Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 39

Udo Anyị Nwere

Udo Anyị Nwere

(Jọn 14:⁠27)

1. Too Jehova, Chi udo

Na ịdị n’otu.

Ọ g’eme k’agha kwụsị,

Wet’ịdị n’otu.

Nwa ya, Kraịst, bụ Ony’isi Udo,

Dị nwayọọ n’obi.

Mgb’ọ g’emeri n’agha,

A’yị g’enw’ezi udo.

2. Anyị akwụsịl’okwu ọjọọ,

Kwụsị esemokwu,

Kpụgharị’ube na mm’agha,

Iji nwee udo.

A’yị chọọ inwe’udo ahụ,

K’anyị gbaghara.

Eb’anyị bụ atụrụ Kraịst,

K’anyị mụt’udo.

3. K’anyị niile nwee udo,

Bụ́ ezi mkpụrụ,

N’amamihe si n’elu,

N’esi n’ekpere.

A’yị g’abụ ihe nler’anya,

Gosi udo anyị

Ruo mgbe Al’eze g’eweta

Udo n’ebe dum.