Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 18

Ịhụnanya Chineke nke Na-adịgide Adịgide

Ịhụnanya Chineke nke Na-adịgide Adịgide

(Aịzaya 55:​1-⁠3)

1. Jaa bụ ịhụnanya!

Nke a n’agb’anyị ume.

O ji ’hụnanya zite

Nwa ya ịgbapụt’anyị,

K’anyị nwet’ezi omume,

Ọṅụ na ndụ ebigh’ebi.

(KORỌS)

Ndị akpịrị n’akpọ nkụ,

Bịa ṅụọ ’miri ndụ n’efu.

Ndị chọrọ, bịanụ ṅụọ;

Hụ obiọma Chineke.

2. Jaa bụ ịhụnanya!

Ọrụ ya gosiri ya.

Ọ hụkwar’anyị n’anya

Nye Jizọs Kraịst och’eze,

K’o mezu’ọgbụgba ndụ ya.

A mụwo Al’eze ya.

(KORỌS)

Ndị akpịrị n’akpọ nkụ,

Bịa ṅụọ ’miri ndụ n’efu.

Ndị chọrọ, bịanụ ṅụọ;

Hụ obiọma Chineke.

3. Jaa bụ ịhụnanya!

K’anyị mụt’ịhụnanya,

Nyere ndị umeala aka

Ịchọt’ụzọ Chineke.

K’anyị n’ezi oziọma,

N’akasi ndị ’madụ obi.

(KORỌS)

Ndị akpịrị n’akpọ nkụ,

Bịa ṅụọ ’miri ndụ n’efu.

Ndị chọrọ, bịanụ ṅụọ;

Hụ obiọma Chineke.