Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 47

Kwusaa Ozi Ọma

Kwusaa Ozi Ọma

(Mkpughe 14:​6, 7)

1. E zochiri eziokwu Al’eze kemgbe.

E kpugheela eziokwu banyere Mkpụr’ahụ.

N’ihi ebere Jaa na ịhụnanya ya,

O chetara n’ụmụ mmadụ n’eme mmehie.

O zubere ka Ọkpara ya chịa ụwa;

N’oge Chineke, Al’eze ahụ g’achịwa.

Ọ g’eme k’ìgwè atụrụ nta dị ebube,

Ka ha ghọọr’Ọkpara ya nwunye ọhụrụ.

2. E bur’ozi ọm’anyị n’ezi ugbu a n’amụma.

Uche Jehova bụ k’e kwusaa ya ugbu a.

Ọ n’atọ ndị ’mụ’ozi ụtọ iso anyị,

Inyer’anyị aka n’ikwus’eziokwu Al’eze.

Ọrụ na ih’ùgwù anyị nwere ugbu a bụ

Inye Jaa otuto na ido aha ya nsọ.

Ọ bụ ih’ùgwù ịkpọ anyị Ndịàmà ya,

Ndị n’ekwusa oziọma ebigh’ebi.