaba n’Alaeze Chineke!

Gbaba n’Alaeze Chineke!

(Zefanaya 2:⁠3)

1. Chọọnụ Jehova, ndị dị umeala;

Chọọnụ ez’ihe na umeala taa,

Nke nwer’ik’ime k’e zobe unu

N’ụbọchị oké iwe ya.

(KORỌS)

Gbaba n’Al’eze, bụ́ olil’any’anyị;

Kwadosi’ọchịchị y’ike.

Chineke g’echebe gị ma gọzie gị;

Mee ngwa deb’iwu ya.

2. Bịanụ, ndị agụụ eziokwu n’agụ;

Kwụsịnụ ir’uju na ibe ákwá.

Chọọnụ Chineke, gbanahụ Ekwensu,

Ruber’ọchịchị Kraịst isi.

(KORỌS)

Gbaba n’Al’eze, bụ́ olil’any’anyị;

Kwadosi’ọchịchị y’ike.

Chineke g’echebe gị ma gọzie gị;

Mee ngwa deb’iwu ya.

3. Lelienụ anya, weli’isi, ṅụrị’ọṅụ;

Hụ ihe n’egosi n’Al’eze dị nso!

Nabata ìhè Jehova n’ezite,

N’atụkwa naanị ya egwu!

(KORỌS)

Gbaba n’Al’eze, bụ́ olil’any’anyị;

Kwadosi’ọchịchị y’ike.

Chineke g’echebe gị ma gọzie gị;

Mee ngwa deb’iwu ya.