Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 32

Guzosienụ Ike, Kwụrụnụ Chịm!

Guzosienụ Ike, Kwụrụnụ Chịm!

(1 Ndị Kọrịnt 15:⁠58)

1. Nsogbu ụwa akala njọ.

’Madụ n’atụ egwu ihe g’eme.

K’anyị guzosi’ike ma kwụrụ chịm,

Nọsie ike n’ozi Jaa.

(KORỌS)

K’anyị guzosie ike;

Dịrịkwa iche n’ụwa,

N’amụ eziokwu Jaa,

kwesị ntụkwasị obi.

2. Ọnyà na ọnwụnwa juru n’ụwa.

A’yị g’emeri m’anyị nwee ezi uche.

Anyị mee ihe Chineke kwuru,

Ọ g’eme k’anyị merie.

(KORỌS)

K’anyị guzosie ike;

Dịrịkwa iche n’ụwa,

N’amụ eziokwu Jaa,

kwesị ntụkwasị obi.

3. Jiri obi gị dum fee Chineke.

K’anyị n’eje ozi Onyenw’anyị.

Nọsie ike, n’ekwusa ozi ọma.

Ọgwụgwụ dị ezigbo nso.

(KORỌS)

K’anyị guzosie ike;

Dịrịkwa iche n’ụwa,

N’amụ eziokwu Jaa,

kwesị ntụkwasị obi.

(Gụọkwa Luk 21:9; 1 Pita 4:⁠7.)