Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 38

Tụkwasị Jehova Ibu Arọ Gị

Tụkwasị Jehova Ibu Arọ Gị

(Abụ Ọma 55)

1. Biko, Jehova, gee mụ ntị,

Ma mee ka m chọta gị.

Biko, nụr’ekpere m ma za m;

Mee ka m ghar’ịtụ egwu.

(KORỌS)

Tụkwasị Jehov’ibu gị;

Y’onwe ya g’akwado gị.

Ọ gaghị ekwe ka ị daa,

Ọ g’eme k’ị kwụrụ chịm.

2. A sị na m nwere nku nduru,

M g’efeg’ebe dị jụụ,

Ka ndị ọjọọ ghar’inweta m,

N’okwu ọjọọ ha n’ekwu.

(KORỌS)

Tụkwasị Jehov’ibu gị;

Y’onwe ya g’akwado gị.

Ọ gaghị ekwe ka ị daa,

Ọ g’eme k’ị kwụrụ chịm.

3. Aga m akpọku Jehova,

Rịọ ya ka ọ n’echebe m.

Ọ n’eny’udo n’oge nsogbu,

N’enye ndị umeala ike.

(KORỌS)

Tụkwasị Jehov’ibu gị;

Y’onwe ya g’akwado gị.

Ọ gaghị ekwe ka ị daa,

Ọ g’eme k’ị kwụrụ chịm.