Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 4

Imere Onwe Anyị Ezi Aha n’Ebe Chineke Nọ

Imere Onwe Anyị Ezi Aha n’Ebe Chineke Nọ

(Ekliziastis 7:⁠1)

1. A’yị kwesịr’iji Ụbọchị ndụ anyị dum

Nweta ezi aha, Deb’iwu Jaa niile.

Ọ bụrụ na anyị Mee uche Jehova,

A’yị g’eme k’obi Ya ṅụrị’ọṅụ.

2. Ịgbalịs’ike K’a mar’anyị n’ụwa,

Ịbụ enyi ụwa, Na ịch’otuto ya

Bụ naanị ih’efu. Anyị bụr’enyi ya,

Anyị agagh’abụ Enyi nke Jaa.

3. Anyị chọrọ ka Jaa cheta ah’anyị,

Ruo mgb’ebigh’ebi K’ọ dị n’akwụkwọ ya.

Ọ bụ ony’eziokwu, A’yị n’ekwus’Okwu ya,

Ma nwee ezi aha Ruo n’ọgwụgwụ.