Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 34

Ibi Ndụ Kwesịrị Aha Anyị

Ibi Ndụ Kwesịrị Aha Anyị

(Aịzaya 43:​10-⁠12)

1. Jehova, onye pụr’ime ihe niile,

Zur’okè n’ikpe na n’ịhụnanya.

Is’iyi nk’eziokwu na amamihe,

Ị bụ Ọkaakaa n’achị achị n’el’igwe.

A’yị bụ́ ndị gị n’aṅụrị ọṅụ n’ozi gị;

Izis’ozi Al’eze n’atọ anyị ụtọ.

(KORỌS)

Ịbụ Ndịàmà gị bụụr’anyị ih’ùgwù.

K’anyị n’ebi ndụ kwesịr’ah’anyị!

2. Ịrụkọ ọrụ n’ozi gị dị nsọ

N’eme k’anyị nwe’ịhụnanya na udo.

Izi eziokwu na igosi ebube gị

N’enye anyị ọṅụ ka a n’eto gị.

A’yị bụ Ndịàmà gị, Jehova, Nn’anyị,

Ọ bụ ih’ùgwù ito aha gị.

(KORỌS)

Ịbụ Ndịàmà gị bụụr’anyị ih’ùgwù.

K’anyị n’ebi ndụ kwesịr’ah’anyị!