Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 21

Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Na-eme Ebere!

Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Na-eme Ebere!

(Matiu 5:⁠7)

1. Obi ụtọ dịịrị ndị ebere!

Ha dị mma n’anya Chineke.

Ha n’agwa ndị n’em’ih’ọma

N’ebere dị Chinek’ụtọ.

O si n’aka Kraịst me’ebere,

Nye anyị ihe mgbapụta,

Meere ndị nwayọọ ebere

Ebe ọ ma n’anyị esigh’ike.

2. Jaa n’agọzi ndị ebere;

Ọ n’agbaghara ha mmehie.

Ebere Jaa baara h’uru

Ebe Kraịst gara n’ihu ya.

Ha ji ọṅụ akọ eber’ahụ,

N’ekwus’Okwu ya ebe niile,

N’agwa ndị ’madụ, “Nweenụ ọṅụ

N’ihi na Al’eze dị nso.”

3. Jehova g’eji ’hụnanya

Kpee ndị dị umeal’ikpe.

Ha g’ahụkwa ebere ya

Ebe ha n’eme ebere.

K’anyị n’agbal’im’ebere

Ma mụta àgwà ọm’ahụ.

Chineke na Kraịst zir’anyị

Ime ebere kw’ụbọchị.