Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 24

Lekwasị Anya n’Ụgwọ Ọrụ!

Lekwasị Anya n’Ụgwọ Ọrụ!

(2 Ndị Kọrịnt 4:​18)

1. Mgbe nd’ìsì g’ah’ụzọ,

Ndị ntị chiri g’anụ ihe,

Ọzara g’awa okooko,

’Miri agbaa n’ala kpọrọ nkụ,

Ndị ngwọrọ g’amali elu,

Mgbe ọnwụ n’agagh’adị,

Ị g’ahụ oge ọm’ahụ,

M’i lekwasị anya n’ụgw’ọrụ.

2. Mgbe ndị ogbi g’ekwu okwu,

Agadi g’agh’okorobịa,

Ala g’amị mkpụrụ n’ụba,

Ih’ọma g’adị mgbe niile,

A ga n’anụ ab’ụmụaka,

Udo n’ọṅụ g’adị ebe dum,

Ị g’ahụ mbilite n’ọnwụ,

M’i lekwasị anya n’ụgw’ọrụ.

3. Mgbe agụ n’atụrụ g’anọ,

Ọdụm na nw’ehi g’anọkọ,

Nwatakịrị ga n’edu ha,

Ha ga n’egekwa ya ntị.

Mgb’ịkw’ákwá n’agagh’adị,

A g’ewepụ egwu n’ihe mgbu,

Ị g’ahụ mgbe Jaa g’eme ya,

M’i lekwasị anya n’ụgw’ọrụ.