Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 71

Mmụọ Nsọ Chineke Nyere Anyị

Mmụọ Nsọ Chineke Nyere Anyị

(Luk 11:⁠13)

1. Jehov’Ọkaakaa, Nna ebere,

Ị ka obi anyị n’ezugh’okè.

Mee k’ibu n’ahụhụ dịr’anyị mfe,

Jiri ’mụọ nsọ gị kasie anyị obi.

2. Anyị adịghị eru ebube gị;

E nwere mgbe anyị n’ehi’ụzọ.

Chineke, anyị n’arịọ gị: Nye anyị

’Mụọ nsọ gị ga n’edu anyị kw’ụbọchị.

3. Ike gwụ anyị m’ọ bụ anyị daa mbà.

’Mụọ gị g’eme k’anyị nwet’ume.

Nye anyị ike ifeli k’ugo;

Biko, mee k’anyị nweta ’mụọ nsọ gị.