Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 55

Lee Ndụ Ebighị Ebi!

Lee Ndụ Ebighị Ebi!

(Jọn 3:​16)

1. Jir’anya nk’uche gị

Hụ ndị bikọtar’ọnụ.

Ir’uju alaa, Udo adị!

Ákwá n’ọrịa g’ala.

(KORỌS)

Jir’ọṅụ bụọ abụ!

Ị pụr’inweta ya.

N’el’anya mgbe ị g’asị,

“Lee ndụ ebigh’ebi!”

2. Agadi g’aghọ okoro,

Ahụ́ y’adị ka nwata.

Nsogbu alaa, Ịkw’ákwá

Na egwu agagh’adị.

(KORỌS)

Jir’ọṅụ bụọ abụ!

Ị pụr’inweta ya.

N’el’anya mgbe ị g’asị,

“Lee ndụ ebigh’ebi!”

3. A’yị g’ebi na Paradaịs,

N’enye Chinek’otuto.

A’yị g’ekele Chineke

K’anyị n’adị ndụ.

(KORỌS)

Jir’ọṅụ bụọ abụ!

Ị pụr’inweta ya.

N’el’anya mgbe ị g’asị,

“Lee ndụ ebigh’ebi!”