Abụ nke 36
“Ihe Chineke Kekọtara”
1. E ji ùgwù n’ọṅụ
Atụkọt’ụdọ atọ.
Ka Jaa na ndị ’madụ hụ
Mgbe a n’ekwe nkwa.
Di kwere nkwa n’ihu Jaa
Ịhụ nwunye n’anya.
(KORỌS)
‘Madụ atọsal’ihe
Chineke kekọrọ.’
2. Ha amụọla Baịbụl,
Mụta im’uche Jaa,
Ha n’achọ ngọzi ya,
Imezu nkwa ha.
Nwunye kwere n’ihu Jaa
Ịhụ di ya n’anya.
(KORỌS)
‘Madụ atọsal’ihe
Chineke kekọrọ.’
(Gụọkwa Jen. 2:24; Ekli. 4:12; Efe. 5:22-33.)