Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 89

Jehova Ji Obiọma Na-arịọ: “Mara Ihe, Nwa M”

Jehova Ji Obiọma Na-arịọ: “Mara Ihe, Nwa M”

(Ilu 27:⁠11)

1. Nw’okoro n’agbọghọ,

biko, nye m obi gị.

Ony’iro n’akwa m emo

g’eji anya ya hụ.

Jir’obi gị dum fee m

ugbu a ị n’eto eto;

Gosi ụwa dum

na ị n’adịrị mụ ndụ.

(KORỌS)

Ezigbo nwa m m hụrụ n’anya,

Mar’ihe, mee k’obi m ṅụrịa.

Jir’obi gị dum jeere m ozi,

Nye m otuto si gị n’obi.

2. Jiri obi ụtọ

nye m ihe gị niile,

I nwer’ike ịda,

Ma m g’ekuli gị.

’Madụ pụr’imejọ

gị m’ọ bụ ghọgbuo gị,

Nwee obi ike na

m hụrụ gị n’anya.

(KORỌS)

Ezigbo nwa m m hụrụ n’anya,

Mar’ihe, mee k’obi m ṅụrịa.

Jir’obi gị dum jeere m ozi,

Nye m otuto si gị n’obi.