Abụ nke 56
Biko, Nụrụ Ekpere M
1. Chinek’anyị, biko, nụr’abụ m.
Ị bụ Nna m; abụ m nke gị.
Aha ukwu gị enweghị atụ.
(KORỌS)
Jaa, onye amara, nụr’ekpere m.
2. I meela, Jaa, mak’ụbọchị taa,
Inye mụ ndụ, na izi m ụzọ.
Ịhụnanya gị n’atọ m ụtọ.
(KORỌS)
Jaa, onye amara, nụr’ekpere m.
3. M chọr’ime ihe zir’ezi!
Nyere m aka ije ije n’ìhè.
Nye m ume ka m buo ibu m niile.
(KORỌS)
Jaa, onye amara, nụr’ekpere m.
(Gụọkwa Ọpụ. 22:27; Ọma 106:4; Jems 5:11.)