Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 36

“Ihe Chineke Kekọtara”

“Ihe Chineke Kekọtara”

(Matiu 19:​5, 6)

1. E ji ùgwù n’ọṅụ

Atụkọt’ụdọ atọ.

Ka Jaa na ndị ’madụ hụ

Mgbe a n’ekwe nkwa.

Di kwere nkwa n’ihu Jaa

Ịhụ nwunye n’anya.

(KORỌS)

‘Madụ atọsal’ihe

Chineke kekọrọ.’

2. Ha amụọla Baịbụl,

Mụta im’uche Jaa,

Ha n’achọ ngọzi ya,

Imezu nkwa ha.

Nwunye kwere n’ihu Jaa

Ịhụ di ya n’anya.

(KORỌS)

‘Madụ atọsal’ihe

Chineke kekọrọ.’