Abụ nke 65
“Lekwa Ụzọ”
1. E nwer’ụzọ udo,
Bụ́ eb’ị nọ ugbu a,
Ụzọ ị mụtara,
Ụzọ oge ochie,
Nke Kraịst ziri gị
N’okwu ya ị nụrụ.
Ọ bụ ụzọ nk’udo
Dị n’Okwu Jehova.
(KORỌS)
Lekwa Ụzọ; ọ bụ Ụzọ ndụ;
Nọsie ike; Ahapụkwala ya!
Chineke n’asị gị: ‘Lekw’ụzọ;
Elel’anya n’azụ, Lekwa ụzọ.’
2. Ọ b’ụzọ ịhụnanya,
Elela eb’ọzọ.
Jaa ezil’anyị ya;
Anyị chọtara Jaa.
Ezi ’hụnanya ya
N’eme anyị obi ụtọ.
Ụzọ ịhụnanya
Metụtar’ihe dum.
(KORỌS)
Lekwa Ụzọ; ọ bụ Ụzọ ndụ;
Nọsie ike; Ahapụkwala ya!
Chineke n’asị gị: ‘Lekw’ụzọ;
Elel’anya n’azụ, Lekwa ụzọ.’
3. E nwer’ụzọ ndụ,
Elel’anya n’azụ.
Jaa kwer’anyị nkwa:
Ọ b’ụzọ kacha mma,
Udo y’enwegh’atụ,
Ịhụnanya ya ka.
Ọ bụ ụzọ ndụ,
Ekele dịrị Jaa.
(KORỌS)
Lekwa Ụzọ; ọ bụ Ụzọ ndụ;
Nọsie ike; Ahapụkwala ya!
Chineke n’asị gị: ‘Lekw’ụzọ;
Elel’anya n’azụ, Lekwa ụzọ.’