Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 26

Soro Chineke Na-eje Ije!

Soro Chineke Na-eje Ije!

(Maịka 6:⁠8)

1. Soro Chineke n’eje ije;

Nwe’obiọma na umeala.

K’okwukwe gị si’ike na Jaa;

Kwee k’ọ n’enye g’ike.

I jisi’eziokwu ya ike,

’Madụ eduhiela gị;

Kwee ka Chineke n’edu gị,

Dị k’e si edu nwata.

2. Soro Chineke n’adị ọcha;

Emekwala mmehie.

N’aga n’ihu ruo ntozu okè,

Mee ihe dị ya mma.

N’eche ihe ndị dị ọcha,

Ih’ọma, na eziokwu,

Ọ bụrụ n’ị chọr’ịdị ndụ,

Tụkwasị Jaa obi.

3. Soro Chineke n’eje ije,

Kwesị ntụkwasị obi,

Nwee ọṅụ na egwu Chineke,

Uru y’enwegh’atụ.

So Chineke; jiri ọṅụ

N’abụ abụ otuto ya.

Ozi Al’eze ya n’enye

Ọṅụ n’enwegh’atụ.