Abụ nke 91
Nna M, Chineke M na Enyi M
1. Ndụ pụrụ is’ike.
Ọ pụr’iweta ihe mgbu.
Kwa ụbọchị, m g’asị,
“Ndụ m bara uru.”
(KORỌS)
Jaa bụ ony’ezi omume,
Ọ ma na m hụrụ ya n’anya.
Ọ nọ mụ nso mgbe dum;
Ọ bụ mụ na Jehova nọ.
Ọ ga n’egboro mụ mkpa.
Ọ ga n’echebe m ruo ọgwụgwụ.
Jehova bụ Nna m,
Enyi m na Chineke m.
2. Oge m bụ nwat’agaala;
Ugbu a bụ oge ịt’ahụhụ.
Ma okwukwe m nwere
N’enye m olil’anya.
(KORỌS)
Jaa bụ ony’ezi omume,
Ọ ma na m hụrụ ya n’anya.
Ọ nọ mụ nso mgbe dum;
Ọ bụ mụ na Jehova nọ.
Ọ ga n’egboro mụ mkpa.
Ọ ga n’echebe m ruo ọgwụgwụ.
Jehova bụ Nna m,
Enyi m na Chineke m.
(Gụọkwa Ọma 71:17, 18.)